Nigeria Elections 2019: E jizi egwu agụta Biafra?

Ihe na-eme na mpaghara Naijiria niile dịka Inec bugharịrị ntuliaka kara ime taa bụ Satọde Febụwarị 16, afọ 2019.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa and Chimamaka Ihenacho

  1. Ka ọ dị oge ọzọ!, Chere aka ghọrọ anyị oge ọzọ.

  2. 'Nwa #Electionpostponement'

    Baby Ahmed

    Ebe foto si, Rufai Ahmed Madaki

    Nkọwa foto, A mụrụ nwa #Electionpostponement' a ka o jiri ọkara gafee elekere iri na abụọ nke ụzọ ụrtụtụ Satọde na Kano

    Otu nwaanyị aha ya bụ Monica Nworie mụrụ agadaga nwoke n'Ọka Anambara steeti.

    Oriaka Nworie, onye nọ n'oke ihe mgbu ka ọ muchara nwa ya, gwara BBC na ime ya bidoro n'ime ndeeri, ka ọ na-ejikere maka ịtụ vootu taa.

    O mechara mụọ nwa nwoke mgbe ọ kụrụ elekere anọ nke ụtụtụ taa, site na mgbawa afọ nke Bekee kpọrọ 'Cesarean Section'.

    Otu nwaanyị mụrụ agadaga nwa nwoke n'ụlọọgwụ
    Nkọwa foto, Otu nwaanyị mụrụ agadaga nwa nwoke n'ụlọọgwụ
    Ụlọogwụ Ojukwu
    Nkọwa foto, Otu nwaanyị mụrụ agadaga nwa nwoke n'ụlọọgwụ 'Chukwuemeka Odimegwu Ojukwu Teaching Hospital'

    Monika Nworie gosipụtakwara njikere ọ dị ime ntuliaka n'izu ụka ọzọ na-abịa.

    Mana Ahmed dịka ya bụ nwa mbụ a mụụ na Naijiria dịka a mụrụ ya ka o ji ọkara gafee Elekere iri na abụọ nke nderi.

    BBC gakwara ụlọọgwụ ọzọ nke Gọọmenti Steeti Anambara dị n'Ọka, a na-akpọ 'Chukwuemeka Odimegwu Ojukwu Teaching Hospital' ebe otu nwaanyị mụkwara agadaga nwoke.

  3. Ihe mbere okporoụzọ mere n'Anambara

    Ihe mberede nke okporoụzọ mere na Nkwelle-Ezunaka, Anambara steeti ka ụgbọala 'Honda Pilot Jeep' suru okporo latrik na Nkwelle-Ezunaka Junction.'

    O nweghị onye nwụrụ mana ihe gbuwara ọkwọụgbọala ahụ isi

    Ọkwọụgbọala 'Honda Pilot Jeep'
    Nkọwa foto, Ọkwọụgbọala 'Honda Pilot Jeep' ahụ nwere ihe mberede na Nkwelle-Ezunaka Junction kụpuru isi
    Ụgbọala 'Honda Pilot Jeep' nwere ihe mberede na Nkwelle-Ezunaka Junction
    Nkọwa foto, Ụgbọala 'Honda Pilot Jeep' kụrụ okporo ọkụ latrik na Nkwelle-Ezunaka Junction
    Ụgbọala 'Honda Pilot Jeep' suru okporo latrik na Nkwelle-Ezunaka Junction
    Nkọwa foto, Ụgbọala 'Honda Pilot Jeep' suru okporo latrik na Nkwelle-Ezunaka Junction
  4. Ndị Abịa na-arụrịta ụka ihe butere nkagbu ntuliaka

    Ahịa azụghị n Ahia ohuru Ngwa Road dị n' Aba
    Nkọwa foto, Ahịa azụghị n Ahia ohuru Ngwa Road dị n' Aba dịka ọtụtụ ndị mmadụ abaghị ahịa

    Ma mmadụ,ma ụgbọala anọghị n'okporoụzọ awara awara si Umuahia gawa Aba na mbido ụbọchị taa.

    Ahịa azụghị n Ahia ohuru Ngwa Road dị n' Aba dịka ọtụtụ ndị mmadụ abaghị ahịa.

    N'Ụmụahịa, ndị mmadụ gbakọrọ n'ọdụ akwụkwọ akụkọ na-adọrịta ụka banyere ihe mere Inec jiri kagbu ntuliaka e kwesịrị eme taa.

    Ndị mmadụ gbakọrọ n'ọdụ akwụkwọ akụkọ na-adọrịta ụka
    Nkọwa foto, Ndị mmadụ gbakọrọ n'ọdụ akwụkwọ akụkọ na-adọrịta ụka banyere ihe mere Inec jiri kagbu ntuliaka e kwesịrị eme taa.
    Ọdọụgbọala 'Aba Main Park'
  5. Peter Obi: Ihe wutekarịrị m bụ ego ndị mmadụ mefuru

    Osote onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha PDP bụ Peter Obi gwara BBC Igbo n'Agulu, Anambara steeti bụ obodo ya na ya atụghị anya na ihe ahụ ga-eme.

    Ọ ganran'ihu sị na ihe kara wute bụ ego ndị mmadụ mefuru maka ntuliaka a.

    Aha onyonyo, Peter Obi : Ihe ka wute bụ ego ndị mmadụ mefuru maka ntuliaka a
  6. Adams Oshiomhole: Inec kwesịrị ịrịọ ụmụ Naijiria mgbaghara:

    Inec na ndị ntuliaka a metụtara n'eme ọgbakọ ugbua n'Abuja.

    Ọtụtụ ndị pati dị iche iche bịara nzukọ ahụ gọsiri iwe dịka ụfọdụ rịọrọ Inec ka ha nye ohere ka ndị mmadụ anatabeghị PVC nata ya.

    Onyeisioche pati APC bụ Adams Oshiomhole gwara onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu na ụlọọrụ ya mejọrọ ụmụ Naijiria ebe ọ dị ukwu,na ọ kwesịrị ka ha rịọ ha mgbaghara.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Ụlọntaakụkọ Channels TV wụchiri ebe a na-eme nzukọ ndị Inec.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  7. Ndị ọnụ na-eru n'okwu tinyere ọnụ

    Ndị ọnụ na-eru n'okwu bụ Ugo Egbujor na Jimmy Abia, batara n'ụlọọrụ anyị itinye ọnụ n'okwu nhigharị a.

  8. Nzukọ Inec ebirila ọkụ

    Ndị ụlọorụ Inec na ndị isi a hụrụ kwaba okpu amalitela nzukọ gbasara ntuliaka 2019.

    Ọkammụta Yakubu Mahmood bụ onyeisi Inec hinyere nzukọ a.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Inec na ndị si mba ofesi bịara isonye na ntuliaka a kpọrọ "International Observers" na bekee, zukọburu n'ime awa ole gara aga.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  9. Nke mere n' Owere, Ọlụ, Ogboko dị n'Imo steeti

    Ọdọahịa dị n'Owere
    Nkọwa foto, Ahia mepere n'Owere ngwangwa o were anya na a gaghị eme ntuliaka taa

    Obi adịghị ọtụtụ mmadụ mma maka atụmatụ onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu wetara na a ga-adọtị oge ntụliaka ahụ aka.

    N'Owere, ahia mepere ngwangwa o were ndị mmadụ anya na ọbụghịzị ihe e kwuru ka a na-eme. Okporoụzọ tọgbọrọ chakoo n'Owere, mmadụ nọkwa n'ụzọ mana ọ bụghị etu ọ si adị.

    Onye ọkwọ ụgbọala ya na BBC so kwuru na ọ bụ makana ọtụtụ mmadụ lara ime obodo dịgasị iche iche maka ntụliaka.

    Ahia mepere n'Owere ngwangwa o were anya na-agahị eme ntuliaka taa
    Nkọwa foto, Ahia mepere n'Owere ngwangwa o were anya na-agahị eme ntuliaka taa

    Ụfọdụ na-ajụ ihe mere o jiri bụrụ n'ime abalị ụbọchị ntụliaka ka Inec ga-eme nke a.

    Otu nwoke kwesịrị iso rụọ ọrụ ngo Inec Bekee kpọrọ 'adhoc staff' a kpọghị aha ya kwuru na ya danyere ndị omekome n'ime abalị ka ọ na-achọ ebe ọ ga-atụkwasị isi ya.

    Ọ nwụrụ iyi na ya agaghịkwa esoro rụọ ọrụ ntụliaka ọzọ ahụ ọzọ.

    Onye nwaanyị gbara BBC sị, "agaghị m emezi, ha meewe ntụliaka ha."

    Ụzọ gara n'obodo Rochas Okorocha
    Nkọwa foto, Ụzọ gara n'obodo Rochas Okorocha

    Okongwu a sị na ọ ga arịa ahụ ka ndị mmadụ meekwa etu n'izu ụka na-abịa, bụ mgbe e tinyere ntụliaka ọzọ.

    N'Olụ, BBC Ìgbò zutere ndị na-akwado Nnamdi Kanu bụ ndị sị na ha na-enwe ezigbote aṅụrị maka etu ntuliaka a kwesịrị ime taa sịrị gaa.

    BBC chọpụtara na ọtụtụ n'ime ha enweghị akwụkwọ eji eme ntụliaka.

    Otu n'ime ha sịrị na ọ bụ iwu Nnamdi Kanu nyere ha mere ha ejighị gbata odogwu ntụliaka ahụ bụ PVC.

    Rochas Okoroocha
    Nkọwa foto, Rochas Okoroocha nọ n'Obodo ya bụ Ogboko maka ntuliaka

    N'Ogboko, bụ obodo aka na-achị Imo steeti Rochas Okorocha, ọ gwara BBC na uche ha maka ndọtị aka ntụliaka a bụ na ọka mma na-emere ya na mma karịa na ihe agaghị etu o kwesịrị ma meekwa ya mgbe etinyere. Arịrịọ ya bụ ka Inec gbado anya hụ na aghụghọ abataghi n'ihe a na-eme.

    Ụgbọala ndị kpojuru n'ụlọ Rochas Okorocha taa
    Nkọwa foto, Ụgbọala ndị kpojuru n'ụlọ Rochas Okorocha taa
  10. Atiku: Ihe Inec mere ekwesịghị

    Onye na-azọ ọkwa onyeisala n'aha PDP kwuru na nhigharị ahụ Inec higharịrị ntuliaka naanị awa oole na ole tupu tuliaka jọgburu udele, sigbuo nkapị n'isi.

    Mana ọ rịọrọ ụmụ Naijiria ka ha nwere obi ndidi soro ya ihe mere ma pụta n'igwe n'izu na-abịa abịa tụọ vootu.

    Gee ihe o kwuru n'uju:

    Aha onyonyo, Atiku: Ọ bughị ihe kwesiri ihigharị ntuliaka ka ọ fọrọ naanị awa ole na ole
  11. Echeghi m na aka pati dị n'ime nhigharị a - Rochas

    Aka na-achị Imo steeti ma bụrụkwa onye na-azọ oche n'Ụlọomeiwu Ukwu Naịjirịa bụ Rochas Okorocha, kwuru na Inec kacha mara ebumnobi ha ji higharịa ntuliaka a.

    Okorocha kwuru na o cheghi na aka ndị pati dị n'ime ya bụ nhigharị.

    Aha onyonyo, Nigeria Elections 2019: Echeghi m na aka pati dị n'ime nhigharị a - Rochas
  12. E jizi egwu agụta Biafra?

    Ndị na-akwado Biafra n'Ọlụ dị n'Imo steeti na-egosi etu obi dị ha na eyigharịrị ụbọchị ntuliaka.

    "Biafra nwantịntị oge, Biafra!!"

    Aha onyonyo, Nigeria Elections 2019: Ndị na-akwado Biafra na-enwe aṅụrị
  13. Ndị 'Corper' ji anya ha hụ ntị ha

    Ndị ji otu afọ efe ala nna ha bụ ndị NYSC soro na ndị ọrụ ngo na-enyere ndị Inec aka fujuru anya dịka ọtụtụ n'ime ha rahụrụ n'iro ebe anwụ na ahụhụ ndị ọzọ gwọrọ ha iba.

    Ụfọdụ kọwapụtara ihe ha jiri anya ha hụ.

    Ọtụtụ ndị mmadụ bidoro na-ata ngalbaba na-ahụ maka ofufe ala nna otu afọ bụ NYSC ụta maka iji ụmụ mmadụ agba okoso.

    Nwaada kpọrọ onwe ya sweet girl kwuru na ndị 'cọrper abụghị ndị ohu.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Tessyama kwuru na otu onye ji otu afọ efe alal nna ya zitere ya foto ebe Inec gbahapụrụ ha ha hie n'ubi dịka e kenyechara ha ngwaọrụ ntuliaka

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Onye kpọrọ onwe ya 'Abuja Minister' kwuru na o nweghị ihe, ma Inec, ma NYSC jiri ndị ji otu afọ efe ala nna ha kpọrọ.

  14. Kanada abụzị 'ala eze' ndị nwere okwukwe?, Ndị Naịjirịa na-ekwu okwu ịgafe Kanada aghara aghara.

    Soshal midia nwurula ọkụ maka nhigharị a.

    Nke so tụ n'anya bụ etu ndị mmadụ si na-ekwu na ihe ka dịrị etu a na-aga n'ihu, na ha ga-eburu akpa ha gbaga Kanada.

    Ma ndị maliterela ịmụ etu e si agụ abụ ala ha:

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Ma ndị ọzọ na-akọwa etu ọ ga-esi akara ha mma ibi ebe ahụ.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  15. Buhari sịrị na Inec wụrụ ya n'ala

    Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, @Mbuhari

    Nkọwa foto, Muhammadu Buhari gbajọrọ ihe Inec mere

    Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru n ihe mere kwadara mụọ ya.

    N'ozi o wepụtara n'igwe okwu Twitter ya, Buhari sị, "Ọ ọ bụ ihe ezi mwute na n'agbanyeghị ogologo oge e nyere Inec nakwa nkwado e mere n'ụlọ nakwa n'ofesi maka ntuliaka a, Inec higharịrị ntuliaka onyeisial nakwa nke ụlọomeiwu oge ọfọrọ naanị awa ole na ole.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  16. Obi adịghị ndị Ebonyi mma

    Abakaliki n'ụtụtụ taa
    Nkọwa foto, Abakaliki n'ụtụtụ taa

    N'ụtụtụ, ụtụtụ, ebe niile tọgbọrọ chakoo, mana ndị mmadụ mechara pụtawa ka o doro ha anya na a gaghịkwa eme ntuliaka.

    Dịka onye ntaakụkọ anyị siri hụta ya, ọ dika Inec Ebonyi steeti adichaghi njikere maka ntuliaka a kara eme taa.

    Ndị ọrụ ngo Inec n' Ebọnyị gwara ndị ntaakụkọ BBC na obi adịghị ha mma etu Inec siri kagbu ntuliaka Febuwarị 16.

    Otutu n'ime mmadụ kariri otu puku rahụrụ ezi Inec n' agbanyeghi anwunta na-eche ka ebunye ha ngwaọrụ ha ga-eji gaa mee ntuliaka tupu akagbuo ya.

    Gee ihe ha kwuru n'uju:

    Aha onyonyo, Ndị Ebọnyị: Obi adịghị anyị mma

    Ka ọ dị ugbua, ndi mmadu amalitela iputa ahia nwantakiri nwantakiri ma na-ekwusi ike na ha di njikere itu vootu n'izuuka na-abia.

    Mana ụfọdụ ndi otu ipob n'ime ha kwusiri ike na ha agaghi atu vootu n'ihi oke mmegbu na mkpagbu juputara obodo Naijiria.

    Gee ihe ọha mmadụ na-ekwu n'Abakaliki:

    Aha onyonyo, Iwe ji ndị Ebonyi
  17. N'Plateau, Abubakar sị na ya ga-alọghachi

    I chetara Abubakar Shettima, nwoke ahụ anyị wetara ụnụ akụkọ abalị abụọ gara aga na o gwunyere n' ọnọdụ ebe a ga-atụ vootu na Plateau n'abalị?

    Shetima e jikerela ụla .

    Mana nwoke ahụ dị afọ iri isii na otu gwara onye ntaakụkọ anyị na Plateau steeti sị ma e tere ogiri ma e tere ụgba, na ya ga-alọghachi n'izu na-abịa itụ vootu ya.

    Abubakar Shettima
    Nkọwa foto, Abubakar sị na ya ga-alọghachi
  18. A gbagbuola onye nnyemaka Gọv Okowa

    Ndị uweojii Delta steeti ekwuola na ndị amabeghị ndị ha bụ agbagbuola onye enyemaka Gọvanọ Delta steeti governor, Ifeanyi Okowa, n'ihe gbasara ndị ntorobịa bụ Lawrence Ngozi Akpomiemie.

    E gburu nwa amadi ahụ n'ụzọ ụtụtụ taa bụ Satode n' Ekpan dị n'okpuru ọchịchị Uvwie na Delta steeti.

    Onyeisis ndị uweojii na steeti ahụ bụ Adeyinka Adeleke gwara BBC n' ekwenti na ha amaghị ma ihe mere e jiri gbagbu nwa amadị ahụ emetụtara ndọrọndọrọ ọchịchị mana ha na-enyocha ya bụ ihe.

    Ifeanyị Okowa

    Ebe foto si, @GovIfeanyiokowa

    Nkọwa foto, A gbagbuola onye enyemaka Gọvanọ Delta steeti governor, Ifeanyi Okowa,n'ihe gbasara ndị ntorobịa bụ Lawrence Ngozi Akpomiemie.
  19. Omume Inec gbagwojuru ha anya- Ndị ọrụ Inec n'Enugwu

    N'ụtụtụ, ụtụtụ, ahịa 'Ogbete Main Market' Enugwu ka dịka ebe a gbara ọsọ agha.

    Ahịa Ogbete tọbọ chakọọ n'ụtụtụ taa
    Nkọwa foto, Ahịa Ogbete tọbọ chakọọ n'ụtụtụ taa
    Ahịa Ogbete
    Nkọwa foto, Ahia Ogbete dị ka ebe a gbara ọsọ agha

    Ndị 'collation officers' n'Enugwu siri na omume INEC gbagwojuru ha anya.

    Ọtụtụ ndị 'collation officers' nke INEC were ọrụ n' Enugwu ekwuola na ha amaghị ebe ha kwụ akwụ n'ihi na ha onyeisi INEC Enugwu enweghị ihe ọgwara ha.

    Ha gwara BBC na ha pụtara ka mgbe elekere ise nke ụtụtụ ijibia mara ebe ha ga arụ ọrụ. Ka mgbe ha chọpụtara na ya bụ ntụlịaka agaghịzị eme, ha kwuru ma obi adịghị ha mma.

    Ndị na-ele aha ha n'akwụkwọ
    Nkọwa foto, Ndị na-ele aha ha n'akwụkwọ

    Ọtụtụ ndị mmadụ n'Enugwu ekwuola na nkagbu vootu gọmenti mere tata jọgburu udele ma sigbuo nkakwụ. Onye ji otu afọ efe ala nna ya bụ nwada Florence Nweke kwara arịrị na ọ bụ n'iro ka ya rahụrụ na Nsukka iji hụ na ya rụrụ ọrụ ya dịka"presiding Officer" na Nsukka.

    Nweke kọwara na ọ bụ n' ụtụtụ a ka ya nụrụ na akagbuola ya.

    O kwuru na o dịghị onye nyere ya ego nri maọbụ ego ya ga-eji baa ụgbọala laghachi n' ụlọ ya.

    Nwada Florence Nweke
    Nkọwa foto, Nwada Florence Nweke sị na ya hiri ụra n'iro maka ọrụ INEC tata
  20. Ipob: A kagburu ntuliaka maka na anyị kagburu 'Nọrọ n'ụlọ'

    Otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra bụ Ipob kwuru na ọ bụ maka na ha kagburu oku 'Nọrọ n'ụlọ ha kpọrọ.

    Cheta n'Ipob kpọrọ ekwo nkụ sị ndị otu ha na Ndigbo agaghị atụ vootu n' agbanyeghị oku ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu gbọrọ ka Ndigbo pụta tụọ vootu.

    Mana ka ọ fọrọ naanị otu ụbọchị tupu ntuliaka, ha mara ọkwa ka ndị mmadụ sonye na ntuliaka.

    Nnamdi Kanu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu gwaburu ndị na-eso ya atụla vootu