Nigeria Election 2019: Ihe anọ onyeisi Inec kwuru maka nhigharị ntuliaka

Prof Mahmood Yakubu
Nkọwa foto, E mere ọkammụta Mahmood Yakubu onyeisi Inec n'ọnwa ọktoba afọ 2015

Yakubu Mahmood bụ onyeisi ụlọọrụ Inec, kwuru na ọ bụ ihe ọdachi ndị mere n'ụlọọrụ ha dị iche iche butere nhigharị ntuliaka.

Na nzukọ ya na ndị isi a hụrụ kwaba okpu nwere, o kwuru na ọ bụghị enweghi nchekwa zuru oke butere ya bụ nhigharị.

O kwukwara na ndị otu pati amaghịkwa maka ya, kama na ọ bụ ọkụ ndị gbara ụlọọrụ ha, enwetezughi ụgbọala ga-eburu ngwaọrụ ha ebe dị iche iche na ihe ndị ọzọ, kpatara ya.

Mahmood rịọrọ mgbaghara maka ihigharị ụbọchị ntuliaka site na Febrụwarị 16 ruo Febrụwarị 23.

Ihe ndị ọzọ o kwuru

  • Ndị pati ndọrọndọrọ ọchịchị agaghị eme achụmnta vootu ọzọ ruo mgbe a tụchara ntuliaka nke ụbọchị 23.
  • N'ime PVC nde 14.28 e wepụtara ka ndị mmadụ nwee ike iji mee ntuliaka, naanị ihe ruru nde 10.87 ka ha were.
  • O kwukwara na onye na-enwetabughi PVC ya agaghị ewetazị ya ọzọ ruo mgbe e mechara ntuliaka.
  • Ụlọorụ Inec biputara akwụkwọ mbinyeaka maka ntuliaka nde 421.7 maka ntuliaka isii e hibere, nakwa akwụkwọ e ji edepụta ihe a tụtara (result form) nde 13.6 maka naanị ntuliaka ọkwa onyeisiala.
Aha onyonyo, Inec Anambra: Ndị Anambara atụla uche maka na Inec kwụ gidigbam