Nnamdi Kanu ga-arịọrịrị Ekweremadu mgbaghara - Ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ

Dave Umahi, Nnamdi Kanu na Nnia Nwodo,

Ebe foto si, BBC/Getty

Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ agbakọọla aka katọọ ihe ndị Nnamdi Kanu kwuru n'ozi ọ gbasara na mgbede ụbọchị ụka.

Ọnụ na-ekwuchitere David Umahi bụ onyeisi oche ọgbakọ ahụ gwara BBC n'ekwentị na ọ bụ ihe mwute na emebọrọ Ekweremadu na Jamini.

N'ọnụ ya "Ihe anyị tụrụ anya na aka ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ ịpụta rịọ mgbaghara na ihe ha mere nna ha adịghị mma. Ekweremadu bụ dike ndị Igbo."

Maka okwu Nnamdi Kanu kwuru gbasara ụmụaka ndị Gọvanọ, Uzo kwuru na ọ bụ egbe ọnụ ka Kanu na-agba.

Uzo kwuru na Kanu chọrọ ịdị mkpa karịa Biafra nakwa ndị ntoroọbia ọ lapụtara e gbuo n'Abia.

N'ime ozi ahụ, Kanu kwukwara na ha na-eche onyeisioche Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo ebe ọbụla ọ pụtara na mba ofesi.

O kwukwara na ha ga-eme ya ihe ha mere Ekweremadu ma ha jiri anya hụ ya ebe ọbụla n'ofesi.

Aha nkeananụānụ, 'O bu Umahi rịọrọ Onyeisiala e were kpọbụ ndịagha wakporo ụlọ Nnamdi Kanu'

Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ Nwodo n'ekwentị, ọ sị na Nna agaghị atọ n'ọgbọ ya na ụmụ ya a na-ama aka.

"O nweghizi ihe ọzọ m nwere ikwu maka okwu a," bụ ihe si ya n'ọnụ pụta.

"Meenu m ihe emere Ekweremadu ma m zọhie ụkwụ"

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nnmadi Kanu na-akatọ gọọmenti etiti maka mmegbu okwuru na ana-emegbu ndị Igbo

Kanu kwukwara na ndị nso ya nwereike ịme ya ihe e mere Ekweremadu maọbụrụ na ọ zọhie ụkwụ na onwe ya.

O kwuru na ihe mere eji wakpo Ekweremadu bụ iji nwụchie ndị ọchịchị ala Igbo n'akpịrị.

Ihe ụlọọrụ nnọchiteanya kwuru

Onye ntaakụkọ BBC kpọkuru Yusuf Tuggar bụ onye nnọchiteanya Naịjirịa na mba Jamini iji jụpụta ya ihe mere oge Sinetọ Ekweremadu bịara mba ahụ.

Tuggar gwara BBC sị, "e zitere m ozi ịbịa emume ahụ, m gakwaranụ ya bụ emume wee hụ ebe a wakporo Ekweremadu ma hụ ebe ndị uweojii na-agba ya ajụjụ ọnụ n'ime ụgbọala."

"Anyị kpara ma ọ bụ ka e tinye ya n'ụgbọala m, mana Ekweremadu sị ka o soro ụgbọala ndị uweojii, nke o ji laghachị n'ụlọndina ebe ọ nọ.

"Ụlọọrụ nnọchiteanya anyị amaghị na Ekweremadu na-abịa; ọ bụrụ na anyị ma, ọ bụ mụ na ya gaara eso gaa emume ahụ."

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ọrụ gọọmentị gbaa mbọ hụ na ha gwara ndị ụlọọrụ nnọchiteanya mba ọbụla ha na-aga, iji gbochie ụdịrị ọdachi a.

O kwukwara sị na ha na-agba mbọ ịhụ na aka nwụchiri ndị a wakporo Ekweremadu, makana iwu mba Jamini kwuru na mwakpo ọbụla metụtara onye ọchịchị si mba ọzọ ga-ebute oge n'ụlọmkpọrọ.

Tuggar kwuru na ha na-akpọku gọọmentị Jamini ka ha sorokwa kpọọ ndị Ipob "ndị oyiegwu", ka o kwuchara na ha na-aga n'ihu na-ebiputa akwụkwọ ikike njem nke ha.

Akụkọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Food vendor: Ndị mba ọzọ na-abọ nri ma abọ karịa ndi Naịjirịa