Anambra Airport: Ihe na-esere gọọmentị Anambra na ndị ntorobịa Umueri gbasara ọdọụgbọelu

Ebe foto si, AFP
Ndị obodo Umueri dị na mpaghara Anambra East, mere ngagharịiwe n'ụbọchị Mọnde gbasara ala ha ebe gọọmentị Anambra steeti na-arụ ọdọụgbọelu ọhụrụ.
Iwe ha bụ na gọomentị banyere n'ala ha kwekọrịtara ịhapụrụ ha dịka ha na-eti mkpu na ya bụ ọdọụgbọelụ e wekọrọla ala ha.
Onyeisi ụmụntorobia n'Ọgbụ bụ Sunday Okafo gwara BBC Igbo na ndị mere ya bụ ngagharịiwe bụ obodo atọ dị n'Ifete Umueri (Ọgbụ, Mgbede na Ụmụatuolu).
N'okwu ya, ndị obodo begaara gọọmentị Anambra steeti akwa na-arọ ka ahapụrụ ha ụfọdụ ala ha ewepụtara maka ya bụ ọdọụgbọelu.
Okafo kwetakwara n'ezie, na Gọọmentị kwetere hapụrụ ha otu mpaghara ala dị na "Parcel D" dịka ha kpọrọ ya na Bekee.
O kwuru na "ya bụ 'Parcel D' ruru 288 'hectres'".
Mana ndị obodo mechara rịọwa gọọmentị ka ha wanyekwuo ha ala ọzọ ebe ụlọ ndị mmadụ, ụlọakwụkwọ na okwu arụsị ha dị na "Parcel C".
Okafo sị na Onyeisi ha na gọọmentị mere njem nleta n'ala ahụ were hụ n'ezie na ihe ndị ahụ ha kpọrọ aha dị ebe ahụ.

Ọ sị na Gọọmentị kwetara ịwanyekwu ha obere ala ebe ahụ.
Mana ihe gbagwojuru ha anya bụ na ụnyaahụ ka ha hụziri ka Gọọmentị ji nnukwu ụgbọala 'truck' na-egburi ala ebe ahụ.
Ya meziri ha ji mewe ngagharịiwe, mere e jizi kwụsi ya bụ ọrụ ruo mgbe gọọment na ndị obodo kpeziri.
Kọmishọna mgbasa ozi Anambra steeti bụ Don Adinumba sị ọ nweghị mgbe Gọọmentị ji kweta ịnye ndị obodo Umueri mpaghara ahụ a kpọrọ 'Parcel C'.
Dịka Adinuba si kwuo, "Gọomentị na ndị obodo nwere ọgbakọ n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Maachị n'obi Gọọmentị dị n'Ọnịcha bụ ebe ha nọ kwekọrịta ịnya ha 'Parcel D'".
"Gọomentị nyekwara ha ego ha kwuru nke mere ha obi ọma ụbọchị ahụ".
Ọ sị na ọ gbagwojuru Gọọmentị anya na ha lọghachitere bịa nawa ala ọzọ.

Otu onye ọnụ na-erụ n'okwu na Gọọmentị Anambra steeti na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na "Ọnweghị ezigbo ihe dị n'ala ahụ ndị obodo na-ana."
Ihe mere bụ na ala ebe ahụ tinyekwuru ego n'ihi ọgbọụgbọelụ arụrụ ebe ahụ.
"Ọ bụ ya mere ha jị ana Gọọmentị ala ọzọ nke ndị mmadụ chọrọ ire".













