Ndewonụ!
Ka chi bọọnụ Igbo bụ Igbo!
Sonyere anyị echi ka ị mata nke na-eme nakwa ebe ọ na-eme na ntuliaka a.

Akụkọ ihe na-eme na Naijiria gbaa gburugburu ka ọ fọrọ naanị otu ụbọchị tupu eme ntuliaka 2019.
Uche Akolisa, Chimezie UcheAgbo and Chimamaka Ihenacho
Ka chi bọọnụ Igbo bụ Igbo!
Sonyere anyị echi ka ị mata nke na-eme nakwa ebe ọ na-eme na ntuliaka a.

Ndị Inec chọrọ ka ọha na eze kpesara ha maka nsogbu ọbụla ha hụrụ ebe ọbụla ha nọ na steeti ahụ.
Inec kewapụtara ngalaba ga-etinye anya na nsogbu ọbụla nwere ike ịdapụta na ntuliaka a.
Kpọtụrụ ha ebe a:
Naanị Whatsapp - 08068653743, 08126066428. (Akpọla ha na nke a)
07033718937 (nke ndị nwere ọrụsị ga na-eji enweta ha)
Naanị maka ịkpọ ha - 07034489491, 081431494998, 09073133806, 08116432737 (Ezitela ozi ọbụla ebe a)
07030986818 (nke ndị nwere ọrụsị ga-eji enweta ha)

A ka na-eche akọrọngwa bu ndi di oke mkpa aga eji mee ya bu ntuliaka echi nke aga ebute n'uloaku ukwu nke goomenti etiti bụ 'Central bank of Nigeria.'
Onye isi Inec nke Ebonyi steeti bụ Godswill Obioma na ndi ozo oru a metutara noo ebe ahu kemgbe ututu I ma ka a ga-ebute ya bu akọrọngwa Bekee kporo, 'sensitive materials.'
Ogbatauhie a mere na ndi ntaakuko na ndị nlebeanya ndi ozo enweghi ike inweta akwukwo ikike nke ga-enye ha ohere iru oru ha echi .
Mana ha mechara nweta ha n'abali a.


Anyi wuchiri na okpuruochichi Abakiliki bu ebe ngwa oru aga eji mee ntuliaka na okpuru ochichi goomenti a. Otutu umu ntorobia wusara ka igure bu ndi na-acho imata ka aha ha eso n'oru. Ufodu Ndi a wusara ebe a na-ache the ha amaghi aka. Ugbua bu elekere itoolu na-aku.

Onyeisiala Naijiria ochie bụ Goodluck Jonathan zipụrụ ozi were kpọọ oku ka onye ọbụla gaa- mee ntuliaka ụbọchị Satọde.
n' okwu ya, ọ sịrị: "ọ bụrụ na ị hụrụ Naijiria n'anya, pụta tụọ vootu. Dịka otu okenye siri kwuo, ' Ihe ga-eme ka ihe ọjọọ nwee mmeri bụ ndị ezigbo mmadụ gbara nkịtị hapụ ime ihe ọbụla.'"
Ọ kwuru na ọ bụrụ na ndịị mmadụ pụta n'igwe tụọ vootu, ọ ga-emerị ike ndị na-aghọ aghọghọ na ntuliaka.

Ebe foto si, Getty

Ndị mmadụ gwụrụ n'ụlọ dịka ha gbajuru n'ahịa dịchie iche na mpaghara dị iche iche n'ala Igbo ịzụkọ ihe ha ga-eme n'ọnụ dịka ntuliaka na-eme echị bụ Satode.
Ahịa agaghị adị echi ke ụgbọala ji ga agba.


Ndị ntorobia nwụchiri mmadụ anọ e chere na ha bụ ndị na-azụ ahịa egbe n'ọdọgbọala dị na Gusau, ebe ha bụ agba aji abụọ egbe 'AK47 nọ n'ime ya.
E gburu otu, abụọ bụ ihe a nwụchiri ebe otu gbalagara dịka e sunyere ụgbọala ha oku.

Onye ọrụ INEC jị ọkwa ikuziri ndị mmadụ ka esi atụ nta vootu n'Enugwu bụ Agbodu Ufonu Edon ekwuola na onye ọbụla nwere ike iji mkpịsịaka ọbụla were binye aka n'akwụkwọ.
Ọ gara n'ihu kọwaa na ihe kacha mkpa bụ ka onye ọbụla binye aka n'akwụkwọ ebe o kwesiri ka ha were gbalahụ agụnyeghị akwụkwọ ha.


Akọrọngwa kachasị oke mkpa na-apụ ụlọọrụ Inec dị n'Owere gawa okpuruọchịchị dị iche iche dị na steeti ahụ n' abalị a, dịka ozi onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ ebe ahụ siiri kwuo.

Ndị ọrụ Inec,ọrụ ha bụ nleta (supervisors) jikwa ohere na-achọpụta ebe ezipụrụ ha ọrụ nleta.

Dịka ntuliaka 2019 maka ọkwa onyeisiala fọrọ awa ole na ole, kedụ ihe i ji echeta OBJ, Yar'adua, GEJ na Buhari?
Site n'afọ 1999 ruo ugbua, Naịjirịa enweela ndị isiala ndị nkịtị anọ n'oche onyeisiala. Lee ihe e ji echeta ha n'ihe onyonyo a:
Otu kpọrọ onwe ha "Inter-Party Advisory Council"IPAC), kwuru na agaghị eme ntuliaka n'Anambara steeti ma ọ bụrụ na Inec aenyeghị ndị ọrụ otu pati họpụtara ịnọchị ha akwụkwọ njirimara .

Ndị isioche pati dị iche iche na steeti ahụ gbakọrọ na ụlọọrụ Inec n'Ọka iji gosi iwe ha na Inec enyeghị ha akwụkwọ njirimara.

Mbọ niile BBC gbara inuta ọnụmmiri okwu ọnyeisi ụlọọrụ INEC, nke Steeti Anambara, maka ebubo ndị isi ndọrọndoro ọchịchị dị ịche iche na-ebo banyere njirimara ndị nnochiteanya otu ndọrọndọrọ ọchịchị kpụrụ afọ n'ala.
Mkparitaụka ya bụ onyeisi ụlọọrụ INEC na ndị ntakuko kwesịrị inwe bụ ihe a kagburu.
BBC chọrọ okwu n'onu onyeisi n'ulo ọrụ INEC Steeti Anambara, nke na ahụ maka ịnyocha otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'HOD ELECTION PARTY MONITORING' bụ Ibe U. Ibe maka ya bu ebubo ndị isi ndọrọndoro ọchịchị na-ebo.
Ọ kwuru na ọ bụ eziokwu na Inec nwere obere ihe ndoghachiazu, mana ha na-agba mbọ ka ihe niile dịka ọ kwesịrị tupu oge ntụliaka amalite.

Aka enwe bara n'ofe n'Ebonyi ka ndị omekome abụọ nwara ike ha igbu ndị mmadụ.
Aka na-achị Ebonyi bụ Dave Umahi, kwuru na a nwụchiri mmadụ abụọ ebe ha na-etinye ogbunigwe n'akwammiri Idembia dị n'okpuruọchịchị Ezza Saụt.

Ebe foto si, David Umahi Facebook

Ngwaọrụ ndị dị oke mkpa e ji atụ vootu amalitela njem ha ji agaru n'okpuruọchịchị dị iche iche.
Leo Ikedife bụ onye ọrụ Inec na-ahụ maka mgbasa ozi, kwuru na ọ bụ ụfọdụ ngwaọrụ fọrọ afọ ka ha na-eziga ebe o kwesịrị ịga maka ntuliaka a ga-eme echi.

Ndị ọrụ nchekwa okporo ụzọ, 'Road Safety Officers' nọkwa iji hụ na ihe niile gara nke ọma.

Ndị nze na ọzọ Alaigbo gụnyere Delta na Rivas, gbakọro n’Enugwu ụnyaahụ ịgwa Ndigbo ka ha pụta n’uju maka ịtụ vootu.

Otu a kpọrọ onwe ha Igbo Improvement Union (Ọganiru Ndigbo) zukọro n’Enugwu ebe ha nọ katọọ agha otu Ipob nọ na-ebusa mkpebi ndị mmadụ ịtụ vootu n’ala Igbo.

Ndị nwere agba kwuru okwu na ya bụ emume rịọrọ ka Igbo were ohere a gbanwee ọnọdụ ha site n'iwebata ezi ọchịchị na gọọmenti etiti.

Onyeisioche ndị otu a bụ Emmanuel Iwuanyanwu, kpọkuru ohanaeze ka ha biko pụta n’igwe gaa tuo vootu makana “ọ ga-ajọgbu udele ma sigbuo nkakwu na Igbo tukwu n’ulọ ụbọchị ahụ ma kwaa arịri afọ anọ ọzọ na-abịa”.

Ndị na-ere ihe a na-etinye n'ọnụ nọkwa n'akụkụ nnukwu ụlọakụ CBN di n'Owere.

Ha na-achọ ihe n'akpa ndị na-eche ka Inec zipụ ihe ndị e ji eme ntụliaka.

Ọkwa onye hụrụ nri rie na-enwe ike iguzo rụọ ọrụ?
Ma ndị uweojii na-echekwa Inec bu ụzọ echekwa afọ ha.

Ụlọọrụ INEC dị n'Imo steeti ejikerela ikesa ngwaọrụ ha ga-eji mee ntụliaka echi n'okpuru ọchịchị 27 niile dị na steeti ahụ.

Ndị na-azụ ahịa n'ogbe ahịa ọhụrụ akpọrọ "Imo Modern market" Egbeada, Owere, bụkwa nke e ji "ahịa Rochas" wee mara, ekwuola na ọtụtụ ndị mmadụ na-abịa ahịa taa n'ihi ntụliaka ga-adị echi.
Ọtụtụ ndị ahịa agaghị emepe makana ha chọrọ iso mee ntuliaka.

Ọgbaghara na nghọtaghe dị n'etiti ndị mmadụ banyere okwu Nnamdi Kanu kagburu mgbahapụ ntuliaka.
N'ozi o wepụtara ụbọchị Tọọzde, Kanu kwuru na ekwugharia n'oku ịhapụ ntulika dịka e kwetereala na ọnọdụ ndị otu Ipob nyere.
N'ọtụtụ ebe a na-ere akwụkwọ akụkọ, n'ime ahịa, ndị mmadụ gbakọrọ ọnụ na-adọrịta na ya bụ okwu.
Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ eziokwu, ebe ndị ọzọ sị na ọ bụ asị ọcha.
Otu onye nọ n'Umuwaya Road, Umuahia na-achọghị ịpụta n'ihe onyonyo gwara BBC Igbo na nke bụ ihe mgbagwoju anya nye ọtụtụ ndị otu Ipob na ndị na-eso Nnamdị Kanu.
N'Anambara, ụfọdụ ndị Ipob gwara onye ntaakụkọ BBC n'Ọka na ha agaghị atụ vootu n'agbanyeghị ntụziaka ọhụrụ Nnamdi Kanu kwuputara ụbọchị Tọọzde. Ha na-ekwu hoha na ha achọghịzi ibu ndịala Naijiria.



Inec Enugwu ekela nkwụcha maka ntuliaka satọde. Ụlọ ọba ego nke etiti bụ CBN ngalaba nkeEnugwu dịzị ka ebe a na-azụ ahịa n'ihi na ndị ọrụ INEC juputara na ya na-ekesa akụrụngwa ntuliaka.
Ọtụtụ ndị uweojii na ndị nkịtị juputara na ụlọọba ego ahụ.
BBC Igbo hụrụ Sinatọ Chukwuka Utazi,onye sinatọ na-anọchite anya Enugwu North kwuru dịka ọ bịara hụ na ndị INEC na-ekesa akụrụngwa ntụliaka dịka o kwesiri.
Utazi kọwara na obi juru ya afọ na ndị Inec Enugwu egosila na ha dị nkwadebe.
