Sineti chọrọ ka achụ ndị isi ọrụ nchekwa Naijiria

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Sinetọ akpọọla onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ chụọ ndị isi ọrụ nchekwa ala Naijiria dịka ndị ọchịehi na ndị omekeome malitere ọzọ igbu mmadụ na-elghị anya n'azụ na Nasarawa steeti.
Na nkpakọrịtaụka nke onye na-anọchite anya Nasarawa steeti bụ Suleiman Adokwe kpalitere n'ụlọmeiwu n'ụbọchị Tuusde, ha kwuru na ike akwụla ndị Naijiria na gọọmentị na-akpụ afọ n'ala dịka o siri gbasa nchekwa.
Ka ndị Sineti kwekọrịtara n'okwu ahụ, ha kpọrọ oku ka Buhari gba ọsọ rịọ enyemaka mbaụwa n'ihe gbasara nsogbu nchekwa na Naijiria.
Solomon Adeola Olamilekan nke Lagos Steeti kwuru maka mkpa ọdị ịchọ ụzọ ọhụrụ na'okwu gbasara nchekwa.
O kwuru n'ụzọ a ga-esi gbalahụ nsogbu nchekwa bụ ndị isi nchekwa ị nye ohere ka ndị ọhụrụ ji atụmatụ ọhụrụ bata.
Ọ sị: "Ala anyị kwesịrị igbalahụ iwelite oge ndị isi ọrụ nchekwa na-arụ ebe anyị nwere mkpa ụzọ ọhụrụ. Anyị ma ka ndịagha si eme. Ndị nwere atụmatụ agaghị enwe ohere ikwupụta uche ha gwa ndị isi ha, ma ọbụghị ya, e ziga ha ezumikenka n'ike."
Jeremiah Useni nọchitere Plateau steeti hụrụ nkwekọrịta na-adị n'etiti ndị ọrụ nchekwa dịka ihe so ebute nsogbu, kwuru ka ewepụ ndị isi, ka udo were chia n'etiti ndị ọrụ nchekwa.





