Ebuka: Ndị mmadụ akpụrụla odogwu n'ejiji n'ọnụ ọzọ
Akụkọ ndị kachasị mkpa na mgbede a

Ebe foto si, @ebuka/Instagram
Ebuka Obi-Uchendu onye na-ekwu okwu n'onyonyo ewuwela ọzọ na soshal midia tta.
Ndị mmadụ na-ekwu ihe na-atọ ọchị maka ejiji ojiri iji du ndị mmadụ na nturugo ihe onyonyo n'Afrịka taa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Lee ihe o kwuru mgbe o wuru na agbamakwụkwọ Prince Harry na Meghan Markle.
Ọzọ,
Gọọmentị etiti ekwuola na mba Naịjirịa na mba Chịna ga-ebinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta ga-ebute dọlla nde narị atọ n'ọma maka mmepe obodo.
Ebe ego a nke ụlọakụ China Exim ga-ewepụta ga-abanye kachasị nrụpụta ngalaba teknụzụ dị ịcheịche n'ala Naịjirịa.
Okwu PVC
Dịka Inec kwuru na ha agaghị adọtị oge ha nyere maka ịnata akwụkwọ PVC ndị mmadụ etiele mkpu enyemaka n'Enugu steeti
Ha kwuru na ndịọrụ ndenye aha ezughi nakwa na enwere sọsọ otu ụlọọrụ n'ụfọdụ okpuruọchịchị na steeti ahụ nke mere na ndị mmadụ na-emefu oge ebe ha na-eche ị denye aha.
Ihe mwute,

Ebe foto si, Reuters
Onye nọ ebe akụkọ mere gwara ụlọọrụ ntaakụkọ afp na ndị oyindụegwu ji gwongoworo nakwa ngwa agha dị icheiche wakpo ọdọ ndị agha nke ndị na obodo Zari Borno steeti.
Ọ kọwara na ha na ndịagha Naịjirịa lụrụ ọgụ ruru otu elekere tupu ha alaghachi azụ
Zari bụ obod dị n'oke Niger na Naịjirịa.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Barack Obama agwaala ndị mmadụ ha ṅomie John McCain ebe ya na George Bush bụ ndị chịbụrụ mba Amerịka kwanyere John McCain ugwu ikpeazụ n'akwamozu ya.
John McCain nwụrụ n'ịzuụka gara aga dịka ọ rịachara ọrịa akpụ nke metụtara ya n'ụbụrụ.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu Liverpool aghọrọla odogwu dịka ha meriri otu Leicester city ọkpụ abụọ asatara otu mgbe ha zụkọrọ taa.
O nweghi onye meriri Liverpool n'etiti Brighton, Crystal Palace nakwa West Ham bụ ndị ha zuterela na mbụ.
N'ụtụtụ
Kemikal na-ebu ọrịa kansa nọrọ n'ime akwa akwụkwọ - SON

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-enyocha ihe a na-emepúta ma ọ dị ezi mma bụ Standards Organisation of Nigeria adọọla ndị na-atụbata akwa ụmụakwụkwọ n'ime Naijiria aka na ntị maka ịtụbatta aa nke nwere otu kemikal na-ebute ọrịa kansa.
Ha kwuru na kemikal a dị n'ime akwa ụmụakwụkwọ ụlọọrụ Sing Shun Fat School-Clothier Company na Zenith Uniform Company na-emepụta na China.
INEC emechiela odide aha n'akwụkwọ ntuliaka n'afọ a

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahazị ntuliaka na Naijiria bụ INEC ekwuola na ha agaghị agbati ohere ha nyere ndị mmadụ iji denye aha n'akwụkwọ ntuliaka a kpọrọ PVC n'aha ichafu karịa ụbọchị ha hiwere maka ya.
Odeakwụkwọ INEC bụ Rotimi Oyekanmi kwuru na nke a bụ iji nye INEC ohere ịkwadobe ihe niile e kwesiri ime tupu mbido ntuliaka nke 2019 nke ọma.
Mana ha ga-alaghachi na inye PVC na ngwụcha yabụ ntuliaka.
Vanessa Marquez anwụọla

Ebe foto si, Getty Images
Na mba ofesi, ndị uweojii na Kalifonia nke mba Amerika agbagbuola otu nwaanyị onye ihe nkiri só n' ihe nkiri Ameríka ama ama bụ 'E-R' aha ya bụ Vanessa Marquez.
Ha gbagburu Marquez nwere ọrịa isi maka na o chere ndí uwe ojii egbe n'ihu oge ha gara be ya.
Serena emeriela Venus

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, Serena Williams emeriela nwanne ya tọrọ ya bụ Venus Williams n'asọmpị US Open. Serena jir agba were banye agba nke anọ n'asọmpị a.
Gere akụkọ dị mkpa n'ụtụtụa n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:
Abịa n'obodo ndị kacha mma ibi n'ụwa, Sydney, Vancouver, Ọsaka nakwa Toronto so na ndị kacha mma, ebe Legọs, Karachi na Dhaka so na ndị kacha njọ.














