Ipob Disinformation Story: Ihe ọkaiwu na-esonye n'ikpe Nnamdi Kanu kwuru maka akụkọ BBC mere

BBC/Getty Images

Ebe foto si, BBC/Getty Images

Ọkaiwu Goddy Uwazurike ekwuola na ejighị gbuogbuo mara ndị Igbo, makana ha ghọtara na ọ bụ mmadụ ka e ji aga.

O kwuru na ndị ahụ agbara n'ama n'akụkọ Disinformation BBC mere maka Ipob abụghị ndị Igbo makana onye ọ bụla nwereike ga goro akwa maọbụ ọkọlọtọ Ipob ma jiri mewe ihe sọrọ ha.

"E nwere ndị ọrụ ha bụ ibute ọgbaghara n'ala Igbo," bụ ihe Uwazurike kwuru.

Uwazurike kwuru na kamgbe afọ 2021 emeghere ndị ekperima ụlọ mkpọrọ dị n'Owerri bụ isi obodo Imo steeti ka e bidoro nụwa maka oke ọdachị n'ala Igbo.

O kwuru na mgbe ọ bụla e kwuru na egburu ndị agha Naịjirịa n'ala Igbo bụ ka ebute ọgbaghara na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

O kwuru na Simon Ekpa abụghị onye Igbo ya mere o ji ekwu ụfọdụ okwu na-ebute ọgbaghara n'ala Igbo.

O kwuru na ọtụtụ akụkọ ogbugbu mmadụ a na-ebo ndị Igbo maọbụ ndị Ipob bụ okpotokpo asị.

Uwazurike kwuru na ọ bụ makana Nnamdi Kanu nọ na mkpọrọ bụ ihe kpatara ọgbaghara na-eme n'ala Igbo.

"E kweteghị m n'atụmaatụ igbu ndị mmadụ," bụ ihe Uwazurike kwuru.

Ihe "Ijele speaks" kwuru

Chukwuka Ofoegbu

Chukwuka Ofoegbu e ji 'Ijele Speaks' mara bụ onye na-akatọkarị otu Indigenous People of Biafra etoola akụkọ mgbama BBC mere ma sị na o gosiri eziokwu.

N'ọnụ ya, "o teela anyị ji eche ka BBC mee udiri akụkọ a."

"Eziokwu na-afụ ụfụ n'ahụ", bụ ihe Ijele kwuru.

O kwukwara na ọ bụ ndị nọ na mba ofesi ka ndị nọ n'ime ọhịa na-ege ntị were akpa mkpa mkpa ha na-akpa n'ala Igbo.

O nyekwara ndụmọdụ ka ndị na-eji akara soshal midia ha na-ekwu okwu ụgha maọbụ nke akpọmasị kwụsị ya makana a ga-agba ha n'anwụ etu e si gbaa ndị ọzọ.

O kwuru na onye na-ekwu na Ipob anaghị egbu ndị mmadụ anaghị ekwu eziokwu makana mgbe ọ bụla atọrọ ụfọdụ mmadụ n'ala Igbo, ọ bụ na ngalaba ndị Eastern Security Network ka a na-ahụ ha.

"Ụwa niile ma na Orsu, ihitte Uboma, Lilu n'ụfọdụ ebe dị n'Imo steeti bụ ebe ESN wegharala", bụ ihe Ijele kwuru.

'Anyị amaghị Ipob dịka ndị na-egbu mmadụ' - Ohaneze Ndigbo

Ndigbo

Ebe foto si, BBC/Getty Images

Ohaneze Ndigbo ekwuola na ihe e jiri mara otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ ndị chọrọ ọdimma na ihunanya ndị Igbo.

Ha bụ ọnụ na-akatọkarịrị mmegbu a na-emegbu ndị Igbo na Naịjirịa.

Onu na-ekwuru Ohaneze Ndigbo bụ Alex Chiedozie kwuru na ọ ka na-agbagọjụ ndị mmadụ anya etu ụfọdụ mmadụ si egbu mmadụ n'ala Igbo.

N'ọnụ ya, ndị Ipob apụtala ugboro ugboro kwuo n'aka ha adịghị n'ogbugbu ndị a na-eme n'ala Igbo

N'ọnụ ya, "chineke kechara mmadụ kenye ya akọ na uche ka o wee mere ihe dị mma nakwa nke dị njọ."

"Onye ọbụla na-eme ihe ọjọ, ihe ọjọ ga-ezuteriri ya" bụ ihe Alex kwuru.

O kwuru na emecha aka ga-akparịrị ndị a na-eme ihe ọjọ a.

Chiedozie kwuru na ihe ọ na-ahụ na soshal midia maka ogbugbu na-eme n'ala Igbo na-agba anya mmiri.

Chiedozie kwuru na Ohaneze na-arịọ ụfọdụ ndị Igbo bi na mba ofesi ka ha kwụsị ikwu okwu akpọmasị maọbụ nke ụgha na-ebute ọgbaghara n'ala Igbo makana "ọ bụrụ na ha mebisie be nna ha, kedụ ebe ha ga-alọta maọbụrụ na ọsọ chụwa ha."

N'ọnụ ya, "Ohaneze Ndigbo enweghị akpa ego maọbụ ndị uweojii maọbụ ndị agha, mana ọ bụ ọnụ okwu ka anyị ji arịọ ka ndị na-eme mkpa mkpa a kwụsị ya."

Aha onyonyo, Ayo Adebanjo: Ekwuwe 'competence' ndị Igbo kara ebu ndi Ugwu ụzọ nọgide n'ọkwa onyeisiala

Ihe Ngalaba Nigerians in Diaspora Commission kwuru

Ngalaba Nigerians in Diaspora Commission ekwuola na ha akwadoghị ibusasi akụkọ ụgha nke na-ebute ọgbaghara na Naịjirịa n'ụzọ ọbụla.

Ọnụ na-ekwuru ngalaba ahụ bụ Abdrahman Balogun kwuru na naanị ihe ngalaba NIDCOM nwerike ime bụ inye ndị niile na-eji akara soshal midia ha akpọ oku ogbugbu ka ha kwụsị ya.

NIDCOM bụ ngalaba na-ahụ maka imee ka ndị Naịjirịa nọ na mba ofesi sonye na nwulite na ọdịmma akụ na ụba Naịjiria.

Akụkọ ka na-abịa