Killings in Nigeria: IGP enyela iwu ka ahazigharịa ọnọdụ nchekwa n'Ọwụwa anyanwụ

Mohammed Adamu

Ebe foto si, Nigeria Police

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Mohammed Adamu ekwuola na oge eruola mgbe a ga-ebufeta amụma gbanụgbanụ ha kpọrọ "Operation Puff Adder" na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijirịa iji gbochie mkpamkpa ndị omekome nke juru ebe nille ugbua.

Amụmụ a bụ usoro ha ji bagide nchekwa n'okporo ụzọ si Kaduna gawa Abụja bụ ebe ndị omekome na-akpa nkonko ka ha sị na ha ga-eji mee ndị ekperima a taa kpuchie ọnụ na okporo ụzọ awara awara niile dị n'ala Igbo.

Nke a na-abịa ka ndị ekperima a gbuchara ada onyeisi ndị Afenifere bụ Funke Olakunrin ụbọchị Fraịde n'okporo ụzọ awara awara dị n'Ore.

Adamu sị na nke a ga-eme ka omere mbụ ghara ịme ọzọ.

Ya bụ onyeisi ndị uweojii sị na ya bụ Funke Olakunrin egburu egbu bụ Reuben Fasorantin na ha ga-ama imi n'ala chọpụta ha bụ ndị ihe ọma na-asa afọ merụrụ ya bụ ala ma taa ha ahụhụ ka iwu kwuru.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Frank Mba sị na ha ehibelaarị ndị isi ekwu ọnwụ ga ahụ na-achọtara ndị ọjọọ a.

Ogbugbu nwaanyị emela ka ọtụtụ mmadụ tie mkpu maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ka ọ dị ugbua, osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo agbaala ọkpa na be Pa Reuben Fasorantin n'Ondo steeti ịga tie ya aka n'obi maka ọnwụ nwa ya nwaanyị bụ Funke Olakunrin.

Osinbajo kwetere n'ezie na nchekwa Naịjirịa fọrọ nkwanye ọkụ ka ya bụ nri ghee, mana na gọọmentị na-eme ihe niile ịhụ na udo lahachitere azụ n'obodo a.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Akụkọ ga-amasị gị