Lee ka Pope ụka Katọliki si chie Bishop ọhụrụ n'Enugwu

Na agbanyeghị mmiri ozuzo malitere n'ụtụtụ tata zobe, puku kwụrụ puku ndị mmadụ zukọtara na St Pauls parish Ozalla iji gbaa aka ebe ka echiri ụkọchukwu Ernest Obodo, Bishop.
Onyeisi nchụ aja ya bụ mmemme ichị nnukwu Ụkọchukwu bụ ọnọchite anya Pope Francis na Naịjirịa eji "papal nuncio" wee mara na olu bekee bụ ụkọchukwu Antonio Guido Filipazzi du ndị Bishop karịrị iri atọ wee bia ya bụ mmemme.
Filipazzi bikwasara Ernest Anaezichukwu Obodo aka n'isi, kpube ya okpu, nye ya mkpara, nyekwa ya ngọzị na ikikere nke pope wee chie ya Bishop nke abụọ a na-akpọ "Auxiliary Bishop."
Bishop ahụ ga na-enyere Bishop Callistus Onaga ịrụ ọrụ ịchekwa igwe atụrụ nọ n'ụka katọliki n'Enugwu.

Bishop Obodo kelere ndị ụka niile nyere ya nkwado, kelee Bishop Onaga, ndị ụkọchukwu ibe ya na ndị echiri echịchị ndị ọzọ gbakọbara na St Paul Ozalla Nkanu west.

Ebe foto si, BBC Sport
Gọvanọ na-achị Enugwu bụ Ifeany Ugwuanyi, Gọvanọ chiburu Anambra bụ Peter Obi na ọtụtụ Igwe mmadụ juputara bịara ya bụ mmemme.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kọwara obi ụtọ ha na ụka na-abawanye na agbanyeghị mmekpa ahụ.
Ha nyekwara Bishop ọhụrụ, Ernest Obodo ndụmọdụ ka oṅomịrị ụkpụrụ Christ mgbe niile.











