Nigeria Election 2019: Pụtanụ n'igwe tụọ vootu na Feb 23 - Fada Oyoyo

Fada Oyoyo
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọtụtụ ndị mmadụ ka na-aga n'ihu ikwu uche ha banyere nyigharị e yigharịrị ntuliaka e kwesịrị ime n'ụbọchị Febrụwarị 16, 2019.

Ụkọchukwu Adolphus Chukwu e ji Fada Oyoyo mara, bụ odeakwụkwọ nke ngalaba na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Katọlik Diocese nke Ọka, Anambara Steeti, gwara BBC na ọ ma na obi adịghị ọtụtụ ndị Naịjirịa mma maka nyigharị ntuliaka.

Kama ọ gara n'ihu rịọ ndị mmadụ ka ha gbaa mbọ pụta n'igwe n'ụbọchị ntuliaka, bịa tụọ vootu makana ọ dị mkpa.

N'akụkọ yiri ya,

Otu ọkaiwu akpọrọ Kayode Ajulo, gwara BBC na gọọmentị etiti kwesịrị ịrịọ ndị Naịjirịa mgbaghara maka oge ha gburu ndị mmadụ na ihe ndị ha mefuru site na nyigharị e yigharịrị ntuliaka.

Ajulọ kwukwara na ọ ga-adị mma ka gọọmentị nye ndị Naịjirịa ihe itiaka n'obi dịka inye mmanụ ụgbọala n'efu n'ime ụbọchị abụọ, iji gosi na ha dị na mwute maka ihe merenu.

N'ofesi,

Trump

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, akpọkuola mba ndị dị na Yurop gụnyere Briten na Frans, ka ha kpọghachịta ihe karịrị narị asatọ bụ ndị agha nnupuisi ISIS ha jidere na mba Siria, ma malite ikpe ha ikpe.

O kwukwara na mgbidi isi ISIS na-achọzị ịda.

N'egwuregwu,

Sergios Ramos ritere akwụkwọ ọbara ọbara mere ya nke iri abụọ na ise ọ na-enweta dịka onye na-agbara Real Madrid bọọlụ, ka otu Girona ji ọkpụ abụọ a satara otu merie ha.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Nke a mere ka Ramos na-ewu n'elu soshal midia.

Ndị na-efe ala nna ha

Ebe foto si, @NYSC_NG

Ngalaba na-achịkọta ndị na-efe ala nna ha bụ NYSC n'aha ịchafụ akọwala na o nweghi onye na-efe ala nna ya nwụrụ na Bawụchi steeti ụnyaahụ dịka adọtịrị ntuliaka.

Afolayan James bụ onyeisi NYSC na steeti ahụ kwuru na kepu kepu a nụrụ na mmadụ iri nwụrụ n'isiụlọọrụ ha bụ okpotokpo asị.

Ndí na-azú ahía

Dịka a na-agụkọ ihe ndị furu maka ndọtị adọtịrị ntuliaka ụnyaahụ onyeisi ndị na-azụ ahịa na Naịjirịa gwara ndị ntaakụkọ na ihe mba Naịjirịa mefuru ga-eru ijeri naira otu narị na iri anọ.

Ken Ukaoha bụ aha nwoke ahụ kwukwara na ndị mmefu a kachasị metụta bụ ndị na-azụ ahịa.

Na mba ofesi,

Ụgbọelu ndị agha mba Amerịka amalitela ị bụgara ndị mba Venezuela akụrụngwa enyemaka n'otu obere obodo dị nso n'oke ha.

Onyeisi ndị nnupuisi na mba ahụ bụ Juan Guaido ahazikwala ihe ruru mmadụ puku narị isii bụ ndị ga-enye aka bubata ngwa enyemaka n'akụkụ Venezuela n'izuụka na abịa.

N'egwuregwu,

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Mba Sawụt Afrịka gbapụrụ otu Flying Eagles nke Naịjirịa n'asọmpị iko mba Afịrka ụnyaahụ

Ha ji ọkpụ goolu ise asatara atọ nara ha ọkwa onye nke atọ dịka ha zutere na Niamey n'ụbọchị satọde.