IGP Mohammed Abubakar Adamu: Onyeisiala Buharị agbatịala oge ọrụ ya ruo ọnwa atọ

Ebe foto si, Presidency/Twitter
Onyeisiala Muhammadu Buhari agbatịkwuola oge ọrụ onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu ruo ọnwa atọ ọzọ.
Minista na-ahụ maka ndị uweojii bụ Mohammed Dingyadi gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Abuja n'ụbọchị Tọsde.
Dingyadi sị na mgbatị a dị mkpa iji nye ohere ịhọpụta onye tozuruoke ga-anọchi anya ya.
Onye ga-ewere oche IGP Mohammed Adamu dịka ọ laala ezumike nka?

Ebe foto si, Nigeria Police Force/Twitter
Ụnyahụ bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa February ka Mohammed Abubakar Adamu bụ onyeisi ndị uweojii Naịjirịa ga-ala ezumike nka.
Ndị mmadụ na-atụ anya onye ga-abụ onyeisi ndị uweojii Naịjirịa ọhụrụ.
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị mbụ Jenụwarị nke afọ 2019 ka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammdu Buhari họpụtara Mohammed Abubakar Adamu dịka 'Inspector General of Police (IGP).
Ihe ndị omepụtara n'ọchịchị ya

Ebe foto si, Nigeria Presidency
Otu ọkpụrụkpụ ihe a ga-eji cheta Mohammed Adamu bụ ịkwụsị ngalaba ndị uweojii a kpọrọ 'Special Anti-Robbery Squad' (SARS).
SARS bụ ngalaba ọtụtụ ndị mmadụ kwuru na ha na-eyi ọtụtụ ndị ntorobịa egwu site n'inwuch ndị aka ha dị ọcha nakwa iri aka azụ.
Nke a butere nnukwu ngagharịiwe na Naịjirịa nke mere Adamu ji mechie ngalaba ahụ.
Mana Adamu hibekwara ngalaba ọzọ a kpọrọ SWAT bụ nke ga-anọchị anya ndị SARS.
Ihe ọzọkwa a ga-eji cheta Adamu bụ atụmatụ iwulite mmekọrịta ndị uweojii na ndị obodo, nke a kpọrọ 'community policing'.
Iji mee ka atụmatụ a guzosie ike, Adamu gagharịrị na mpaghara dị icheiche na Naịjiria ebe ya na ndị obodo nwere ọgbakọ etu nchekwa ga-esi kawanye mma.
Mana ọtụtụ na-ekwu na atụmatụ 'community policing' amịtaghị mkpụrụ.
Ihe ụmụ Naịjirịa na-atụ anya n'aka Mohammed Abubakar Adamu mgbe o were oche dịka onyeisi ndị uweojii

Ebe foto si, @NGRPresident
Ụmụ Naijirịa ma ndị kwe na ndị ekweghị amanyela ọnụ gbasara onye ndu ọhụrụ e wepụtara ndị uweojii Naịjirịa bụ Mohammed Abubakar Adamu.
Onyeisioche pati PDP bụ Uche Secondus dụrụ ya ọdụ ka o mezie ihe onye ndu uweojii chiburu nu bụ Ibrahim Idris mebesiri ma kwụba aka ya ọtọ.
Onye ndu otu APC na Lagos steeti bụ Joe Igbokwe kwuru na ha nabatara Adamu ma gụpụtakwa ihe ole na ole ọ chọrọ ka o lebanye anya.
Pati bịakọtara ọnụ a kpọrọ "Coalition of United Political Parties" (CUPP) n'ichafu kwuru na ha nabara na ọ ga-adịmma ka Adamu hapụ i so ụkpụrụ ụkwụ onye si n'oche ahụ pụọ.
Na nchịkọta lee ihe ise ụmụ Naịjirịa na-atụ anya aka ya dịka BBC Igbo si chọpụta
- Ntuliaka 2019
Ha chọrọ ka ọ kwụwa aka ya ọtọ na ntụliaka na-abịanụ, ka ọ ghara ịkwụnyere pati ọbụla karịa ibe ya.
Ha chọkwara ka o wepụta ezigbo nchekwa na ntuliaka na-abịanụ ma gbochie igo vootu.
- Ya ghaziharịa nchekwa Naịjirịa
Ha chọrọ ka o lebaa anya n'ihe gbasara oke ogbugbu dị n'etiti ndị ọrụugbo na ọchịehi.
Ha chọkwara ka o lebaa anya na nsogbu ndị ọzọ a na-enwe gbasara nchekwa obodo Naịjirịa.
- Ebe nyocha ndị uweojii n'okporoụzọ
Ụfọdụ ndị Igbo kwuru na ha chọrọ ka Adamu kwụsị oke "Check points" juru na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
- Ya rụọ ọrụ ka onye ma nke ekwe na-akụ
Ụfọdụ kwukwara na dịka etinyerela ndị uweojii ego n'ụgwọ ọnwa ha, na ọ ga-adịmma ka ha wepụta obi ha rụọ ọrụ ọfụma.
- Ha achọghị ka o soro ụkpụrụ ụkwụ IbrahimIdris onye ọ nọchiri ọkwa ya.
Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa gụpụtara ọtụtụ ihe onye ndu Adamu nọchịrị ọkwa ya na-emetaghị ọfụma mgbe ọ nọ n'oche, ma rịokwa ya mezie ihe ndị a o mebiri nke mere ndị Naịirịa enweghị ntụkwasi na ndị uweojii.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









