Igbariam Attack: Ndị amabeghi ndị ha bụ egbuola mmadụ itoolu - Ndị uweojii

Ụmụakwụkwọ na-agbapụ ọsọ ebe ha bi maka egwu ihe nwereike ịme

Ebe foto si, Geraldmjay

Ụmụakwụkwọ na-agụ akwụkwọ na mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu dị n'Igbariam gwara BBC na ndị a mabeghị ndi ha bụ wakporo ezinaụlọ bi nso n'ebe ụmụakwụkwọ bi were gbuo ọtụtụ mmadụ.

Ụmụakwụkwọ a kwuru na ndị a e gburu bụ ndị ezinaụlọ na-achị ehi bi n'ulọ ahụ ruo otu afọ.

Ndị uweojii si na ọ bụ n'obodo Ukpomachị nke Ọkụzụ di n'okpuru ọchịchị Oyi ka ihe mere.

Ebe ahụ dị nso Igbariam Junction nke dị nso na Igbarịan bụ obodo mahadum Emeka Odumegwu Ojukwu dị.

Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii n'Anamabra bụ Tochukwu Ikeokwu gwara BBC Igbo na ha anụla maka mkpa mkpa kpara na mpaghara ahụ ahụ mana ha ka na-eche ka ha mata akụkọ niile dị n'ime ya.

Otu onye bi nso n'ebe ahụ gwara BBC na nke a mere ka ụmụakwụkwọ Mahadum Odumegwu Ojukwu dị nso n'ebe ahụ buru ngwongwo ha gbapụ ọsọ maka egwu ihe nwerike ịme.

O kwukwara na o nweghi nsogbu ọbụla ndị ahụ ọ sị bụ ndị Fulani na-achị ehi e gburu na ndị obodo ahụ na-enwe kemgbe otu afọ ha bi ebe ahụ.

Ebupula ozu ndị ahụ ahụburu ebe ahụ dịka ndị agha na ndị uweojii bịara ebe ahụ ịchọpụta ihe mere n'ihe dịka elekere iri nke ụtụtụ ụbọchị Monde.

Ọtụtụ ụmụakwụkwọ nọ mahadum ahụ agbapụla n'obodo ahụ.

Otu n'ime ha gwara BBC Igbo na ọ bụ ụjọ na e nwereike bịa megwara mere ha ji agba ọsọ.

Nwata akwụkwọ ahụ sị na ọ bụ n'ime abalị ka ndị bi nso n'ulo ndị Fulani ahụ bi nụtara kepu kepu na a na-awakpo ha.

Ọ sị: "Anyị pụtara n'ụtụtụ hụ na egbuola ndị Fulani ahụ bere akụkụ ahụ ụfọdụ n'ime ha pụọ."

Ndị a e gburu gụnyere ụmụnwaanyị, ụmụaka, na ụmụ nwoke.

Kọmịshọna mgbasaozi nke Anambra steeti bụ Don Adinuba gwara BBC na gọọmentị ha na-eme nnyocha ihe a mere iji mata ebe o si.

Gọọmentị Anambara tinyere mmachị ngagharị n'Igbariam, Aguleri, Umueri, Nteje, Awkuzu na Umunya.

Machị ngagharị nke ga-esite elekere asaa nke ehihe ruo elekere isii nke ụtụtụ maka ogbugbu mmadụ nakwa ụjọ dị n'obodo ahụ

Ihe mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu kwuru

Mahadum ahụ ekwuola na ohe a mere emeghị n'ime ụlọ akwụkwọ ha, nke mere ha jiri sị ka ụmụakwụkwọ laghachite akwụkwọ.

Dịka ụlọ ntaakụkọ Anambra Broadcasting Service siri kwuo, ọ bụ ọnụ na-ekwuru ụlọ akwụkwọ ahụ bụ C.C. Chukwueloka binyere aka n'ozi a.

Ozi kwuru na onweghi nwata akwụkwọ mahadum nwụrụ na nwakpo a dịka ọtụtụ mmadu na soshal midia na-ekwu.

Ha sịkwa na etinyela nchekwa ọfụma na mahadum ahụ.

Ihe ndị uweojii kwuru

N'akwụkwọ mgbasaozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii binyere aka na ya, ndị uweojii n'Anambara sị na ọ bụ mmadụ 9 nwụrụ na mwakpo a.

Ha si na amabeghi ndị bu ndị a e gburu, n'agbanyeghị na ndị bi ebe ahụ gwara BBC na ọ bụ ezinaụlọ ndị na-achị ehi ka ọdachị dakwasịrị.