Nnamdi Kanu Re-arrest: Ebe na etu anyị si nwụchịe Nnamdi Kanu - Gọọmenti etiti

Ebe foto si, Nnamdi Kanu's Facebook Page
Gọọmenti Naịjirịa ewepụtala akwụkwọ ozi ebe ha kwuru na a nwụchịri onyeisi Indigenous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu site na njịkọ aka mba ndị n'oke ha na Naịjiria n'atụmaatụ ofesi ahaziri nkeọma.
Ha kwuru na ha nwụchịrị Kanu ma kpọnye ya National Intelligence Agency, NIA ma kpọghachite na Najirịa ka ọ bia zara ọnụ ya n'ụlọikpe.
Onye wepụtara akwụkwọ ozi ahụ bụ Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari.
N'ime akwụkwọ ozi ahụ, onyeisiala Naijirịa kwuru na mwakpo nke Ipob kpasuru rụrụla 55 butere ọnwụ , mmebi ọtụtụ ụlọọrụ gọọmenti nakwa ahụhụ metụtara ụmụ Naịjirịa.
" O telarii gọọmenti malitere inyocha emume ndị otu Ipob ma kwete na ego ha ji kwado onwe ha bụ nke e nwetere n'ụzọ na-adịghị mma."
" Site na nwụchị ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa nwụchịri Kanu, udo alaghachitela n'obodo ebe ndị a awakporo na nso nso a ebe ujọ mkpa mkpa ndị omekome a na-akpa ji ha."
Onyeisiala Buhari tokwara etu ndị ọrụ nchekwa si wakpoo ụlọ Sunday Igboho n'ụbọchị Julai 1, 2021 onye nke Buhari kwuru na-eyi ndị mmadụ egwu.
Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na ozi akpọmasị nwamadi a na-ezisa na-ebute okwu.
" Ọ bụ eziokwu na gọọmenti etiti na-akwanyere ikike diri onye ugwu, anyị chọrọ ka ndị mmadụ mara na anyị agaghị anabata atụmaatụ ọbụla ga-ebute mkposa mba Naịjirịa."
" Iwu onyeisiala nyere ndị ọrụ nchekwa Security Services gbasara onye ọbụla ahụrụ bu egbe AK-47 kwụ chịm. Egbe abụghị ngwa ọrụ e ji achọ udo, ya mere ndị ọrụ nchekwa ga-eme onye ọbụla bu ya ihe ha kwesiri ime ha."
Onyeisiala Buhari toro etu ndị ọrụ nchekwa si nwuchie Nnmadi Kanu nakwa Sunday Igboho ma na-arịọ ha ka ha jiri aka a wee sepụta ndị niile na-edezi ụmụakwụkwọ, ndị bi n'ime obodo na mpaghara ugwu."










