Election 2019: Ka Inec n'ọwụwa-Anyanwụ si eke nkwụcha maka ntuliaka ọkwa gọvanọ
Ka Inec si akwado ntuliaka ọkwa gọvanọ n'ọwụwa anyanwụ.
N'Anambara steeti

Ụlọọrụ Inec dị n'Ọka, isiobodo Anambara Steeti, amalitela ikesa ngwaọrụ ndị kacha dị mkpa nakwa ndị ọzọ a ga-eji mee ntuliaka nke ndị nnọchiteanya n'ụlọomeiwu nke steeti n'ụbọchị Satọde.
Inec ji ụgbọala ndị FRSC were na-ekesa ngwaọrụ ha ga-eji eme ntuliaka na mpaghara dị iche iche n'Anambara.

A ga-echeta na Anambara Steeti agaghị esonye na ntuliaka maka ọkwa Gọvanọ nke afọ a bụ 2019.
Makana ntuliaka maka ọkwa Gọvanọ n'Anambara Steeti, e ji họpụta Willie Obiano, bụ nke e mere n'ụbọchị 18 nke ọnwa Nọvemba, 2017.
N'Abịa steeti,
Ka onye ntaakụkọ BBC bịara n'ụlọọrụ CBN bụ ebe a na-ekesa ngwaọrụ ndị Inec ga-eji mee ntuliaka, ndị uweojii gbara ebe ahụ gburu gburu.

Mana dịka onye ntaakụkọ anyị ahụ kwuru, e kweghị ndị ntaakụkọ bata n'ime ebe a nọ eke ya.
N'Imo steeti
Ụlọọrụ Inec dị n'Imo steeti amalitela ikesa ngwaọrụ a ga-eji mee ntụliaka na steeti ahụ.

Na mgbede ụbọchị isii n'ime ọnwa Maachị ka ha bidoro na-ahazi ya bụ ngwaọrụ n'usoro okpuruọchịchị dị iche iche tupu ebugawa ya ebe ahụ.
Nke a na-eme n'ụlọọrụ ụlọakụ ukwu nke Naịjirịa bụ CBN dị n'Imo steeti.

Onyeisi ụlọọrụ Inec n'Imo steeti bụ ọkammụta Chukwuemeka Ezeonu, kwuru na ha ahụla na ntuliaka nke ọkwa gọvanọ ga-ata ezigbo akpụ, ya mere ha ji akwado n'oge ka ihe gaa nkeọma ụbọchị ahụ.

Ọ gara n'ihu nyocha ngwaọrụ ndị ahụ mara ma ha ezukwara ezu.
N'Ebọnyị,
Inec Ebọnyị steeti na ndị ọrụ ngo a kpọrọ "Ad hoc staff" na Bekee, na-enwe mkparịtaụka maka nkwado ntuliaka nke gọvanọ na ndị ụlọomeiwu nke steeti, ịkọwara ha ọrụ ha ga-arụ, na ebe e zipuru ha maka ya bụ ọrụ.
Ọkammụta Godswill Obioma bụ onye nọ n'isi mkparitauka a, sị na ọrụ ha dị ụzọ atọ; Wọọdụ, okpuruọchịchị na steeti.

REC rịọkwara ndị ọrụngo a ka ha ghara iwe iwe maka akwụghị ụgwọ ha n'oge.
Ọ gwara ha na ha ga-eji aka ha dee akara ụlọakụ ha maka ịgbalahụ ọgbatauhie akwụghị ụgwọ n'oge.
Ọ malitere ịkpọpụta aha ha n'otu n'otu maka ime nke a nakwa ịgwa ha ebe ha ga-arụ ọrụ.

N'ụbọchi ise nke ọnwa Maachị, ka ụlọọrụ inec kpọrọ ọgbakọ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Ebọnyị steeti.
Ndị pati 38 nakwa ndị otu na-abụghị nke gọọmenti bụ ndị ga-enyocha ka ya bụ ntuliaka nke a ga-eme na mkpụrụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Maachị ga-esi gaa, bụ ndị nke dị iri (10) bịara ya bụ ọgbakọ.

Isiokwu Inec bụ na onweghi onye ọbụla ga-atụ vootu ụbọchị satọde na-ejighi igwe "smartcard reader".
Inec sị na iwu a ga-akpụ okụ n'ọnụ n'ọgbọ a
Mgbe ndị bịara ya bụ mkparitaụka jụrụ ajụjụ si, "ọ bụrụ na "smartcard reader" arụghị ọrụ, gịnị ka a ga-eme?", Inec zara sị na ndị ọrụ ha ga-ewete smartcard reader ọzọ were dochie nke mebiri emebi.

"Ọ bụrụ na nke ahụ ekweghi arụ ọrụ ahapụzịa ya ka ọ dịwa echi".
Inec sị na akụrụngwa e ji arụ ọrụ ga-ahapụ ụlọọrụ ha ụbọchi Wenezde (Maachị 6) gawa ulọọrụ ha dị n'okpuruọchịchị dị icheiche, bụ ebe ha ga-esi gawa na RAC ha ụbọchị Fraịde.
Chris Onugbogu nke ulọọru Inec Ebọnyị steeti sị na "nke a ga-ewezuga ọgbatauhie pụrụ idapụta makana e mee ngwangwa, emeghara ọdachị."












