Ash Wednesday: Kedụ ihe ịnara ntụ pụtara?
Taa bụ ụbọchị ndị na-ekpere Kraịst n'ụwa niile na-echecta dịka ụka ụbọchị ntụ "Ash Wednesday" na Bekee.
Ọ bụ ụbọchị ndị na-eso Kraịst na-edebe dịka ụbọchị dị nsọ, ha ga-aga nara ntu n'isi, ụfọdụ na-asọkwa ịta anụ n'ụbọchị a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Mana gịnị ka ịnara ntụ n'etiti isi pụtara?
Archbishop nke Canterbury bụ Justin Welby kwuru na ịnata ntụ bụ iji gosi ndabere anyị nwere n'amara Chineke.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ụbọchị ntụ bụ ụbọchị mbụ n'oge Beke kpọrọ 'Lent' nke ndị ụka Kraịst ji echeta ahụhụ Jịsọs tara mgbe ọ nọ n'ụwa tupu ọ nwụọ, wee binyekwa.
Na ngwụcha 'Lent' bụ oge 'Easter' mgbe a ga-eme mmemme maka Jịsoso ikwulite n'ọnwụ.
Oge a kpọrọ 'Lent' na-eru ụbọchi iri anọ bụkwa oge ndị mmadụ ji ahapụ ụfọdụ ihe na ndụ ha iji dị ka Chineke.
Kedụ ihe iri anọ ji pụọ iche?
Dịka ụlọ ntaakụko BBC siri kwuo ụbọchị iri anọ bụ nke dị mkpa n'ebe ndị ụka Kristi nọ.
- - N'akụwkọ Jenesis, Chineke mere ka mmiri zoo n'ụbọchị iri anọ
- -Ụmụ Izrel gara n'Ọzara n'afọ iri anọ tupu ha eruo ala ekwere ha na nkwa
- -Moses buru ọnụ ụbọchị iri anọ tupu o nweta iwu nsọ nke Chineke nyere ya.
- -Jisos nọrọ n'ịkpa ụbọchị iri anọ ebe ọ na-ebu ọnụ na akwadokwa ọrụ ya n'ụwa.
Gịnị ka ị na-agbahapụ n'ụbọchi iri anọ tupu 'Easter' e ruo?
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị











