Kylie Jenner: Ide ji ego dị naanị afọ 21

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahụ maka akụnaụba ndị mmadụ kpatara bụ Forbes, kpọpụtara aha Kylie Jenner dịka onye kacha pee mpe ji aka ya mee onwe ya ọgaranya.
Forbes kwuru sị na Jenner dị afọ 21 ugbua, na-arụpụta ma na-ere ihe e ji etecha ihu, bụ ọgaranya ego ya na-akwafu akwafu, mere onwe ya ọgaranya n'ike nke aka ya.
Mana ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụghị eziokwu, makana Jenner malitere ịkpata ego site n'ihe nkiri a kpọrọ "Keeping Up with the Kardashians", nke ya na ezinaụlọ ya so n'ime ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Nke a mere ka Forbes tinye ọnụ kwuo sị "Ihe anyị kpọrọ "onye ji aka ya baa onwe ya ọgaranya" bụ onye ji aka ya hibe ụlọọrụ maọbụ kpata ego nke ya, karịa onye ketara oke ụlọọrụ ya niile maọbụ ụfọdụ n'ime ya."
Cheta na Jenner hibere ụlọọrụ ya ọ kpọrọ "Kylie Cosmetics" n'afọ 2015.
Nsogbu dị R.Kelly n'isi
Onye otiegwu a ma ama na mba ụwa niile eji R. Kelly mara apụtala ịzara ọnụ ya n'oge, bụ kemgbe e boro ya ebubo mmetọ ọtụtụ nwata nwaanyị.

Ebe foto si, Getty Images
N'ajụjụ ọnụ ụlọntaakụọ CBS gbara ya, R. Kelly kwuru na o dọghị anya na ya ga-ekechi ụmụ nwaanyị ma metọọ ha n'ụzọ ezighi ezi.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Ọ malitekwara ịbe akwa na-ekwu "ana m alụ ọgụ ndụ m".
Nzipu ndị uweojii

Ebe foto si, Twitter/Nigerian police
Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu kwuru na o zipula ndị uweojii narị abụọ na iri itoolu na anọ gụnyere ndị osote ya na ndị kọmishọna, bụ ndị ga-enyere ndị uweojii ọzọ aka na ntuliaka a ga-eme na Satọde.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
O kwuru na dịka ha mere na ntuliaka ọkwa onyeisiala gara aga, na ha ga-etinye uchu n'ọrụ ha ịhụ na ha chekwara ndị mmadụ na-enweghi nsogbu ọbụla na nke ntuliaka ọkwa gọvanọ a.
Nkwado ntuliaka n'Ebọnyị
Ndị ụlọọrụ Inec Ebọnyị steeti ekwuola na ha agaghị anabata ntuliaka ọbụla a na-ejighi igwe "card reader" mee.

Ha kwuru na ọ bụrụ na card reader arụghị ọrụ, na a ga-eweta ọzọ, ma ọ bụrụkwanụ na nke ahụ arụghị, na a ga-ebugharị ya bụ ntuliaka ruo echi ya.
N'akụkọ si mba Kenya,
Ndị na-eme njem puku kwụrụ puku atọkịrịla n'ọdụ ụgbọelu anọ ha nwere, dịka ndị na-arụ ebe ahụ malitere abụbụọrụ.

Ebe foto si, AFP/Getty
Ihe karịrị ụgbọelu iri isii kwesịrị isi n'ọdọ ụgbọelu Jomo Kenyatta fepụ mee njem, emenwughi ya maka ọnọdụ a.
N'egwuregwu,
Champions League ga-akpụ ọkụ n'ọnụ taa ka otu anọ bụ "isi ekwe ọnwụ" ga-ezute onwe ha.
Porto ga-ezute Roma, ebe ndị Man Utd ga-achọ ịnapụta PSG isi ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ọzọ,

Ebe foto si, NAN
Ngalaba na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Naịjirịa emeela Francisca Nwafulugo onyeisi Federal Polytechnic dị n'Oko Anambra steeti
Ọ ga-eme ka Oriaku Nwafulugo bụrụ nwaanyị mbụ ga-abanye n'ọkwa ahụ kemgbe a malitere ya bụ mahadum.
Na ndọrọndọrọ ọchịchị
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo ekwuola na ọ gaghị akwụsị ịkatọ Muhamadu Buhari
O kwuru nke a n'emume ncheta ụbọchị ọmụmụ ya ma kwuo na o nweghi esemokwu dị n'etiti ya na Buhari mana ọ bụ iji kwado ezi ọchịchị ka ọ ga-eji na-eme nke a.
Na mba ofesi
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Ndị ọrụ gbatagbata ekwuola na mmadụ asaa si n'otu ezinaụlọ anwụola n'oke ibibia mmiri mere na mba Alabama.
Ndị ahụ gụnyere ụmụaka anọ nwụrụ mgbe ibibia mmiri metụtara ụlọ ha tupu ndị ọrụ nzọpụta e nweike rute ebe ha nọ.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6
Francis Uzoho, Ikechukwu Ezenwa, Chidozie Awaziem, Kenneth Omeruo na ndị ọzọ bụ ndị a kpọpụtara ga agbara Naịjirịa bọolụ dịka ha na-akwado ịzute mba Egypt nakwa mba Seychelles n'asọmpị enyi na enyi n'izuụka na abịa.
Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji:
Ihe nkiri:











