Anambra Election Update: Lee akụkọ ụgha na-efegharị gbasara ntuliaka Anambra steeti

Akụkọ ụgha

Ọ fọla ụbọchị ole ma ole tupu ụbọchị ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti eruo.

Cheta na ọ bụ na abalị isii nke ọnwa Nọvemba ka a ga-eme ya bụ ntuliaka.

Mana ọtụtụ akụkọ ụgha amalitela ifesasị, ọkachasị na soshal midia, gbasara ntuliaka ahụ.

Akụkọ a bụ iji tiwaara gị akụ oyibo Nsugbe, ma kọwaara gị ihe ndị bụ eziokwu na ndị bụ okpotokpo asị.

1) INEC ekwughị na ha ga-akagbu ntuliaka Anambra

Akụkọ ụgha

Akụkọ efesaala na soshal midia na ngalaba ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission" (Inec) ga-akagbu ntuliaka Anambra steeti.

Ndị bipụtara akụkọ a bụ ụlọọrụ a kpọrọ onyeomablog.com, n'ụbọchị 27 nke ọnwa Sepụtemba afọ 2021.

Dịka akụkọ ahụ siri kwuo, Inec sị na ihe mere ha ga-eji kagbuo ntuliaka hụ bụ n'ihi ọnọdụ enweghị nchekwa dị n'Anambra steeti.

Mana ya bụ akụkọ bụ asị, n'ihi na INEC enwebeghị mgbe ha pụtara kwuo na ntuliaka Anambra agaghị enwe isi.

Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii ekwuola na ha ga-eziga ndị ọrụ ha ọnụọgụgụ ha dị 34,587 iji weta ezi nchekwa n'oge ntuliaka ahụ.

2) Ndị ọrụ INEC agbaghị arụkwaghịm

Akụkọ ụgha
Nkọwa foto, Foto e ji mee akụkọ a bụ foto e sere n'oge ntuliaka nke afọ 2015

Akụkọ ụgha ọzọ fesara gbasara ntuliaka Anambra bụ nke kwuru na ọtụtụ ndị ọrụ INEC agbaala arụkwaghịm na steeti ahụ n'ihi ụjọ.

Otu n'ime ndị bipụtara ya bụ akụkọ bụ ụlọọrụ kpọrọ onwe ha 'everydaynewsngr.net.'

Ya bụ akụkọ fesakwara nke ukwu site n'ọba nzikọrịtaozi "Whatsapp".

Mana onweghị otu mkpụrụ eziokwu dị na ya bụ akụkọ, dịka Inec siri kowaa.

Onye ji ọkwa 'Resident Electoral Commissioner' na Inec Anambra steeti bụ Nwachukwu Orji kọwara na INEC nwezuru ndị ọrụ ha chọrọ maka ntuliaka Anambra steeti.

Orji kọwara nke a n'ọgbakọ e nwere n'Awka n'ụbọchị Tuzde, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Ọktoba a.

Oge BBC kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru INEC n'Anambra steeti bụ Samuel Nimem, o kwukwara na akụkọ ahụ bụ ụgha.

Ọ kọwara na "Inec ka na-enye ndị mmadụ tinyere akwụkwọ ịrụ ọrụ na ntuliaka a ọzụzụ".

"Ọ bụ ndị mere ọfụma n'ọzụzụ a ka anyị ga-ahọrọ ka ha soro rụọ ọrụ."

"Anyị ahọpụtabeghị kpọmkwem ndị ga-eso rụọ ọrụ. Kedụzị etu ndị ahọpụtabeghị ga-esi gbaa arụkwaghịm?"

3) Ndidi Nwuneli esoghị azọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti

Akụkọ ụgha

Otu ụlọọrụ a kpọrọ 'starconnectmedia.com' dere akụkọ n'ọnwa Julaị 2021, wee kwuo na nwaada aha ya bụ Ndidi Nwuneli chọrọ iso zọọ ọkwa osote gọvanọ Anambra steeti.

Akụkọ ahụ kwuru na ọ bụ Mazi Akachukwu Nwankpo nke nọ na pati "African Democratic Congress" (ADC), chọrọ ịhọrọ Ndidi Nwuneli dịka osote ya.

Mana oge ụlọ ntaakụkọ 'The Cable' kpọtụụrụ ya bụ nwaanyị, o kwuru na akụkọ ahụ bụ nnukwu asị.

Nwuneli kwuru sị: "Akụkọ a bụ asị kwọ nwa. Enweghị m mmasị ọbụla ịbanye ndọrọndọrọ ọchịchị."