Police station Fire: Ndị omekome agbaala ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ
Akụkọ dị mkpa:

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Haruna Mohammed, gwara BBC na ụlọọrụ ndị uweojii ahụ dị n'Ajali, gbara ọkụ n'ụzụ ụtụtụ ụbọchị Tọọzde.
O kwukwara na onweghi onye uweojii nwụrụ na ya bụ ọkụ gbara n'okpuruọchịchị Orumba Nọt.
Haruna kọwara na ha chere na ọ bụ ndị omekome kpara ya bụ mkpamkpa mana ha na-eme nyocha gbasara ya.

Ebe foto si, Twitter/Atiku
Ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na Naịjirịa gụnyere Muhammadu Buhari nke APC na Atiku Abubakar nke PDP, ebinyela aka n'akwụkwọ udo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ị na-ajụ ihe ọ pụtara?
Ọ putara na ha nwere nkwekọrịta na ha agaghị eme ihe ọbụla ga-ebute ọgbaghara n'obodo ma oge ntuliaka ma mgbe e mechara.
Nkwado Inec:
Ndị ụlọọrụ Inec nọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ ekewela nkwụcha maka ntuliaka a ga-eme n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Febrụwarị a.

Ka ndị ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ụlọorụ ha n'Abịa nakwa Anambara, ha hụrụ ebe ha na-akwapụta, na-agụkọ ma na-ahazi ngwaọrụ gụnyere igwe kaadị rida, igbe ntuliaka nakwa ihe ndị ọzọ e ji eme ntuliaka.
Lee nkwado ha n'uju ebe a: Nkwado ntuliaka n'Ọwụwa Anyanwụ ebirila ọkụ
N'ofesi,
Aka akparala otu nwaamadị maburu ego ndị ụlọakụ gbalaga na mba Frans.
Nwaamadị ahụ aha ya bụ Adrien Derbez, zuru nde dọla atọ ka ya na ndị otu ya na-arụ ọrụ dịka ndị na-ekesa ego, gara ikesa nke ụbọchị ahụ n'otu ụlọọrụ Western Union dị n'Aubervilliers.
N'egwuregwu,
Tottenham enyeghi ndị otu Borussia Dortmund ohere iji ha eme akaja ka ha zutere na Champions League n'abalị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ha ji goolu atọ si n'ụkwụ Son Heung-Min, Jan Vertonghen, na Fernando Llorente gosi Dortmund na a naghị akparị mmadụ na be ya.
Gere akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a:
Lee ihe nkiri gbasara Peter Obi ebe a:











