Ipob na ESN: Etu Boko Haram, Fulani ọchiehi,Al-Shabaab na otu ndị ọzọ dị n'Afrịka sị bido agha nnupuisi

Eastern Security Network, Boko Haram na Ndị Fulani Ọchịehi

Ebe foto si, Ipob/Getty

Kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021,akụkọ mwakpo ndị uweojii, ndịagha,ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị nwere agba na-arị ibe ya elu n'Ọwụwa Anyanwụ,Naijiria n'ụdị ahụbeghị ya kemgbe Agha Biafra biri.

Na mkpamkpa ndị a niile gụnyere nke Imo,Anambara, Ebonyi, Abịa, na Krọs Riva bụ na ndị a ji egbe akpa ike a kpọrọ 'unknown gunmen' na Bekee bụ ha gbuo ndị uweojii, ha buru egbe ha gbalaga.

Nanị malite ọnwa Jenụwarị rue Eprelụ afọ 2022, ndị omekome egbuola ihe karịrị ndị nchekwa iri anọ nakwa ndị nkịtị kemgbe ọnwa Jenụwarị rue Eprelụ afọ 2022.

Gọọmenti Etiti na ndị ọrụ nchekwa arụọla otu Ipob na ESN aka maka ọtụtụ ogbugbu mmadụ na mwakpo na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ mana Ipob agọọla ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.

Dịka ihe ndị a na-akpọtụ, ụfọdụ ndị mmadụ malitere na-ajụ ma otu nnwereonwe Ipob na otu nchekwa ha hibere bụ 'Eastern Security Network' ha aghọọla otu agha nnupụisi na-eyi ndụ egwu?

Nke a na-abịa dịka ewezuga, mmalite mkpamkpa n'Ọwụwa Anyawụ danyere nani otu onwa otu Ipob hiwere alaka ọgụ ha bụ 'Eastern Security Network' bụ nke ha malitere n'ọnwa Decemba afọ 2020.

Aha onyonyo, Army couple: Ụmụnne ndị agha e gburu akọwarala etu ozi ogbugbu ha si metụta ha

Ọzọ bụ na mwakpo na ọnwụ ụfọdụ merela na-eso ozi ndị welitere isi n'otu Ipob ahụ zirila na soshal midia na-akpo oku tigbuo zugbo dịka nchọpụta BBC Disinformation Unit mere na nsonso a.

Ndị ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa rụtụrụ aka na ọtụtụ otu agha nnupụisi na-akpa ike dịka ha na-eyi ndụ egwu na mpaghara dị icheiche n'Afrịka taa bidoro ka nwamba ma mecha ghọọ agụ owuru.

Otu 'Global Terrorism Index' kọwara 'iyiegwu' bụ ihe e jiri mara otu agha nnupuisi dịka, "Iji ike na tigbuo-zogbuo nke otu abụghị nke gọọmentị gbaa mbọ inweta ọchịchọ metụtara ndọrọdọrọ ọchịchị, akụnaụba, okpukperechi, maọbụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya site n'iyi egwu, mmanye maọbụ mmaja."

Aha onyonyo, Eastern Security Network: 'Ọ bụ ndị Gọvanọ ọwụwa anwanwụ ka ụta dịịrị maka ESN'

N'otu aka ahụ, ngụkọ ha bụ 'Global Terrorism Database' gosiri na Boko Haram, Fulani ọchịehi nakwa Al-Shabaab nke Somalia so n'otu ndị agha nnupuisi kachasị akpa mkpamkpa n'ụwa dum n'afọ 2020.

Lee ụfọdụ otu abụghị nke gọọmentị na-egosi anya ọbara ọbara n'Afrịka, etu ha siri malite nakwa ebe ha kwụ ugbua:

1. Boko Haram

Ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndịagha Naịjirịa ekwuola ugboro ugboro na ha-emeri Boko Haram

Otu a nke onye malitere ya bụ Mohammed Yusuf bidoro n'afọ 2002 dịka otu ụka Alakụba chọrọ ịnụcha okpukpere Islam nakwa ịlụ ọgụ Jihad.

Ya bụ agwọ otu onye hụrụ mechara ghọọ eke malite n'afọ 2009 dịka ndị ọrụ nchekwa Naijiria chara ha ọkụ.

Etu ha si gbanwe

Ha sitere n'ịgbasa oziọma Islam banye n'ihiwe otu nchekwa nke ha nke malitere ịwakpo ma bibie; ogige ndị uweojii, ọdọụgbọala, ụlọakwụkwọ, ụlọụka na imekpa ndị ekwenyeghị n'okpukpere ha ahụ.

N'afọ 2010, ha wakporo ụlọmkpọrọ na Bauchi tọhapụ ndị nga karịrị 700, nke 100 n'ime ha bụ ndị otu ha.

N'afọ 2014, ha tọọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị Chibok dị 276.

Ha meechara tọrọkwa ụmụaka ụmụakwụkwọ nwaanyị Dapchi dị 109(otu narị na itoolu) n'afọ 2018.

2. Ndị Fulani ochiehi

Ndị ọchịehi

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Fulani ọchịehi nke ụfọdụ kporo 'Fulani militia' na Bekee bụ ndị na-achịghari ehi si na mpaghara Ugwu rue Ndịda Naijiria na mpaghara ndị ọzọ dị n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

Ọtụtụ n'ime ha bu ndị ụka Alakụba.

Etu ha si gbanwe

Mbụ a ma ha naanị dịka ndị na-achị ehi agagharị na mpaghara dị iche iche dịka ihe ha na-eji karị bụ naanị mma na osisi.

Ụgbua ha ji egbe AK-47 achịgharị ehi ha, ebe ọtụtụ na-ebo ha ebubo igbusị ndị mmadụ, ibibi ugbo ndị ọrụ ubi nakwa idina ụmụnwaanyị n'ike.

N'afọ 2014, nchọpụta 'Global Terrorism Index' kpọpụtara aha ndị Fulani ọchịehi dịka "otu ndi oyiegwu no n'ogogo anọ ndị kachasi dị ọjọọ n'ụwa".

3. Al-Shabaab

Al-Shabaab

Ebe foto si, AFP

Al-Shabaab bụ otu ndị oyiegwu si mba Somalia nke ebumnobi ha na mbụ bụ nchekwa obodo na ime ka mba ahụ bụrụ naani okpukperechi Alakụba(Islamic State')mana ha na-akpakwa ike na Kenya nakwa Yemen.

Etu ha si gbanwe

Otu mụtara Al- Shabaab n'afọ 2006 bụ otu 'Islamic Courts Union(ICU) bụ otu ndọrọndọro ọchịchị jikọrọ ụlọikpe Sharia na mba Somali,na-akpa udo na mba ahụ ka Agha Somalia bichara.

Dịka,ngalaba 'Foreign Relations' nke Amerika si kọwaa, mba Ethiopia bukarị ndị ụka-Kraistị zara mbeku aka na-achi Somalia,wakporo mba ahụ Disemba 2006 chụpụ ICU na Mogadishu. Nke a meere ka ọbara banye otu ahụ n'anya.

Al- Shabaab nke malitere ka onyeisi ICU tinyere akwụkwọ arụkwaghịm ma kposaa otu ahụ,bidoro igbusịsị mmadu aghara aghara.

N"ọnwa Oktoba afọ 2017, ogbunigwe ha gbara gburu ihe karịri mmadụ 500 Mogadishu,isiobodo Somalia.

N'afọ 2019, ha tinyere ogbunigwe nke gbagburu mmadụ 94, ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụakwụkwọ.

N'otu afọ ahụ,a na-ebo ha ebubo mwakpo ụlọoriri dị na Nairobi isiobodo Kenya.

4. MEND

Movement for the Emancipation of the Niger Delta (MEND)

Ebe foto si, Getty Images

Dịka aha ha bụ 'Movement for the Emancipation of the Niger Delta'(MEND) si dị, bụ otu na-agba mbọ ka a kwụsị mmetọ a na-emetọ gburugburu na Niger-Delta nakwa ka oke ndi mpaghara ahụ rute ha aka.

Etu ha si gbanwee

Otu 'MEND' si na ikute ụtaba banye ọgbọ ahịa dịka ha malitere ịtọ ndịọcha na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ mmanụ dị na Niger-Delta.

A nụghị na akụkọ na ha gburu onye ọbụla ha tọọrọ mana ha na-anapụ ha ego. Ha na-agbarikwa okporo mmanụ agbịdị.

Mkpamkpa ha na otu ndi yiri ha na-akpa riri Naijiria nde kwuru nde dịka ha malitere tọwa ndị nkịtị na-anapụ ha ọ kpụrụkpụ ego iji gbara isi onwe ha.

E mecha,goomenti etiti nye ha' mgbaghara(amnesty) n' oge ọchịchi Musa Yar'Adua.

Ipob na ESN ha a na-achọ ịghọ otu agha nnụpuisi?

Biafra na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Ipob bụ otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra nke onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu si na otu Massob pụta hiwe.

Ha ji ngagarịiwe nakwa ịgbasa ozi n'ịntanet achọ ọchịchị obi ha.

Etu ha si na-agbanwe

N'ọnwa Disemba afọ 2020, otu Ipob hiwere otu ha kpọrọ 'Eastern Security Network' nke ha kwuru bụ maka ichekwa Ọwụwa Anyanwụ Naijiria n'aka ndị ọchiehi.

Eastern Security Network

Ebe foto si, Eastern Security Network

Ha kwuru na ESN bụ maka"'ichekwa Ọwụwa Anyanwụ"n'ihe ha kpọrọ "mmekpa ahụ" ndị ọchiehi bụ ndị ọtụtụ akụkọ kwuru na egbusịsị ndị ọrụugbo,emebi ugbo ha nakwa awakpo ụmụnwaanyị" na mpaghara ahụ.

Mana otu onye ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa bụ Richard Amuwa kwuru na "Ipob na ESN ga-aghọ otu agha nnupuisi ma ọ bụrụ na gọọmentị emeghị ihe doro anya maka okwu nchekwa."

"O kwesịrị ka e gbobido ha, e meghị otu a, ha nwere ike ịghọ ndịagha nnubupuisi n'Ọwụwa Anyanwụ. Chukwu ekwela ka ha bido kpawa agwa ka ndị Boko Haram!"

Amuwa, onye tara gọvanọ ndị Ọwụwa Anyanwụ na ndị ọrụ nchekwa ụta maka ebidoghị n'oge gbawa mbọ ibelata nsogbu nchekwa na-arị elu n'Ọwụwa Anyanwụ, nke ọ sị nyere Ipob ohere ihiwe otu ESN.

"Kedụ ihe jibu ndị gọọmentị dị n'Ọwụwa Anyanwụ ihibe otu nchekwa maka mpaghara ahụ? Ugbua, Ebube Agụ na ndị ESN ga-ebido nwewa nghọtahie."

Richard Amuwa

Ebe foto si, Richard Amuwa

Nkọwa foto, Richard Amuwa bụ ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa

Na nso nso a, onye bụbu onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Mohammed Abubakar boro ebubo na ọ bụ Ipob nyụrụ ihe na-esi n'Ọwụwa Anyanwụ dịka ndị bu egbe wakporo ụlọmkpọrọ nakwa isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Owere tọhapụ ndị nga karịrị 1000.

Kemgbe ọnwa Januwari afọ 2021 ndị bu egbe awakpoola ogige ndị uweojii karịrị iri n'ala Igbo, ma gbuo dị uweojii iri.

Mana otu Ipob nakwa Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma kwuru na o nweghị ajị dị n'abụ Ipob kama na ọ bụ ndị iro si steeti ọzọ na-awụnyere gọọmenti steeti ahụ aja na garị.

Gọvanọ Anambra steeti bụ Charles Soludo akọọla oku ka ndị iwe dị n'obi na-ebugharị egbe pụta ka e nye ha mgbaghara ma nye ha ọzụzụ nke Bekee kpọrọ "Amnesty" mana o nwebeghị ndị zara oku ahụ.

N'aka nke ọzọ, ụfọdụ ndị mmadụ na-ajụ na ọ bụrụ eziokwu na ọ bụghị Ipob hiwere ESN maka nchekwa Ọwụwa Anyanwụ, ebe ka ha nọ nsogbu nchekwa were na-akawanye njọ n'Ọwụwa Anyanwụ?

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị: