Asọmpi Uefa Champions dịka o sị a da

Ebe foto si, Getty Images
Ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya na-echere ihe ga-eme n'ọgbọ egwuregwu bọọlụ ụfọdụ dị na mba ndị Europe n'abalị a.
N'asọmpị iko Champions League nke taa, FC Porta na Liverpool ga-anwale ike ha na 8:45 nke abalị taa.
Asọmpị nke ọzọ ga-eme taa bu Real Madrid na Paris Saint-Germain ga emekwa na 8:45 nke abalị a.
Gịnị nwere ike ị me?
Onye ọka ekwu n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ bụ Emeka Ofor gwara BBC Igbo n'asọmpị nke taa gaadị ezigbo ọkụ.
"Onweghị onye mara ihe ga-eme n'asọmpị FC Porto na Liverpool taa. Makana Liverpool na-agba dịka ndị ụkwụ ha esịghị ike n'ala. Mana ọtụtụ mmadụ na-akwado ndị Liverpool na asompị nke taa."
"Ndi m na-atụ anya ime nkeọma n'egwuregwu nke taa n'ime otu Liverpool bụ Mohammed Salah, Emri Chan na Roberto Femino," Ofor kwuru.
O kwukwara na, "N'ime otu FC Porto bụ ndị dịka Danilo Pereira na Iker Casillas".
Asọmpi dịka ọka ibe
Mana ọ dị ka na asọmpị nke ndị Real Madrid na Paris Saint Germain bụ nke ga-akachasị kpụrụ ọkụ n'ọnụ.
Maazi Ofor kwuru na asọmpị nke a 'ga-ebụ nnukwu mgbọ!'

Ebe foto si, Getty Images
Ofor kwuru si: "Anyi ga-ahụ Christiano Ronaldo onye otu Real Madrid na Neymar onye otu PSG. Mana ọ dịka anya onye ọ bụla dị n'ebe Neymar nọ,"
Ọ gakwara n'iru kwuo: "Neymar bụ onye kachasị obere n'afọ. Ihe a mere ka ọ dị ezigbo ọkụ na asọmpị ha niile. Ronaldo ka dị ọkụ mana ọgbagola n'afọ . Ihe a nyere onye dika Neymar ohere."










