Mmeri Arsenal ọ ga-ekwe Arsene Wenger kuru ume ndụ ugbua?

Ebe foto si, Getty Images
Mmeri otu Arsenal meriri AC Milan n'asọmpi Europa League enyela aka ibutu nrụgide onye nchịkọta ha bụ Arsene Wenger na-agabiga maka emeghị ọfụma ha n'egwuregwu ole na ole gara aga.
Arsenal gbara AC Milan ọkpụ abụọ asatara otu (2 - 1) na San Siro bụ be ha ka ha zukọrọ n'egwuregwu nke mbụ ha iji mara otu nke ga-abanye n'agba nke anọ na Europa League afọ 2017/2018.
Henrikh Mkhitaryan nyere goolu nke mbụ na nkeji 15 tupu Aaron Ramsey agbanye nke ọzọ na nkeji 45 na ụma.
Mmeri a na-abịa ka emerichara Arsenal n'usoro egwuregwu bọọlụ anọ ikpeazụ ha gbara n'ime izu ole gara aga, nke bụ mbụ ihe a ga-eme ha kemgbe 2002.
Ndị na-akwado ha bidoro tiwe mkpu sị chụọ Wenger chịkọtagoro ha afọ 22 n'ọrụ.

Ebe foto si, Reuters
Ndị nkwado a kpọrọ Arsenal Supporters' Trusts ruru pasentị 88 n'ime mmadụ 1000, binyere aka n'akwụkwọ iji sị ka a chụpụ ya n'ọrụ na ngwụcha afọ a.
Mmeri Arsenal meriri mere ka ha bụrụ otu mbụ ga-emeri AC Milan na San Siro n'asọmpi Europa League kemgbe ọnwa Febụwarị nke 2002.

Akụkọ ga-amasị gị:






