Ntuliaka 2019: Keyamo bụ onye nkwuchiteọnụ ịchụnta vootu Buhari

Festus Keyamo

Ebe foto si, Keyamo/ Twitter

Nkọwa foto, Festus Keyamo bụ onye ọkaiwu pụụiche na Naịjirịa
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ onye kwupụara ebumnobi ya ịzọ ọchịchị ọzọ na ntuliaka na-abịa n'afọ 2019 emeela onye ọkaiwu Festus Keyamo onye nkwuchiteọnụ ndị ga-achụrụ ya nta vootu.

Keyamo kwupụtara nke a n'akara ya n'igwe twitter ta.

N'okwu ya: "A họpụtara m dịka onyeisi mgbasaozi nke nta vootu onyeisiala Muhammadu Buhari afọ 2019."

O kwukwara na ya ga-eme mgbasaozi gbasara ya bụ nhọpụta ma emesịa.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

N'akwụkwọ e degara Keyamo nke onyeisi na-ahụ maka ịchụrụ Buhari nta vootu na 2019 bụ Rotimi Amaechi binyere aka na ya, kwuru na ọrụ Keyamo gunyere inye aka hụ na Buhari nwetara nhọpụa site na otu pati ọ chọrọ ịnọ na ya zọọ ya bụ ọchịchị ya na ịhụkwa na o merikwara ntuliaka ahụ.

Akwụkwọ ahụ kwukwara na ọ ga-abụ onye nkwuchiteọnụ ndị na-achụ nta vootu ahụ n'otu pati ha nakwa na ntuliaka niile.

Cheta na Buhari kwupụtara ebomnobi ya ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala ọzọ n'izuụka gara aga tupu ọ mee njem gaa mba UK.

Presentational grey line

Akụkọ ga-amasị gị:

Presentational grey line