Ọsọ Nwamba o nyela aka na nchekwa obodo?

Ndị agha na ndị ọchụehi

Ebe foto si, @NigerianArmy

Nkọwa foto, Ndị agha malitere agha Ọsọ Nwamba n'ọnwa Feburuwari afọ 2018

Ọgbaaghara dị n'etiti ndị ọchụehi na ndị ọrụugbo na steeti dị icheiche na Naịjirịa abụrụla ihe ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ.

Ọtụtụ anwụọla site n'ọgbaghara a tụmadụ na Benue, Taraba, Plateau n Enugwu steeti.

Ndị mmadụ na-ekwu na gọọmenti etiti anaghị etinye uche n'ihe gbasara ọgbaghara a nke gbugoro ọtụtụ ndị mmadụ.

Nke a kpatara gọọmenti eiti jiri nye ndị agha Naịjirịa iwu ma ziga ha na steeti ndị dị n'etiti Naịjirịa ka ha bido agha a kpọrọ "Ọsọ Nwamba" iji chụọ ndị na-akpa mkpamkpa ndị ahụ ọsọ ụkwụ eru ala.

Mana agbanyeghi na ndị agha nọ n'obodo ndị ahụ, mkpamkpa ka na-akpa ebe ndị ọchịehi ka na-egbu ndị mmadụ ma ọgbaghara ka na aga n'ihu.

Otu onye BBC gbara ajụjụọnụ bụ Gideon Nyom bi n'ọkpụrụ ọchịchị Guma na Benue steeti kwuru na ndị agha agbanweghị ọnọdụ ihe na-eme na steeti ahụ.

N'okwu ya; "Otu ihe anyị chọpụtara site n'agha a ndị ọchịehi a na-ebuso anyị bụ na o nwere ebe ha si abịa akpa mkpamkpa ahụ, ha mesịa ya, ha ala."

"Ọ bụrụ na ndị agha ebibighi ebe ahụ ha si abịa, anyị agaghị enwe udo."

Mana ihe na-agbagoju ndị mmadụ anya bụ na ndị agha na gọọmenti etiti na-ekwu na ha nọ n'elu nsogbu a mana ọ dịka enweghi agamnihu ọbụla.

Onye kọmishọna ndị uweojii na Benue bụ Fatai Owoseni kwuru na onweghi ihe ha nwere ike ime ebe ọ bụ na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue steeti mana ndị ọchịehi ka na-ebuso ha agha.

N'okwu ya; "Naanị nwanne unyaa ka e gburu mmadụ iri abụọ na anọ n'Omusu dị n'okpuru ọchịchị Ọkpọkwu dị na steeti Benue."

"Otu ezinaụlọ gwụrụ agwụ n'ime mmadụ 24 a e gburu gunyere nwa ha a mụrụ ọhụrụ, gịnị ka mmadụ nwere ike i kwu n'udi ihe a?"

Owoseni kọwara na kemgbe ndị agha gara na steeti ahụ, e nwere ọtụtụ ndị ọchịehi bidoro ị bata na ya.

O kwuru na ọ bụ ezie na gọọmenti Benue kwụ ndị agha Naịjirịa na-azụ, ha agaghị ekwu na ndị agha na-akwado ndị ọchịehi mana naanị ihe ha chọrọ bụ ka ogbugbu a kwụsị.

Gọọmenti Benue Steeti ga-elikọta ndị nwụrụ na mwakpo ndị a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi wakporo Omusu, nke dị n'Edumoga dị na gọọmentị obodo Okpokwu nke Steeti ahụ na mgbede Mọnde.