Kenya Airways achụọla ndị ọrụ Naịjirịa ha

Ụfọdụ ndị ọrụ Kenyan Airways kwụ na mpụta ọdọ ụgbọ elu

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Kenyan Airways ekwubeghị ihe kpatara ha jiri chụọ ndị a

Kenya Airways chụrụ ihe ruru mmadụ 22 n'ime ọnụọgụgụ mmadụ dị 26 ndị Naịjiria na-arụrụ ha ọrụ na ngwụcha izuụka gara aga.

Akụkọ kwuru na e nyere ha akwụkwọ ịchụ ha n'ọrụ tupu izuụka ọhụrụ a ebido ma kwuo na ọ bụ sọsọ mmadụ anọ na-arụrụ ha ọrụ ka ji ọrụ na-ebe ahụ.

Ngalaba na-echekwa oke ruru ndị ọrụ ụgbọelu akpọrọ (NAUTE) n'aha ịchafụ kwuru na ha nyere ndị ahụ achụrụ sọ ụgwọ ọnwa ọtụ ọnwa na ya mere iwe ji ewe ha.

Onyeisi ha bụ Olayinka Abioye kwuru na ọ gaghị ekwe ka nke a gaa n'iru.

Mbọ niile BBC Igbo gbara ị nweta Kenyan Airways n'ekwentị amịtaghị mkpụrụ.

Presentational grey line

Akụkọ ga-amasị gị:

Presentational grey line