Saraki: Chụọnụ ndị isi ọrụ nchekwa

Ebe foto si, Getty Images
Saraki kwuru na ọ bụrụ na-achụọ ndị isi ọrụ nchekwa nọ ụgbua na ọ ge-enye ohere ị webata ndị ga-arụnwụ ọrụ nchekwa ọfụma.
O kwuru nke a mgbe ọ gara ị leta ndị idere mmiri na-enye nsogbu n'Ilorin n'ụbọchị Satọde.
Sarakị yọro ka aghara iji ihe gbasara ọrụ nchekwa Naịjiria mere ihe ndọrọndọrọ ọchịchị.
N'oge na-adịghi anya otu akpọrọ ''Amnesty international'' kwuru na-egbuola ihe ruru mmadụ 1,813 site n'ọnwa Jenụwarị ruo ugbua.
Ogbugbu a metutara steeti 17 ma ọnụọgugụ ya na-abawanye nke ịkarị ọgbugbu mere na afọ 2017.
Otu a bokwara ya bu ihe mberede n'isi ndị ọchịchị Naịjirịa makana enweghị ike ị kwusi ogbugbu ndị a.
Saraki boro ndị ọru nchekwa ebubo adịghị n'otu.
O kwuru na ndị otu ulo omeiwu ọ na-achị nyere ndụmọdụ etu a ga-si gbochie ya bụ ọdachị mana ndị isi ọchịchị gbara ha nkiti maka ihe ọ kpọrọ aka ndọrọndọrọ ọchịchị eji eso ya.









