Nigeria Election 2019: Mahmood Yakubu kwuru na onye na-azọ ọkwa n'okpuru APC na-ebunye ha PVC

Mahmood Yakubu

Ebe foto si, Getty Images

Mahmood Yakubu bụ onyeisioche ụlọọrụ Inec, kwuru na ọ bụ eziokwu na onye bunyere ụlọorụ ha PVC e ji eme ntuliaka 2019, na-azọ ọchịchị n'okpuru APC.

Mahmood zara ajụjụ Osita Chidoka nọchiri anya Uche Secondus bụ onyeisioche PDP, na nzukọ ndị a hụrụ kwaba okpu nwere ụbọchị eyigharịrị ntuliaka, jụrụ ya maka onye Mohammed Musa bụ.

O kwuru sị "Ama m maka ya. Ụlọọrụ ahụ na Inec na-arụkọ ọrụ kemgbe 2011. Kama achọrọ m ka unu mara na anyị kere ezigbo nkwụcha."

Ụlọọrụ Mohammed Musa - na-azọ oche ụlọomeiwu ukwu na Naịja East n'okpuru pati APC - na-ebunye Inec ngwaọrụ ha na-eji ebiputa PVC.

Kedụ ihe butere okwu a?

Atiku Abubakar na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru PDP, kwuburu na ọ bụ eziokwu na Musa nwere ikike ịzọ ọkwa n'agbanyeghi ụdịrị ọrụ ọ na-arụ.

Kama na e nwere otu ọ dị na ọ bụ ya na-ebunye Inec ụdịrị akụrụngwaọrụ ahụ ọkachasị ebe ọ bụ na o ga-eso azọ ọkwa na ntuliaka ahụ.

N'ịzọ isi onwe ya, Mahmood kwuru na aka enwe agaghị aba n'ofe maka ndọrọndọrọ ọchịchị Musa na-azọ.

Akụkọ ga-amasị gị: