N'Ahiara Diocese Bishọp Lucius Ugorji ga-aka ụka mbụ

Ebe foto si, Catholic Bishops Conference
Nwannechi bụ ụbọchị ụka Eke ka Bishọp Lucius Ugorji bụ onye ọhụrụ ewepụtara dịka Bishọp Ahiara Diocese ga-edu ụka mbụ ya na mpaghara Mbaise.
Bishọp Ugorji bụ onye Pope Francis họpụtara ka ọ gaa bido ọrụ ebe ahụ, nọchịrị anya Bishọp Ebere Okpalaeke bụ onye ndị obodo ahụ jụrụ na ọ ga-abụ Bishọp ha n'ihi na ọbụghị onye ebe ahụ.
Bishọp Ugorji na ndị ụkọchukwu na ndị nkịtị ga-ezukọ ma o duchaa ụka ụbọchị ahụ.
Ọrụ Bishọp Ugorji na-ebido ka ọ rụchara afọ iri abụọ na asaa (27) n'Umuahia Diocese.


Ụfọdụ ndị ụka Kraist na-atụ uche na ihe mere n'Ahiara Diocese ga-akụ mkpụrụ ọjọọ n'ụlọụka Katọlik na Naijiria n'ihi e nwere ike ndị Katọlik ndị ọzọ ga-ebido ị na-ajụ ndị Bishọp maọbụ ụkọchụkwụ Ụka kpọnyere ha. Mana otu nnukwu ụkọchụkwụ ọnụ na-eru n'okwu n'ụka Katọlik na na Naịjirịa bụ Mosignor Bernard Okodua kwuru na nke a agaghị eme.
Okodua gwara BBC Igbo sị, "Ọ gaghị eme ebe ọzọ. Nke a bụ ọpụrụiche. Echeghị m ma onwere diocese ọzọ ga-ejije ha, mee ihe ha mere."

Ihe ị kwesịrị ịma maka Bishọp Ugorji
- A mụrụ ya n'obodo Naze dị n'Imo steeti
- A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Jenụwarị, afọ 1952
- E chiri ya ụkọchukwu n'ụbọchị 16 nke ọnwa Epreelụ afọ, 1977
- E nyere ya ọkwa Bishọp nke Umuahia n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Epreelụ, afọ 1990
- E chiri ya echichi Bishọp nke Umuahia n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Julaị, afọ1990
- E nyere ya ọkwa onye nchịkọta Apọstọlik nke Ahiara, Mbaise n'ụbọchị 19 nke ọnwa Febrụwarị, afọ 2018





