Election 2019: Taa ka a ga-eme ntuliaka ọkwa gọvanọ

Ntuliaka

Ndị mmadụ ga-alaghachị n'ọgbọ ntuliaka taa ịga tụọ vootu ha ga-eji họpụta ndị ga-abụ gọvanọ ha nakwa ndị ga-anọchite anya ha n'ụlọomeiwu nke steeti.

Nke a na-abịa ka izu abụọ e ji mechaa ntuliaka e ji họpụta onyeisiala gachara.

Ebe ụfọdụ na-azọ ịlọghachị bịa chịa nke agba nke abụọ, ndị ọzọ na-agbalị ịzọta oche ọhụrụ.

N'ụfọdụ mpaghara, ndị mmadụ na-atụ ụjọ maka ọnọdụ nchekwa, ọkachasị ebe ndị dịka Rivas, Legọs na ụfọdụ steeti ndị dị n'Ugwu Naịjirịa; ebe a wakporo ndị mmadụ na ntuliaka ọkwa onyeisiala gara aga.

Ihe ise ị kwesịrị ịma maka ntuliaka ọkwa gọvanọ a:

1) Steeti 29 n'ime 36 na-achọ ịhọpụta gọvanọ:

Asaa ndị ọzọ esonyeghi n'ime ntuliaka nke gọvanọ a ga-eme taa, ụbọchị itoolu nke ọnwa Maachị, 2019, makana ha ahọpụtabuola gọvanọ nke ha mgbe dị iche.

Willie Obiano

Ebe foto si, Anambra state Government

Nkọwa foto, Anambara steeti ga-ahọpụta gọvanọ ọzọ n'afọ 2021, mgbe Obiano ga-aritu n'ọchịchị

Ụfọdụ ahọpụtala n'afọ gara aga, ndị ọzọ ga-ahọpụta n'ọdịnihu.

Steeti ndị ahụ na-agaghị eso bụ Anambara, Kogi, Ondo, Ọshụn, Ekiti, Bayelsa na Edo.

2) Steeti anaghị ahọpụta gọvanọ ga-ahọpụtarịla ndị omeiwu:

Steeti 36 niile dị na Naịjirịa ga-eme ntuliaka iji họpụta ndị ga-anọ n'ụlọomeiwu nta.

Ọfọ ụlọomeiwu

Ebe foto si, Twitter/Nass

Ndị nọkwa n'isi obodo a na-akpọ FCT, ga-esonyekwa n'ime ya, ebe ha ga-eme ihe a na-akpọ "area council election".

3) O nwere ike ịdịrị ụfọdụ ndị na-azọ ọkwa mfe karịa ndị ọzọ:

Ụfọdụ ndị gọvanọ na-azọ ọchịchị nke agba nke abụọ nwere ike ịhụ na ọ dịrịla ha mfe karịa ka ọ dị oge ha zọrọ nke mbụ.

Dave Umahi

Ndị dịka gọvanọ Enugwu, Ebọnyị, Rivas, Abịa nakwa Kano agaala mbụ, mụta ka ekwe si akụ. Ha ga na-atụ anya inweta mmeri na-atụfughi ụra ọbụla.

Ụfọdụ ndị ọzọ bụ ndị ụlọikpe wepụrụla ndị na-echu ha ụra (dịka ọnọdụ APC na Rivas steeti).

Akụkọ ga-amasị gị: