Nnamdi Kanu: Ikpe Nnamdi Kanu agaghị n'ihu taa n'Abuja

Ebe foto si, BBC/screen grab
Ikpe Nnamdi Kanu na mmadụ ise ndị ọzọ nke ọkaikpe Binta Nyako hibere nn'ụbọchị Wenzde agaghị n'ihu n'Abuja taa.
Aloy Ejimakor bụ ọkaikpe Kanu gwara BBC na nke a agaghị n'ihu maka na ọkaikpe anọghị ya.
O kwukwara na dị ka o si kwụrụ, ahọpụtabeghi ụbọchị ọhụrụ a ga-eji nụrụ ya bụ ikpe.
Cheta na Nnamdi Kanu na onwe ya kwuru na ọ ga-aga n'ihu na-eme ihe ọ na-eme rue mgbe a ga-akpọ ya oku na ụlọikpe kachasị na Hague.
Ọkaikpe Binta Nyako bughariri ikpe ọ na-ekpe onyeisi otu na-achọ mmwereonwe Biafra a kpọrọ Indegenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ikpe banyere ebubo na ọ kpara nkata imegide mba ahụ ga Jenụwarị 27 nke afọ 2021.
Nke a na-abị ka Ọkaijpe nyako kpebiri na ya agaghị eji maka Maazị Kanu anọghị na Naịjirịa were gbanyụọ ọkụ n'ikpe ọ na-ekpe.
Ọ bụ n'afọ 2017 ka Nyako nyere Kanu ohere ịla ụlọ ya ma siri ebe ahụ na-abịa ikpe. E nyere ohere a dịka Nyako kwenyere na Kanu kwesiri ịga nata ọgwụgwọ dịka ọ nọtere aka na mkpọrọ.
Ọ bụ Ọkaiwu KC Ejiofor nọchitere anya Kanu n'ulọikpe.
Ọ gwara ụlọikpe na ọ bụ gọọmentị na-adọghachi ikpe a azụ.
Ọkaiwu na-anọchite anya gọọmentị kwenyere na nke a bu eziokwu, ma kwukwa na ha agwaala ụlọikpe ihe kpatara ya.
Ọkaikpe Nyako sị ka osirila dịrị, ikpoe ga-aga n'ihu na Jenụwarị 2021.
Ka ikpe malitere Ọkaiwu nọchitere anya ndị Ipob bụ KC Ejiofor kwuru na Bright Chimezie bụkwa onye kwesiri ịbịa ikpe taa amataghi maka ya bụ ikpe makana ọ nọ n'ime obodo ebe tecknuzu ekwentị adịghị.
ọkaikpe Nyako nyere iwu ka ejiri ekwenti zie Maazị Chimezie na ndị ọzọ ozi ka ha ghara isi na ya enweteghị ozi ya.
Ọkaikpe Nyako kagburu ohere ahụ onyere ma nye iwu ka anwụchie Kanu ebe ọbụla a hụrụ ya na Naịjirịa.
Ọkaiwu Kanu bụ Ifeanyị Ejiofor sị na ihe mere o jighi bịa ikpe dịka o si kwesi esighi ya n'aka.
Ọ sị na ọsọ Kanu gbara bụ makana ndị agha wakporo ụlọ ya di na Afara Ukwu dị n'Abia steeti, ma kwukwa na ọ bụ ihe a kpatara Kanu jiri gbaa ọsọ ndụ.
Ejiofor sị ụlọikpe weghachi ohere ahụ ha nyere ka Kanu siri na ulọ ya abịa ikpe, nke ga enye ya ohere ịlọghachite Naịjirịa bịa zara ọnụ ya.
Kanu n'onwe ya na-ekwu na mkpebi Ọkaikpe Binta Nyako achịtaghị aja maka e mere ya iji pịchị ya na Ipob ọnụ.
Ndị narala Kanu akaebe

Ntọghapụ Kanu bịara na mmezu dịka Sinetọ Enyinnaya Abaribe na ndi ọzọ ji otu nde narị naịra gbara ya akaebe.
Ndị bụ Tochukwu Uchendu nakwa Ụkọchukwu Jeu bụ Ben El-Shalom.
Ọkaikpe Nyako sịbụ ka ndị nye ụlọikpe ego ahụ jiri gbara Nnamdi Kanu akaebe makana ha kpọghị ya bịa ụlọikpe dịka he siri kwee nkwa.
Ebe okwu siri malite
Ọ bụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Ọktoba n'afọ 2015 ka gọọmentị Naịjirịa nwuchiri Nnamdi Kanu na Legọs dịka o si mba Briten bata.
Gọọmentị Naịjirịa boro ya ebubo na ọ na-agba Naịjirịa mgba okpuru site na Redio Biafra ọ nọ n'isi ya.
Kanu mechara nọrọ na mkprọrọ ọnwa iri na asatọ na nga dị na Kuje.
Tupu a kpọchie ya n'ụlọ mkpọrọ, Kanu nọ n'aka ngalaba a kpọrọ Department of State Services (DSS) ruo Janụwarị 2016 bụ oge ụlọikpe sị ka akpọrọ ya gawa nga.
Ọ bụ n'ụbọchị 28 nke ọnwa Eprelụ 2017 ka Kanu pụtara na mkpọrọ dịka o mezuru ihe Ọkaikpe Binta Nyako kwuru iji nwe ohere ka siri ebe ahụ na-abịa ikpe.
Ndị anwụchiri ha na Kanu
Maazị Bright Chimezie, Chidiebere Onwudiwe, David Nwawuisdi na Benjamin Madubugwu bụ ndị anwụchiri ha na Kanu.
Ebubo gọọmentị boro ha bụ na so kpaa nkata ịgba Naịjirịa mgba okpuru nakwa iji egbe na-enweghi ikike ya.
Ọ nde narị iri n'isi otu onye ka Ọkaikpe Binta Nyako mara ha iji tụghapụ ha n'ụbọchị 25 nke ọnwa Juun 2018.
Ọkaikpe Nyako machikwara ndị a ị ga njem n'ofesi.
N'ụbọchị 20 nke ọnwa Febụwarị 2018, Ọkaikpe Nyako wepụrụ ndị a n'ime Nnamdi Kanụ, dịka ọ sị na ikpe nke ha kwesiri ịkwụrụ iche maka ahụghị Kanu anya.

Ebe foto si, Getty Images
Mkpebi ịmalite ikpe a ọzọ
Ọ bụ n'ọnwa Maachị 2019 ka Ọkaikpe Nyako kpebiri ịchabị ohere ahụ o nyere ndị Kanu ka ọ na-esi be ya abịa ikpe.
N'ụbọchị ahụ, Ọkaikpe Nyako nyekwara iwu ka anwụchie Maazị Kanu ebe ọbụla a hụrụ ya.
Ebe Kanu kwụ banyere ikpe a
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere 'afo 2019, Maazị Kanụ sị n'ọsọ ya gbara bụ makana "ndị agha bịara Naịjirịa igbu" ya.
Ọ sịkwa na ya dị njikere ịbata bịa zara ọnu ya, mana ọ si na-ekweeiri ime ihe etu ọ ga-esi kwụrụ ọtọ.
Ọkaiwu ya bụ Ejiofor n'onwe ya rịọrọ ụlọikpe ka o tinyekwa ohere ahụ enyere Kanu ka o si be ya na-abịa ụlọikpe, nke ga-enye ya ohere ịbịa Naịjirịa maka ikpe a.
Ka ọkwụ ugbua, iwu Ọkaikpe Nyako nyere ka anwụchie Kanu ka dị.













