Ebubeagu: Ihe pụtara na nzụkọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ nwere maka nchekwa ala Igbo

Ebubeagu

Ebe foto si, Louis Amoke

Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ, ndị okpukpere chi, ndị Eze ọdịnala, otu Ohaneze na nzụkọ maka nchekwa ala Igbo bụ South East Joint Security Committee nwere nzụkọ taa bụ ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Aprel afọ 2021, n'obi gọvanọ Enugwu steeti.

Gọvanọ David Nweze Umahi nke Ebonyi steeti gụpụtara ihe ha kpebiri na nzụkọ ha :

South East Governors meeting

Ebe foto si, Louis Amoke

  • Ha ga-aga n'ihụ hiwe atụmatụ nchekwa Ebubeagụ, nke isi ụlọọrụ ha ga-adị n'Enugwu Steeti. Ha kwukwara na Ebubeagụ na ndị ọrụ nchekwa ga-arụkọ ọrụ n'ịchekwa ala Igbo.
  • Ha ekwetela maka etu a ga-esi hazie ọchịchị ebubeagụ ma hiwe kwa ọgbakọ ga na-adụ ha ndụmọdụ
  • Ha gwara ndị okaịwu ukwu nke steeti niile na kọmịshaọna na-ahụ maka ikpe ziri ezi na steeti niile ka ha gbanwe iwu obodo, nke ga-eme ka Ebubeagụ rụọ ọrụ etu ọ kwesịrị.
  • Nzụkọ a nyere Ohaneze ntụzịaka ka ha hiwe nzụkọ abụọ ọzọ abụọ nke ga-abụ maka: A)Nzụkọ ga-ahụ na ekpeziri esemokwu niile n'ọwụwa anyanwụ ma weta kwa udo n'etịtị ndị niile.B) Nzụkọ ga-ahazị ma tụzieaka etu a ga-esi chekwa ndị mmadụ ọkachasị ndị a na-emegbu emegbu.
  • Ha kpebiri ma kwuo na ha kwadoro atụmatụ ndị uweojii nke steeti (State Police na bekee) dịka ha siri kpaa na nzụkọ NEC ikpeazụ ha nwere.
  • Ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ katọrọ mwakpo awakporo ụlọ Gọvanọ Hope Uzodinma, ma rịọ ka gọọmentị etiti jide ndị kpara ya bụ mkpamkpa ma kpee ha ikpe ziri ezi.
  • Ha kwu kwara na ha kwadoro iwu megidere ichi ehi agagharị ma kwuo ka ndị ọrụ nchekwa na ndị na-echekwa ime obodo hụ na ya bụ iwu dị ire.
  • Na nzụkọ ha, ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ kwekọtara ihiwe atụmatụ iji nyere ndị ntoroọbịa aka nke ha kwekọrịtara n'oge ngaghariiwe ENDSARS.

Lee nzukọ ha dịka esiri seta ya:

Ebubeagu

Ebe foto si, Louis Amoke

Ebubeagu

Ebe foto si, Louis Amoke

Ebubeagu

Ebe foto si, Louis Amoke

Ndekperima na-eso ndị Ipob na Eastern Security Network n'azụ

David Umahi

Ebe foto si, David Nweze Umahi/Facebook

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi ekwuola na ọtụtụ ndị omekome na ndị ekperima na-ezo n'azụ Eastern Security Network nakwa Ipob arụ arụ dị ịcheiche.

O kwuru nke a na mkparịataụka ya ndị ụlọ mgbasaozi CHANNELS na-enwe gbasara nchekwa n'ọwụwa anyanwụ.

Aha onyonyo, Ebube Agu: Lee ajọ ọnọdụ nchekwa butere nhibe otu nchekwa ahụ

"Nke bụ eziokwu bụ na ndị otu nzuzo na ndị omekome juru ebe niile. Ihe na-emezi bụ na ndị abụghị ndị otu Ipob na ESN ga-aga kpaa arụ ma na-achọ aha"

"Ọ dịịrị ha mfe iji aha ESN na Ipob kpuchie onwe ha n'aka gọọmentị etiti"

"Nke a na-eme n'ihi na ndị Ipob apụtala ọtụtụ oge kwuo na ha abụghị ndị na-eyi ndụ egwu nakwa ndị na-agba ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ abụghị ndị nke ha"

"Kedụzia ihe a ga-eme okwu a?" bụ ihe ndị o kwuru.

O nweghi ihe jịkọrọ Ebubeagụ na ESN nke Nnamdi Kanu hibere - Governor Umahi

Ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ

Ebe foto si, Imo New Media Facebook

Onyeisoche otu jikọrọ ndi gọvanọ ọwụwa anyanwụ nakwa gọvanọ Ebonyi steeti bụ David Umahi ekwuola na otu nchekwa ehibere n'ala Igbo bụ Ebubeagụ amalite ọrụ kemgbe.

Ọ kọwara na ọ bụghị ihe gbatagbata mere eji kpokọbaa ndị otu nchekwa ahụ.

N´otu aka ahụ kwa Umahi kwuru na iwu ga akwado ha ibu ngwa ọgụ iji hụ na enyere mpagara ọwụwa anyanwụ nchekwa tọrọ atọ.

N´okwu metutara mmaja otu ESN majara otu ọrụ nchekwa Ebube Agu ,David Umahi kwuru n´eze wara awa.

O kwuru na otu ọrụ nchekwa ESN nke Nnamdi Kanu gwuzobere enweghi nkwado iwu ọbụla n´ihi ya hụta ha dika ndi ekperima, gbanye na otu ọrụ chere otu ụrụ nchekwa ebube agụ n´ihi bụ ihụ na ihe nile gbasara ndi omokome bụrụ akụkọ ochie na mpaghara ọwụwa anyanwụ ala Naịjirịa.

Etu otu nchekwa ọhụrụ a ga-esi arụ ọrụ

N'iji zaa ajụjụ etu otu nchekwa "Ebube Agụ" ga-esi arụ ọrụ, gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia Steetị so na ndị hiwere ya tinyere ọnụ na ya

Mgbe ọ na-aza ajụjụ na Channels TV, Gọvanọ Ikpeazu sị na "Ebube Agụ" pụtara mkpuchi, nchekwa gburu gburu ebe obibi nakwa ikike.

Ọ sị na Ebube Agụ ga-arụ ọrụ n'uju dịka otu nchekwa, na a ga-enye ha ngwa ọrụ nwereike ịma ndị omekome chere ha aka n'ihu agha.

O kwuru na Steetị dị n'Ọwụwa Anyanwụ dị mbụ nwere otu nchekwa nke ha dịka 'Homeland Security nke Abia, 'Forest Guard' nke Enugu.

Kama na ihe ha mere ugbua bụ ijikọ otu nchekwa niile a ọnụ n'aha Ebube Agu maka nzirita ozi na nchekwa tara ọchịchị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Ọ sị na ndị nchekwa Ebube Agu ga-agba mgbọrọgwụ n'ime obodo dị iche iche na mpaghaghara ahụ bụ ebe ha ga na-echekwa.

Ikpeazu sị na ọrụ ndị a ga-elekwasị anya n'inwete kepukepu banyere nchekwa tupu ihe ọbụla a na-eme na mpaghara ahụ.

O kwuru na "Ebube Agụ ga-achụ onye ọbụla na-ekwesighi ịnọ n'ime ọhịa ọsọ".

Ọ gara n'ihu kwuo na gọvanọ steetị ọbụla ga-ewe mmadụ ole ikike ya ruru n'ọrụ nchekwa Ebube Agụ.

Ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ ehiwela otu nchekwa ọhụrụ

Ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ

Ebe foto si, Imo state New media Facebook

Ndị Gọvanọ ọwụwa-anyanwụ ehiwela otu a kpọrọ 'Ebube Agu' maka nchekwa mpaghara ahụ.

Ha kwuru na isiụlọọrụ Ebube Agụ ga-abụ n'Enugwu steeti.

Ha mere nkwekọrịta a na nzukọ ha mere n'Owere, Imo steeti, taa bụ ụbọchị 11 nke ọnwa Epreelụ 2021, ebe ha nọ kwuo maka etu mpaghara ọwụwa-anyanwụ si nọrọ n'ọnọdụ ọjọọ n'ihe gbasara nchekwa.

Na nzukọ ahụ, ha bu ụzọ katọọ iyi ndụ egwu nakwa mkpamkpa ndị omekome na-akpa na moaghara ahụ, ma katọọ mwakpo na ịgba ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ, mwakpo na ịgbapụta ndị a nwụchiri n'ụlọmkpọrọ nakwa ogbugbu ndị ọrụ nchekwa, ndị obodo nakwa ndị ọrụ ugbo.

Ndị gọvanọ a gụnyere Ifeanyi Ugwuanyi nke Enugwu steeti, Willy Obiano nke Anambara steeti, Dave Umahi nke Ebonyi steeti, Hope Uzodimma nke Imo steeti na Okezie Ikpeazu nke Abịa steeti, kwuru na gọọmentị etiti Naịjiria dọnyeere ha ukwu n'ihe gbasara ọnọdụ nchekwa, ma kwuo na ha na gọọmentị etiti ga-ejikọ aka buso mkpamkpa ndị omekome agha.

Ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ

Ebe foto si, Imo New Media Facebook

Na nzukọ a ha kpọrọ 'South East Security Summit' bụ nke mbụ a na-eme maka nchekwa na mpaghara a, ndị gọvanọ kpebiri na ndị isi a hụrụ kwaba okpu gụnyere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ojiegoachụego na ndị ọrụ nchekwa, ga-etikọta isi ọnụ ịhụ na a kwadoro ndị nchekwa na mpaghara ọwụwa-anyanwụ iji hụ na e memilara mkpamkpa ndị omekome.

Ha kpebiri ime nzukọ a kwa mgbe, ma hụkwa na e mere ya na steeti dị iche iche n'ọwụwa-anyanwụ oge ọbụla.

Ha gwakwara ndị isi ndị ọrụ nchekwa ka ha gbaa mbọ kwuputa ihe ndị ha chọrọ, ga-enyere ha aka ibuso mpụ na omekome agha, nke ha bụ ndị isi mpaghara ọwụwa-anyanwụ ga-ahụ na o ruru ha aka ozugbo.

Ndị ọrụ nchekwa bịara nzukọ a

Ebe foto si, Imo state new media

N'otu aka ahụ, ndị gọvanọ kwuru ka onyeisi ndị uweojii kwụsị izite ndị otu ya, kama ka ọ hapụ ndị kọmishọna uweojii nakwa ndị nke ọrụ ha bụ ichekwa mpaghara ahụ ka ha rụọ ọrụ dịịrị ha.

Ha kwukwara ka onyeisi ndị uweojii na ndị isi ọrụ nchekwa ndị ọzọ kpọkuo Ohaneze Ndigbo na ndị ọzọ, iji mata ebe mmiri si banye n'opi ụgbọghụrụ n'ihe gbasara nchekwa n'Ọwụwa-anyanwụ.

N'aka ọzọ, ndị gọvanọ kwenyekwara na a machiela ịchị ehi agagharị, ma gwa ndị ọrụ nchekwa ka ha gbaa mbọ hụ na ndị mmadụ debere iwu mmachi a.

Ha rịọkwara ka ndị ọrụ ugbo na ndị ọchị ehi na-arụkọ n'udo, ka ndị gọvanọ nwee ike ibuso mpụ agha.

Nzukọ a na-abịa dịka ọnọdụ nchekwa n'ọwụwa-anyanwụ banyere na 'ọgbara Igbo gharịị' n'ime izu ole na ole gara aga.

Ọkachasị nke mere n'izu gara aga ebe ndị omekome wakporo ụlọmkpọrọ dị n'Owere ebe ndị nọ na mkpọrọ si gbafuo, nakwa ihe ruru ụlọọrụ ndị uweojii atọ n'Imo steeti.