Ndị Sịnetị a nabatala mgbanwe usoro ntụlịaka

Ebe foto si, @Nigerian Senate Face book
Ndị Sinetị esorola ndị ogbo ha bụ ndị nnọchite anya na ị nabata mkpebi mgabnwe usoro na oge mgbe ndị INEC ga-ahazi ntụlịaka nke afọ 2019.
Ha mere mkpebi a na nzukọ ha taa dịka usoro a bụ na-aga ebuzọ mecha ntuliaka nke ndị ụlọomeiwu ọchịchị etiti, tupu eme nke ndị Gọvanọ na ndịọmeiwu Steeti, ebe nke onyeisi ala ga-abụ nke ikpeazụ.
Ọ bụrụ na onyeisiala Muhammadu Buhari tinye aka na akwụkwọ mkpebị a, usoro ọhụrụ ntụliaka a ga-abụrụ iwu.

Ebe foto si, Getty Images
Kamgbe afọ 2003 a na-ebuzọ eme nke onyeisiala na nke ndị omeịwu ọchịchị etiti n'otu ụbọchị, ebe nke ndị Govanọ na ndịomeiwu Steeti na-eso ya n'azụ n'otu ụbọchị.
Mgbanwe a bịara n'ime otu ọnwa ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ntụliaka bụ INEC wepụtara usoro na oge aga-eji mee ntuliaka nke afọ 2019
N'ime usoro ahụ ndị INEC wepụtara n'oge mbụ, a ga-ebuzọ mee nke onyeisiala na ndị omeiwu ọchịchị etiti, ebe ndị Gọvanọ na ndị omeiwu Steeti ga-abịa n'azụ.
Mgbe BBC Igbo gbara onyeisi ndị INEC nke Enugu bụ Emeka Ononammadu ajụjụ ọnụ, o kwuru na ọ bụrụ na emela ya dịka iwu na INEC ga-erụbe isi na ya.
"Ọ dighị ndị INEC n'aka ime iwu, ọ bụrụ na eme ka ọ bụrụ, anyị ga-eme ka iwu jiri kwuo".
"Onyeisi anyị bụ Mahmood Yakubu ekwela ndị Naịjirịa nkwa ị me ntuliala pụtara ihe n'enweghị nrụrụaka ọbụla." Ononammadu kwuru.
Lee ihe onyeisi ndị Sịnetị kwuru gbasara ihe mpkebi a n'akara Twitter ya;
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post








