Nnamdi Kanu: Ọkaikpe ekwuola ka a kwụọ Nnamdi Kanu N1billion

Alloy Ejimakor na ndị ọkaiwu ndị ọzọ ga-esonye n'ikpe nke taa bụ Jenuawarị 19 n'Ụmuahia
Nkọwa foto, Ọkaiwu Alloy Ejimakor na ndị ọkaiwu ndị ọzọ ga-esonye n'ikpe nke taa bụ Jenuawarị 19 n'Ụmuahia

Ọkaikpe Benson ekwuola ka akwụọ Nnamdi Kanu ego ruru otu Ijeri ruru otu nde maka etu e si wakpoo ụlọ ya dị n'Isiama Afaraukwu na Sepụtemba 2017.

Ọkaikpe ahụ nyere iwu ka gọọmenti etiti depụta arịrịọ mgbaghara ahụ n'akwụkwọ mgbasaozi atọ maka mwakpo ahụ ha mere na bee ya.

Cheta na

Kanu bụ onye sị na ọ bụ onyendu ndị 'Indegenous people of biafra' - Ipob, gbapụrụ ọsọ na Naijiria n'ọnwa Septemba afọ 2017 dịka ndị agha Naijiria wakpochara be nna ya n'Afaraukwu dị n'Abia steeti.

A kpụpụburu Kanu Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja maka ịzara ọnụ ya n'ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria site ikpọ oku ka e kepụta Biafra na Naijria.

Mana n'ọnwa Eprelu afọ 2017, a tọhapụrụ ya nwa oge maka ọnọdụ ahụike ya.

Gọọmentị Naijiria nwụchigharịrị Nnamdi Kanu na 29 Juun 2021. Jọstis Binta Nyako nke Ụlọikpe Abụja nyere iwu ka e jichie Nnamdi Kanu na mkpọrọ ndị uweojii nzuzo a kpọrọ DSS.

Ndị ọkaiwu

Ebe foto si, BBC

Ka ikpe Nnamdi Kanu si gaa n'ụlọikpe n'Umuahia.

Alloy Ejimakor bu onyendu ndị ọkaiwu ndị ọzọ biara ikpe ahụ gosiri obi ụtọ ya nakwa olileanya na a ga-eleba ikpe gbasara etu e si memina Nnamdi Kanu bụ onyeisi Indigenous People of Biafra na mba Kenya anya, n'oge na-eteghị aka.

Alloy Ejimakor bu onye du ndị ọkaiwu ndị ọzọ biara ikpe ahụ gosiri obi ụtọ ya nakwa olileanya na a ga-eleba ikpe gbasara etu e si memina Nnamdi Kanu bụ onyeisi Indigenous People of Biafra na mba Kenya anya, n'oge na-eteghị aka.

Ọkaikpe Benson Anya malitere ikpe Nnamdi kanu na-eme na High Court dị n'Umuahia taa bụ Jenụwarị 19, 2022 n'elekere iri na ụma (10:30am) nke ụtụtụ a.

Amos Etori bụ ọkaiwu nọchitere ndị agha Naịjiria kwuru na ọ ga-asa okwu naanị mgbe ha nwetere ezigbo akwụkwọ ebe edepụtara ikpe ahụ.

Ọkaikpe Anya gwara gọọmenti eitit ha were usoro ndọrọndọrọ ọchịchị wee soo okwu Mazi Nnamdi Kanu karịa iji usoro ụlọikpe.

Ndị sonyere n'ikpe a gụnyere DSS, gọọmenti etiti, nakwa ndị agha Naịjirịa.

Tupu ikpe a amalite ndị ọrụ nchekwa gbochiri ụzọ ebe e si abanye ụlọikpe ebe anọ ekpe ikpe Nnamdi Kanu n'Abia steeti .

Nke a megidere iwu ọkaikpe Benson Anya nyere gbasara etu ikpe taa bụ Jenụwarị 19, 2022 ga-esi gaa.

Ụlọikpe 'High court 'ahụ ebe a ga-anọ kpe ikpe Kanu taa dị n'ụzọ gawara Ikot Ekpene dị n'Umuahia.

Ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị ọrụ Department for State(DSS) nakwa ndị uweojii ji ụgbọala ha gechie okirikiri ebe ahụ niile.

Ụloikpe High Court dị n'Umuahia

Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu awụchielarii n'ụlọikpe nakwa nke gọọmenti etiti mana ikpe ahụ ga-amalite n'elekere asatọ n'ụma(8:45am).

Alloy Ejimakor na ndị ọkaiwu ndị ọzọ ga-esonye n'ikpe nke taa bụ Jenuawarị 19 n'Ụmuahia

Etu ikpe Nnamdi Kanu n'Umuahia ga-esi metụta nke Abuja

Aloy Ejimakor

Ikpe abụọ dakwasiri Nnamdi Kanu n'isi taa bụ Wenezde ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Jenụwari 2022.

Ikpe Kanu bụ onyeisi Indigenous People of Biafra ga-aga n'ihu n'Abuja nakwa Umuahia n'ime otu ụbọchị ahụ.

Kedụ ndịiche na ha abụọ?

Ikpe Umuahịa bụ ikpe Nnamdi Kanu kpụpụrụ gọọmentị Naijirịa n'ụlọikpe maka ikike dịịrị ya dịka mmadụ ha metọrọ n'ihi etu ha ji siri Kenya kpụlata ya Naịjirịa.

Ọkaikpe ya pụrụịche bụ Aloy Ejimakor sị na ọ bụ ya bụ isi sekpu ntị n'ikpe Umuahịa.

Ọ sị na "Ikpe Umuahịa na nke Abuji yiri" mana ha abụghị otu".

Nnamdi Kanu na ndí Okaikpe ya
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na ndí Okaikpe ya

Ikpe Umuahia

O kwukwara na nke Umuahia bụ ikpe gbasara ebubo mmetọ ikike dịịrị onye Bekee kpọrọ "civil case' ebe nke Abuja gbasara ebubo oke arụ megide gọọmentị nke Bekee kpọrọ "criminal case".

O kwuru na gọọmentị Naịjirịa emeghi ihe ha kwesịrị ime iji kpọlata Nnamdi Kanu, na ha kwesiri "i degara gọọmentị Kenya maọbụ nke Briten akwụkwọ ịrịọ ha ka ha kpọlọta Nnamdị Kanu maka ikpe ya, mana ha emeghị etu ahụ".

Ejimakor sị na "e kwenyere na gọọmentị Naịjria dara iwu megidere Nnamdị Kanu dịka mmadụ mgbe ndị agha wakporo ya na be ya na 2017, nke mere o jiri gbaga Kenya ebe ha gara kpachie ya n'ike na 2021. Ha emeghị ihe ha kwesiri ime dịka onye e jidere n'obodo ọzọ".

Ọ sị na Gọọmentị Naịjirịa dara iwu megidere ikike ndịrị ya dịka mmadụ, dịka ka ha siri kwekọrịta ha na ndị mba ndị ọzọ.

Ejimakor sị na Naịjirịa enweghịzị ikike ịkpe Nnamdi Kanu Ikpe n'ihi nke ahụ.

Ọ sị na ihe ikpe nke Umuahịa na-arịọ ụlọikpe bụ ka gọomentị Naịjirịa kpọghachị Nnamdi Kanu ebe ha si dute ya bụ Kenya maọbụ Briten gazie rịọ gọọmentị ahụ ka kpọnye ha Kanu.

Ọ na-ekwu na ikpe Umuahia na-azọ na onye ọkaiwu ji ya bụ ikpe enweghị ikike ikpe ụdịrị ikpe ahụ maka etu e si kpọlata Nnamdi Kanu.

Nke a pụtara na mpụtara ụlọikpe Umuahia nwereike ịkụsa nke Abuja maka na ike ụlọikpe abụọ ahụ bụ otu.

Mkpebi ikpe nke Umuahia bụ echi bụ Wenezde.

Ọ bụ Aloy Ejimakor na-ahụ maka ikpe nke Umuahia.

Ikpe Abuja

Ejimako sị na gọọmentị Naịjirịa bụ ndị nwe ikpe Abuja bụ nke ha ji ekpe Nnamdi Kanu ikpe igbu ọchụ, ịkwada gọọmentị Naịjirịa, Iyi ndụ egwu na ebubo ndị ọzọ.

Ebubo niile gọọmentị Naịjirịa na-ebo ya ugbua eruola iri na ise (15) ma a gụnye asaa nke ochie ha wegaara ụlọkpe ukwu dị n'Abuja nke ọkaiwu Binta Nyako nọ n'isi ya.

E jidere Kanu nke mbụ n'afọ 2015 bụ mgbe e boro ya ebubo igbu ọchụ, ịgbasa ozi nwereike itisa obodo, imetọ aha obodo, iji egbe na-enweghị ikike, iji ụzọ nzuzo bubata na Naịjirịa na ndị ọzọ.

Nnamdị Kanu bụ onyendụ ndị Indegenous People of Biafra sị Afaraukwu Ibeku dị n'Umuahia, Abia steeti bụrụkwa onye mba Briten chọrọ ka ndị Igbo pụọ na Naịjrịa.

Ikpe ndị ọzọ Nnamdị Kanu nwere

Ejimako na-akọwa na ha nwekara ikpe ọzọ n'Abuja ebe ha na-arịọ uloikpe ka ọ kụsa ya bụ ebubo ndị gọọmentị maka na ya bụ ụlọikpe erughị ogo ikpe ya bụ ikpe nke Bekee kpọrọ "preliminary objection".

Kanu nwekwara ikpe n'African Commission on human and People's right.