Champions League: Agbapụrụ Tottenham, Man City agafeela

Paulo Dybala nke Juventus

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Juventus ruru na ngwụcha asọmpi Champions League nke 2016/17 tupu Real Madrid ejiri 4-1 merie ha

Juventus meriri Tottenham iji banye n'agba nke anọ ebe Manchester City gafere maka mmeri ha meriri n'asọmpi ha nke mbụ n'agbanyeghị na Basel meriri ha ụnyaahụ.

Juventus nyere goolu abụọ iji chụpụ Tottenham, nke mere ha ji bụrụ otu egwuregwu mbụ si England na-apụ n'asọmpi Champions League nke afọ 2017/18.

Son Heung-min nyerela ndị Tottenham goolu na nkeji 39 tupu Gonzalo Higuain asata ya na nkeji 64.

Goolu Paulo Dybala nyere na nkeji 67 mere ka Juventus merie ma banye n'agba nke anọ.

Oge Ikpeazụ Tottenham rutere n'agba nke anọ bụ n'afọ 2010/11.

Pep Guardiola na Kevin De Bruynen

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, 2017 bụ afọ mbụ Pep Guardiola bụ onye nchịkọta otu Manchester City na-erughị agba nke abụọ n'asọmpi Champions League n'ime afọ asatọ

Basel gbara Manchester City 2-1 ụnyaahụ mana ọkwụsịghị ha ịbanye n'agba nke anọ. Ha ji nchịkọta 5-2 gafere maka na ha gbara Basel 4-0 n'egwuregwu nke mbụ ha gbara na be ha.

Onye nchịkọta Manchester City bụ Pep Guardiola kwuru na ndị otu ya "chefuru etu esi agbanye bọọlụ n'ọnụ goolu" ka ndị Basel nyere ha ihe bụ mmeri mbụ ha na-enweta n'ụlọ ha kamgbe 2016.

Gabriel Jesus bu ụzọ nyere ndị Manchester City goolu na nkeji asatọ tupu Mohamed Elyounoussi asata ya na nkeji 17.

Michael Lang nyerela Basel goolu ha nke abụọ na nkeji 71.

Nke a bụ ugboro abụọ Manchester City na-eru agba nke anọ nke Iko Yurop maọbụ Champions League.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ