Nigeria Election 2019: PDP na APC na-ebo onwe ha ebubo maka ntuliaka adọtịrị

Ngalaba na-achịkọta ihe gbasara ntuliaka na Najirịa bụ Inec adọtịala ụbọchị ekwesiri ịme ntuliaka ọkwa onyeisiala, nke ndị ụlọomeiwu nakwa nke ndị ọkwa gọvanọ.
Ha kwuru na nke a mere n'ihi na ha akwadoteghi ọ kachasị n'ikesa akaụrụngwaọrụ nakwa ịhazi ihe niile dị na ntuliaka kwesiri ịme taa.
PDP na APC na-ebo onwe ha ebubo maka ndọtị aka ngalaba na-ahụ maka ntụliaka bụ Inec mere ntụliaka ọkwa Onyeisiala nakwa nke ndị omeiwu nke etiti na steeti dị iche ịchị.
APC sị na ọ bụ nkata Inec na PDP kpara, ebe PDP gbụkwa otu asọ ahụ n'ọnụ.
Festus Keyamo nke otu APC sị na ọ bụ makana PDP nọ n'ụzọ ịda na ntuliaka mere ha jiri mee ka Inec dọtịa emume a aka.
Uche Secondus bụ onyeisi otu pati PDP kwuru dịka ọ bụ ya na Keyamo dekọtara akwụkwọ mgbasa ozi ebe ọ sịkwa na ọ bụ APC na Inec kụkọrọ mkpụrụ a furu ugbua.
Onye na-azọ ọchịchị n'okpuru pati PDP bụ Atiku Abubakar tinyekwara ọnụ n'atụmatụ ndọtị aka a emere ntụliaka a.
Atiku sị ndị na-akwado ya ka ha enwela iwe maka ihe mere. Ọ sikwa ha pụta n'uju bịa tụnye aka n'ụbọchị 23 nke Febrụwarị na ụbọchị 9 nke Maachị.
Cheta na ọtụtụ mmadụ anọziela maka ntụliaka.
Ụmụ Naịjirịa dị icheiche ebeela akwa arịrị gbasara ya bụ ndọtịaka
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Tosin Olugbenga na-akpọ NYSC oku ka ha tinye ọnụ n'okwu a
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Bashir Ahmad kwuru na ihe INEC mere adịghịrị ụmụ Naijirịa mma
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3













