Theresa May alaala, Angela Merkel awụchie Naijiria

Angela Merkel

Ebe foto si, Getty Images

Ka ọ gachara abalị ole na ole Theresa May nke Briten bịara Naijiria, onyeisiala mba Jamini bụ Angela Merkel wụchiri Naijiria ụnyaahụ bụ Tọọsde.

A na-atụ anya na ọ ga-ezute ndịisi ụlọọrụ otu ECOWAS n'Abụja, nakwa onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari.

Ha ga-enwe mkparịtaụka n'ihe gbasara nchekwa, azụmahịa, mbịambịa nakwa ntuliaka Naijiria na-abịa.

Ndịisiala abụọ ahụ ga-akpa maka ịgbaga mba ọzọ, nchekwa, ntuliaka 2019 nakwa ihe gbasara ikwalite akụnaụba mba abụọ a.

Njem Merkel n'ọdịda-anyanwụ Afrịka danyere oge e nwere ọtụtụ ngaghariiwe mebiri ihe megide ndị mbịarambịara si Afrịka n'ọwụwa-anyanwụ Jamini.

Akụkọ ga-amasị gị