IPOB: Ndị Naịjirịa ji soshal midịa akpọ oku ka e gbuo ndị ha sị na-egbochi nnwereonwe Biafra

Aha onyonyo, Nyocha BBC ekpuhela ndị ji Soshal Midịa ebute ọgbaaghara na ogbugbu ndị ha sị na-egbochi nwereonwe Biafra.

Nyocha BBC ekpuhela ndị ji Soshal Midịa ebute ọgbaaghara na ogbugbu ndị ha sị na-egbochi nwereonwe Biafra.

Efe Uwanogho eji Omote Biafra mara nwere mmadụ puku iri anọ na-eso ya na Facebook. Efe anaghị ezo ihu ya dịka ọ na-ama ọkwa na-ebute akpamasị nye ndị agburu ọzọ.

Ọ na-eyi uwe kajetị nke na-egosi ọkolọtọ Biafra na egosi agwa na anyanwụ nke bụ njirimara ọkolọtọ Biafra.

Ọ na-ekwu sị, " Chọwa ndị mgba okpuru a...ọ bụ ha ka ekwesịrị ịpepụ isi. Ọ bụ ha ka ekwesịrị ịgba ọkụ".

Efe na-ama ọkwa ka awakpoo ndị ọ sị na-egbochi nkewapụ Biafra dịka mba nọọrọ onwe ya.

Ọkwa ọ na-ama na-ebute ọtụtụ nkwafu ọbara.

Cheta na n'afọ 1967 na ndị chọrọ nwereonwe mba Biafra na gọọmentị Naijirịa lụrụ ọgụ afọ atọ nke butere ọnwụ ihe karịrị otu nde mmadụ nke ọtụtụ n'ime ha si na mpaghara ahụ chọrọ ikewapụ.

Dịka ihe dịka afọ iri ise gachara, ndị ka na achọ nereọnwe a jizi Soshal Midịa akpa ike.

Uwanogho sị mba Ịtalị ezịsa ozi ya dịka gọọmentị Naijirịa machiri otu Indigenous People of Biafra(IPOB).

Nyocha BBC gosiri ọtụtụ ndị nkwado Ipob sị mba Yurop, Amerịka, Eshịa na Afrịka na-agbasa ozi ụgha na Soshal Midịa nke na ebute ọgbaaghara.