Ndị sinetị akpọọla onyeisi ụlọakụ ukwu CBN na mịnịsịta nchekwa

Ebe foto si, Saraki/ Twitter
Ndị ụlọomeiwu sinetị nọ n'ọgbakọ ha taa kpọọ onyeisi ụlọakụ ukwu Naịjirịa a na-akpọ Central Bank of Nigeria CBN n'aha ịchafụ bụ Godwin Emefiele, mịnịsịta ọrụ nchekwa dị na'aka bụ Gen. Mansur Dan-Ali na mịnịster na-ahụ maka okwu ego na akụ na ụba Naịjirịa bụ Kemi Adeosun.
Oku a kpọrọ ha bụ ka ha bịa zara ọnụ ha gbasra ụfọdụ ụgbọelu agha ha zụru e ji alụsọ Boko Haram ọgụ.
Ndị sinetị chọrọ ịjụ ha ihe kpatara e jiri wepụ ego ruru nde dọla 462 jiri zụta ụgbọelu ndị ahụ ma ndị ụlọomeiwu sinetị akwadoghi ya.
Ndị a kpọrọ ga-abịa zaa otu kọmiti sineti na-ahụ maka iwepụ ego.
Onye bulitere okwu ahụ na sineti taa bụ sinetọ na-anọchị akụkụ ọwụwaanyanwụ Imo steeti bụ sinetọ Samuel Anyanwu.

Akụkọ ga-amasị gị:






