Aisha Buhari: Ndị Boko Haram hapụrụnụ anyị ụmụ anyị

Ebe foto si, Aisha Buhari Facebook
Nwunye onyeisiala Naịjịrịa bụ Aisha Buhari etiela mkpu ka ndị Boko Haram na ndị omekome ndị ọzọ na-eyi ọha egwu kwụsị ịtọrọ ụmụaka ụmụnwaanyị.
Nke a bụ iji tinye olu ya n'okwu mba ụwa dịka e mere mmemme ncheta ụmụnwaanyị ụnyaahị.
N'okwu ya, Aisha kwuru na Maachị 8 dị iche na mmemme ndị ọzọ maka ụmụaka Dapchi na Chibok ndị kwesiri ị nọ na be ha.
Ọ malitere okwu nke ọ kpọrọ "Hapụru anyị ụmụ anyị ụmụnwaanyị" nke o kwuru na ọ bụ oku ọ na-akpọ iji kwụsị ntọrị, ebe ọ rịọrọ ndị mgbasaozi ka ha gbasara ya ozi a.
Ọ gwakwara ndị nwunye gọvano ka ha sonyekwa na mgbasaozi ahụ na steeti ha dị icheiche ka ọ na-akpọtu n'akụkụ Naịjirịa niile.
Ọ sịrị: "Hapụrụ anyị ụmụ anyị ụmụnwaanyị. Hapụrụ anyị ụmụ anyị ụmụnwaanyị. Hapụrụ anyị ụmụ anyị ụmụnwaanyị" ka o kwuru.
O depụtakwara ya n'ozi ya n'igwe Facebook.
Na mbido, nwunye osote onyeisiala Naịjiria bụ Dolapo Osibanjo kelere ụmụnwaanyị na mmemme nke ụbọchị ụmụnwaanyị mana o kwuru na ụmụnwaanyị Naịjirịa nọ n'ọnọdụ dị njọ n'oge a.
Ihe ndị ọzọ ụmụ Naịjirịa na-ekwu gbasara ụmụnwaanyị
Ụmụ Naịjirịa na Twitter na-ekwupụta uche ha gbasara mmemme ncheta ụmụnwaanyị :
Ola Ola kwuru na ụmụnwaanyị na-akwado onwe ha na-akwụkwa onwe ha n'azụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Saamira Sanusi kwuru na ya na-ebu n'uche na o nwere nwata nwaanyị na-ele ya anya oge ọbụla ya na-eme ihe ọbụla.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Stella Udobong kwuru mkpa ọ dị ka a zụgharịa ụmụaka ma kuziere ha mkpa ndụ dị ka a ghara iji ụmụnwaanyị mere ndị na-ebu ogbunigwe dịka ndị Boko Haram na-eme.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ụfọdụ chetakwara dọkịta Stella Ameyo Adadevoh bụ onye tufuru ndụ ya iji zọọ ndị ọzọ ndụ oge ọrịa Ebola wakporo Naịjirịa n'afọ 2014 nakwa onye bụbụrụ Mịnịsta ọrụ mgbasa ozi na Naịjirịa nke nwụrụ anwụ bụ Dọra Akunyili.
N'aka nke ọzọ, onye odeakwụkwọ mba ụwa a ma ama bụ CHimamada Ngozi Adichie akpọọla oku ka mmadụ niile tinye uchu na ịkwado ụmụnwaanyị.
Chimamanda kwuru nke a oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka, lee ya n'onyonyo a:
Chimamanda tinyere olu ya n'egwu oti egwu mba ụwa bụ Beyonce.










