Kwụsịnu ichi ehi na-agagharị

Ebe foto si, Getty Images
Iji wee gbochi ọtụtụ ogbugbu ndị mmadụ na Benue nakwa ebe ndị ọzọ na Naịjirịa, gọọmenti etiti akwụsịla ndị ọchị ehị na-agagharị agagharị.
Ọ bụ na ọgbakọ akpọrọ ''National Economic Council''(NEC) ka osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo na ndị gọvanọ 36 nke Naijiria ka nwetere nkpebi.
Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi kwuputere nke a ka emechara ọgbakọ ahụ.
Gọvanọ Umahi kwuru na NEC amachiela ngagharị ndị ọchị ehị site n'ugwu rue na ọwụwa anyanwu nakwa oke ala Naịjirịa na obodo ndị ọzọ.
Nkpebi NEC na-abia ka -ewechara ntụnye alo kọmiti maka ọtụtụ mmadụ a na-egbu ma ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ụgbọ na-alụ ọgụ na ụfọdụ steeti na Naịjirịa.
Steeti ndị ga-ebuzọ hụ nkwusị gụnyere Benue, Taraba, Adamawa, Plateau and Kaduna ebe mmadụ ruru nari nari a na-ekwu nwụrunụ maka ọgu dị n'etiti ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo na ọnwa ole na ole gara aga.
Otebeghị aka Benue na Taraba wepụtara iwu megidere ichi ehi nagagharị na steeti ahụ iji wee gbochi esemokwu dị n'etiti ndị ochi ehi na ndị ọrụ ugbo.

Ebe foto si, Getty Images
Gọvanọ Umahi kwuru na ọgbakọ a kwekọrịtara ka-ewepụta ala puruiche ga-enwe ihe eji ebi ndụ ọfụma n'ime ya na steeti ndị ahụ mkpamkpa a ka njọ.
O kwukwara na otu ihe sị kwuru ugbua na ọ bụ steeti dika Plateau,Kaduna na Taraba weputarala ya bụ ala maka ichi ehi.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe mere NEC jiri kwụsị ichi ehi ngaghari
- NEC chọpụtara na ya bụ ngaghari ichi ehi a dighị nama mma n'ahụ.
- Anaghị enyocha anụmani a na-ewebata na Naịjirịa
- Ndị ọchị ehi si mba ọzọ abata Naịjiria na-ebute nsogbu.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:










