Kaduna-Abuja road: Mohammed Adamu agbanwela onyeisi ndị uweojii na Kaduna

Ebe foto si, Nigeria Police Force/Twitter
Kọmịshọna ndị uweojii na Kaduna steeti ga-eburu akpa ya gaa Abuja ugbua dịka ahaziri ọnọdụ ya.
Onye e tinyre ga-anọchị anya ya bụ kọmishọna Baụchi steeti bụ Aji Ali Janga.
Onyeisi ndị uweojii bụ Moihammed Adamu kwurụ na nke a so na atụmatụ eji chee ndị ntọ aka mgba.
O ji ohere ahụ gwa ndị kọmịshọna ndị ọzọ ha kee nkwụcha gbasara ntọ, izu ohi na mpụ ndị ọzọ na-eme n'obodo.
Ụmụnwaanyị Ogoni enwela mmeri mbụ

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụnwaanyị ahụ kpụpụrụ ụlọọrụ bụ odogwu na mmanụ agbịdị bụ Shell ụlọikpe maka ebubo na aka ha dị n'ọnwụ di ha.
Ndị ọkaikpe na Hague kpebiri na ikpe nwereike ị gaa n'ihu ma kagbuo mkpesa Shell ka akwụsị ya bụ ikpe.
Ihe ụmụnwaanyị abụọ gụnyere Esther Kiobel na Victoria Kiobel chọrọ bụ ka Shell rịọ mgbaghara n'ihu ọha ma kwụọ ha ụgwọ ahụhụ ha tara.

Ebe foto si, Getty Images
Di ha nwụrụ n'afọ 1995 mgbe ọchịchị ndịagha Naịjirịa kwọgburu ha n'ụdọ dịka ekpere ha ikpe ndị mmadụ kpọrọ adịgboroja.

Ebe foto si, AFP
Ndị ọkaikpe kwukwara na Shell ga-ewere akwụkwọ ụfọdụ nzuzo nyefe n'aka ha.
Ha gara n'ihu nye ụmụ nwaanyị ahụ ohere ịgosi ihe akaebe ga-akwado ebubo ha boro Shell.









