Nwa agbọghọ ọzọ anwụọla n'ụlọ oriri na Legọs

Ebe foto si, Getty Images
N'ime akwụkwọ ozi ndị uweojii ziputere ha nyere aha nwa agbọghọ ahụ ka 'Jessica'.
Ha kwọwara na site n'ihe ha hụrụ, ọ dịka eji akwa tọgbu ya bụ nwaanyị.
Ha kwukwara na ha hụrụ ọbara ebe niile n'ụlọ oriri Southbound dị na Morogbo.
He ebido kwala nyocha banyere etu ọnwụ nwa agbọghọ ahụ sị mee.
Nke a ga-eme ya ugboro anọ a na-achọta nwaanyị atọgburu n'ụlọ oriri n'ọnwa Ọgọst.
Ekele Eid-el-Kabir!
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekeleela ndị ụka alakụba niile dịka ha na-eme emume akpọrọ eid-el-Kabir taa. Ọ gwara ha nabata udo ma gbara okwu naụka ọsọ.
N'otu aka ahụ, aka chịbụrụ Naijirịa bụ Goodluck Jonathan, Bukola Saraki nakwa ndị ọzọ ezigarala ndị ụka alakụba ozi ekele n'emume eid el kabir.
Ọzọ,
Dr. Uwazurike Daniel bụ kọmịshọna ahụịke n'Ebonyi steeti akatọọla akaụkọ na-efegharị na ọrịa yellow fever egbuola mmadụ iri abụọ n'obodo ahụ
Ọ gwara BBC Igbo na akụkọ ụgha ahụ malitere maka na ndị kọmịshọna gara obere ezumike nke Bekee kpọrọ 'Leave'
Na mba ofesi
Ndị uweojii na mba Norway ekwuola na ha na-enyocha onye egburu n'ime ụka ndị alakụba dịka ihe na-eyi ndụ egwu.
Okwu a bịara dịka otu nwoke bu egbe wakporo ụlọekpere ndị alakụba ma gbuo otu onye n'abalị Satọde.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Otu Arsenal jiri "chizoba" zaa aha nna ha dịka ha ji otu ọkpụ goolu asataghị ihe merie otu Newcastle mgbe ha zutere onwe ha.
N'otu aka ahụ Man United na Chelsea na-asọkọta mpi ugbua n'ama egwuregwu Old Tafford.
Akụkọ BBC Igbo na nkeji
Ihe nkiri nke taa
PDP azọrọla Bayelsa

Ebe foto si, BAYELSA STATE MIN OF INFORMATION AND ORIENTATION
Otu ndọrọndọrọ 'Peoples Democratic Party' emeriela na ntuliaka ndị isioche nakwa kaụnselọ okpuruọchịchị niile dị na Bayelsa Steeti e mere na Satọde 10 Ọgọstụ, 2019.
Onyeisioche ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Bayelsa Steeti (BYSIEC) bụ Remember Ogbe gwara BBC na ntuliaka a e mere n'okpuruọchịchị asatọ bụ nke kachasị mma na steeti ahụ.
O kwuru na pasentị ndị pụtara binyeaka karịrị iri isii, na udo dị dịka enweghi akụkọ ọgbaghara ọbụla maọbụ onye nwụrụ na ntuliaka ahụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na pati dị iri anọ na anọ n'ime pati iri itoolu na otu so mee ntuliaka, nke otu APC na-eso n'ime ha.
Peter Obi asaala ebubo maka akwụkwọ njem mba Amerịka

Ebe foto si, Val Obienyem
Onye ji aha PDP zọọ ọkwa osote onyeisiala bụ Peter Obi akatọọla akụkọ na-efegharị, nke kwuru na a jụrụ inye ya akwụkọ ikike ịga mba Amerịka.
Onye ndụmọdụ ya na mgbasaozi bụ Valentine Obienyem kwuru na Obi nọ na mba Amerịka mgbe akụkọ ahụ na-efegharị.
Valentine sị na onye ọbụla maara na Peter Obi bụ onye eji eje mba nke mere na ọtụtụ ụlọọrụ nakwa mba ga-achọ ka ya na ha nwee mmekọ.
O kwuru na ndị buru akụkọ ụgha a n'isi bụ ndị maara ụdị nkwanye ugwu na-abịa n'ebe Obi nọ ma ha chọrọ imebisi aha ọma ya.
Akụkọ nọ na-efegharị ụbọchị ole na ole gara aga, ọkachasị na soshal midia kwuru na ụlọọrụ mba Amerịka jụrụ inye Obi akwụkwọ ikike njem n'ihi nrụrụaka na mpụ.
Buhari na Ramaphosa ga-ezukọ n'Ọktoba

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Mohammadu Buhari anabatala ọkpụkpọ oku onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa kpọrọ ya ka ha nwee nzukọ n'ọnwa Ọktoba.
Onye enyemaka Buhari na mbasaozi bụ Garba Shehu kwuru na Buhari nabatara ọkpụkpọ oku a iji kwụsị oke ogbugbu ụmụ Naịjirịa na mba Saụt Afrịka.
Na mba Chaịna

Ebe foto si, AFP
Oke mmiri ozuzo a kpọrọ Typhoon Lekima egbuola mmadụ iri abụọ na asatọ ma chụpụ mmadụ karịrị otu nde n'ebe obibi ha na mba Chaịna.
Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na ọ bụ mbuze so oke mmiri ozuzo a gburu ọtụtụ mmadụ, ebe a ka na-achọ mmadụ iri achọ.
N'egwurgwu

Ebe foto si, Getty Images
Tottenham Hotspur esorola nzọm ụkwụ Liverpool na Manchester City nwete mmeri n'asọmpi Premier League malitere na ngwụcha izuụka.
Ha ji ọkpụ goolu atọ asatara otu merie Aston Villa, ebe Burnley na Brighton nwetekwara mmeri.
Nkeji











