Sineti : A ga-akwụgbu onye a mara ikpe okwu asị

Gavel

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ bụrụ na Sineti kubie gavelụ n'iwu okwu asị, a ga-akwụgbu onye dara iwu a

A ga-akwụgbu onye ọbụla a mara ikpe na o kwuru okwu asị nke butere ọnwụ onye ọzọ, ma ọ bụrụ n'iwu ọhụrụ nke dị n'ụlọ omeiwu ukwu nke Sineti nweta nkwado ha niile.

Dịka iwu ahụ a na-akwado siri kwuo: "Onye ọbụla jiri, depụta, gosi, mepụta, nye, kesaa maọbụ hazie ihe ederede maọbụ ihe onyonyo nke na-akparị maọbụ na-eyi egwu, dara iwu."

Ọnụ na-ekwuchitere Sineti bụ Sinatọ Aliyu Sabi bụ onye otu APC, tụpụtara alo a ka-akwado iwu a ga-eme ka akwụgbuo onye dara a.

Iwu ahụ na-ekwukwa ka e mepụta ngalaba na-ahụ maka okwu asị nke ga n'eleba anya n'iwu gbasara okwu asị n'akụkụ Naijiria niile ma gbaa mbọ hụ n'ewepụrụ ọkwu asị ma n'enye gọọmenti etiti ndụmọdụ.

Mmerụ iwu a dịka inye mmadụ nsogbu dịka o siri gbasa agbụrụ onye si maọbụ ileda mmadụ anya maka agbụrụ o si, ga-apụta ịga mkpọrọ afọ ise maọbụ ịkwụ nde naira 11 maọbụ ha abụọ dịka ntaramahụhụ."