Anambra Election News: Azụmaahịa ndị mere e ji a kpọ ndị Anambra 'ide ji mba'

Chukwuma. Maduka na Onyema

'Ihe nke mba Naịjirịa' a na-etu ndị Anambra abụghị n'ọnụ maka na a sị na onye a na-akpọ nwere ihe ọ na-eme.

Ọ dị ka a ga-asị na ndị nyere aha ahụ lebara anya n'uche ndị Anambra ma hụ na ha nwere obi e ji achụ ego, tupu ha gụọ ha aha a.

A bịa n'azụmaahịa, ndị Anambra enweghi ịma atụ na Naịjirịa, ha na-agbakwụnye akọnauche ha n'azụmaahịa n'ebe ọ dị ukwuu.

Akụkọ sị na Anambra Steeti nwere ọtụtụ mmadụ kachasị bụrụ ide ji mba na Naịjirịa ma bụrụkwa ndị kachasị eje mba.

Kedụ ebe aknuche azụmaahịa ha si?

Ahịa Ọnịcha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ahịa Otu Nkwọ ọnịta, maọbụ 'Onitsha Main Market' na bekee

Otu onye omeiwu na-anọchiteanya Njikoka II n'ụlọomeiwu Anambra Steeti bụ Peter Chima Ibida sị na azụmaahịa bụ ihe e ji maara ndị Igbo niile.

Ọ sị na dịka akụkọ si kwuo na ndị Igbo si n'agbụrụ ndị Juu bụ ndị e ji ime njem maara.

Na ndị Igbo na-eme njem, ha ga-eji ihe ha nwereike iresi ndị obodo ahụ ha na-aga iji nwete ihe ha ga-eri ma ha ruo n'obodo ahụ.

Ibida sị na ọ bụ etu ahụ ka azụmaahịa ndị Igbo si gbasaa rute ogogo ọ nọ ugbua ọkachasị nke ndị Anambra.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị Igbo niile nwere akọnauche e ji azụ ahịa kama na ọ bụ ndị Anambra kachasị ahịa azụ n'ala Igbo niile.

Okporoụzọ si Ọnicha gawa Asaba

Ebe foto si, Google

Nkọwa foto, Okporoụzọ si Ọnicha gawa Asaba

Ọ sị na ọ bụ nke ahụ mere 'ahia Ọnịcha' ji bụrụ ọkaibe na mpaghara Ndịda Anyanwụ Afr ika.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị Anambra malitere atụmatụ ikuziri mmadụ ka e su azụ ahịa nke e ji 'ịgba bọị' maara.

Nke bụ na otu onye ga-akpọrọ ọtụtụ ndị mmadụ kuziere ahịa n'ime ọtụtụ afọ ma duo ha ụlọ site n'imepere ha ọdọ ahịa nke ha na nyekwa ha ego ha ji azụ ahịa.

Na ọ bụ site n'usoro ahụ ka azụmaahịa si na-amụbawanye n'etiti ndị Anambra ma rute ndị Igbo ndị ọzọ.

Ụfọdụ azụmaahịa e ji maara ndị Anambra

Maazị Ichide mere ka anyị mata na o nweghi ụdị azụmaahịa ọbụla ndị Anambra na-anọghị na ya, nke mere e ji asị na "ihe e nweghi ike ịzụta n'ahịa Ọnịcha bụ naanị anụ mmadụ".

Mana ụfọdụ azụmaahịa ndị Anambra gbara mkpọrọgwụ na ha gụnyere;

Ahịa ụgbọala na akụrụngwa ya

A bịa n'ihe ọbụla banyere ụgbọala nakwa ihe ndị e ji arụ ya bụ 'spare parts' ndị Anambra gbara ndị mbụ.

Ị ga-anụ aha ndị dịka Coscharis Motors nke Cosmas Maduka nwe, Innoson Motors nke Innocent Chukwuma nwe na ndị ọzọ.

Ahịa ọgbatumtum na akụrụngwa ha

Nke a bụ azụmaahịa ọzọ ndị Anambra ji biri ọkachasị mpaghara Nnewi. O nweghi ihe ọbụla metụtara ọgbatumtum na a gaghị ahụ n'obodo Nnewi.

Aha gbapụtara ihe n'ụdịrị azụmaahịa bụ 'Ogbuawa Motocycle Spare Parts' nke P.O Ogbuawa bụ onye nwe ya, Innocent Chukwuma malitere n'ụdị azụmaahịa a tupu ọ banyer na nrụpụta ụgbọala.

Ahịa mmanụ agbịdị (Petroleum business)

Ụlọọrụ mmanụ agbịdị

Ebe foto si, Getty Images

Nke a bụ azụmaahịa niile metụtara mmanụ ụgbọala, mmanụ a na-agbanye n'ime ingine ụgbọala nakwa ndị ọzọ.

Ọtụtụ ụmụafọ ndị Anambra na-azụ ahịa mmanụ agbịdị ndị gụnyere; Arthur Eze nwere 'Atlas Oranto Petroleum, Anthony Enukeme nwere 'Tonimas Oil', Joseph Ezeokafor (Jowi Zaza) nwere 'Jezco Oil' na ndị ọzọ.

Ahia akụrụngwa e ji arụ ụlọ (Building materials)

Nke a bụ ngalaba azụmaahịa ọzọ e ji maara ndị Anambra na-agbanyeghi na ọtụtụ ndị ọzọ na-azụzị ya ugbua.

Ị ga-ahụ ndị Anambra na-azụ ụdịrị ahịa a n'ọtụtụ ahịa dị n'ala Igbo nakwa Naịjirịa gbaa gburu gburu.

Njem ụgbọala na ụgbọelu

Ụgbọala e ji eme njem

Ebe foto si, YSG/acebook

Ngalaba azụmaahịa ime njem bụ ihe ọzọ ndị Anambra ji bụrụ ọpụrụiche na Naịjirịa.

A bịa n'ime njem ụgbọala, ị na-ahụ aha ụlọọrụ ụgbọala dịka 'Young shall grow' nke Vincent Amaechi Obianodo nwe, 'Ekeson motors' nke Eugene Eke Nzom nwe,'GUO ' nke Godwin Ubaka Okeke nwe, 'FG Onyenwe na ọtụtụ ndị ọzọ.

A bịa na njem ụgbọelu, ị ga-anụ aha ndị dịka 'Airpeace' nke Allen Onyema nwe, 'United Nigeria Airlines' nke Obiorah Okonkwo nwe.

Ọ dịghị mfe ịgụpụtacha azụmaahịa niile ndị Anambra nọ n'ime ya maka na ha buru ibu.

Ụfọdụ ụlọahịa dị n'Anambra

E nwere ọtụtụ ụlọahịa dị n'Anambra Steeti nke mere o ji soro na steeti ndị kachasị emepe na Naịjirịa.

Ụfọdụ ahịa ndị a gụnyere; ahịa Ọnịcha, ahịa Nnewi, ahịa Ochanja, ahia Ekwulobia, ahia Ogidi, ahia Mkpor, ahia Oba, ahia Headbridge, ahia Orie Nimo, ahia Orie Agu Abagana, ahịa 'Timber' na ọtụtụ ndị ọzọ.