Nasir El-Rufai: Sheikh Gumi amaghị ihe ọ na-akọ, ihe kwesịrị ndị 'bandits' bụ ọnwụ

Nasir El-Rufai
Nkọwa foto, Nasir El-Rufai
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Gọvanọ Kaduna Steeti bụ Nasir El-Rufai ekwuola na ya ekwenyeghị ihe Sheikh Ahmed Gumi na-ekwu na gọọmentị kwesịrị ịgbaghara ndị ekperima a kpọrọ bandits.

El-Rufai kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'ụbọchị Mọnde.

Cheta na Sheikh Gumi, onye ụkọchukwu a ma ama n'okpukperechi alakụba, kwuru na gọọmentị kwesịrị ịkpọ ndị ọchịehi a na-akpa ike ma gbaghara ha.

Mana El-Rufai kwuru na onweghị mgbaghara dị n'etiti gọọmentị ya na ndị ekperima.

Sheikh Gumi

Ebe foto si, Facebook/Sheikh Gumi

Nkọwa foto, Sheikh Gumi na ụfọdụ ndị ekperima ọchịehi nwere ọgbakọ ebe ha nọ kwupụta ihe bụ iwe ha

"Mụ na Sheikh Gumi bụ enyi, mana agwala m ya na ọ na-egbu onwe ya oge n'ihe a ọ na-akọ maka ịgbaghara ndị ekperima ọchịehi."

"Ekwenyeghị m na onye ọchịehi tinyere aka n'ịtọrọ mmadụ, ma na-anatakwa nde kwuru nde naịra n'aka ndị ọ na-atọrọ, ga-emechaa chegharịa."

"Onye ọbụla che na onye ọchịehi na-erete ihe dịka otu narị puku narịra (N100,000) kwa afọ, mana ugbua ọ na-anatazi nde kwuru nde naịra n'ọrụ ịtọrọ mmadụ, ga-echegharị, onye ahụ na-egbu onwe ya oge."

"Ọchịchị Kaduna steeti na ndị ekperima nọ n'agha. Anyị na ha agaghị enwe mkparịtaụka ọbụla. Naanị ikpochapụ ha bụ ụzọ anyị ga-esi kwụsị ha."

Nasir El-Rufai kwuru na ihe na-enye nsogbu n'ibuso ndị ekperima agha na mpaghara Ugwu bụ maka na ndị gọvanọ mpaghara ahụ adịghị n'otu.

Mana ugbua, El-Rufai kwuru na ya na gọvanọ Niger Steeti ejikọọla aka ọnụ ịlụ ya bụ ọgụ.

Akara ntụ-ntụ

Lee akụkọ BBC Igbo mere n'afọ 2019 gbasara mwakpo ndị ekperima wakporo otu obodo na Kaduna steeti ma gbuo mmadụ iri isii na isii.

Ndị uweojii na NEMA amaghị maka mmadụ 66 'nwụrụ' na Kaduna

El-Rufai

Ebe foto si, El-Rufai

Ndị uweojii Naịjirịa kwuru na ha enweghi ike ịkọwanwu ugbua ma mmadụ 66 anwụrụ n'ezie n'okpuruọchịchị Kajuru dị na Kaduna steeti.

Yakubu Sabo bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Kaduna steeti, gwara BBC na kọmishọna uweojii ga-agwa ndị ntaakụkọ okwu gbasara ya taa.

BBC kpọkwara Ishaya Chinoko bụ onye na-elekọta mpaghara ugwu-ndịdaanyanwụ nke ụlọọrụ gbatagbata nke a kpọrọ "National Emergency Management Agency (Nema), onye kwuru na ha amaghị na ụdịrị ihe ahụ mere .

O kwuru sị "dịka m na-agwa gị okwu ugbua, Anọ m na Kaduna steeti mana anụbeghi m ihe dị otu ahụ na mmadụ 66 nwụrụ.

"Ọrụ anyị bụ ilekọta ndị a gbara ọsọndụ, nke bụ na ọ bụrụ na ihe ruru mmadụ ole ahụ nwụrụ, ndị mmadụ gaara agbapụta n'ogige ahụ nke ga-eme ka anyị wụchie."

Ọkammụta Chidi Odinkalu bụbụ onyeisioche otu na-ahụ maka ikike dịrị onye nke a kpọrọ "National Human Rights Commission", tinyekwara ọnụ ya n'okwu a na Twitter, ebe o kwuru na o cheghi na ihe dị etu a mere.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Mana El-Rufai tinyere na Facebook ya, foto ọ sị na-egosi ka ya na ndị agha gara mgbaru n'obodo ahụ e gburu ya bụ mmadụ 66.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Cheta na El-Rufai kwuputara n'ụbọchị Febrụwarị 15 na mmadụ 66 nwụrụ na steeti ya.

Akụkọ ga-amasị gị: