Sniper: Nafdac amachiela mbugharị maọbụ ntụbata ọgwụ kemịkal ugbo
Akụkọ ndị dị mkpa taa bụ Wenezde (10/7/2019
Sniper: Nafdac amachiela mbugharị maọbụ ntụbata ọgwụ ugbo

Ebe foto si, Getty Images
Nafdac amachiela ntụbata na mmepụta ọgwụ ndị eji egbu ugbo gụnyere ọgwụ 'Sniper.'
N'akwụkwọ ozi ha wepụtara nke onyeisi ha bụ Prof. Mojisola Adeyeye, binyere aka, Nafdac machikwara ibughari ọgwụ ndị a.
Ha nyekwara ntuziaka nye ndị na-arụ ọgwụ ahụ ọnwa abụọ iwepụcha ọgwụ ahụ n'ọma ahịa malite n'abalị mbụ nke ọnwa Septemba.
Cheta na nsonso, ụlọomeiwu ukwu kporo oku ka a machie 'sniper n'ihi ọtụtụ ndị mmadụ ike ụwa gwụụ jizi ya egbu onwe ha.
Amachighi keke n'Awka

Ndị na-anya ụgbọ ọgba tum tum ụkwụ atọ bụ"keke" ekwuola na gọmentị Anambra amachịghị ha ịgba n'ụzọ.
Ha kwuru na kepu kepu ahụ ha na anụ na gọmenti chọrọ imachị ha apụtabeghị ihe.
Ndị keke nọ n'Aroma junction Awka kwuru na ọ ga a bụ nnukwute ihe arịrị dịara ha ma gọmenti mee ihe dị etu a.

Ha yọzịrị gọmenti Anambra ka o gharakwa ime ihe dị etu a n'ihi na ọ bụ na ya ka ha si eri nri ma zụọ ezi ma ụlọ ha.
Onye njem Ifunanya Obigwe kwuru ma ewezuga keke na ụgbọala agaghị eru ebe ya na-aga.
Cadet Passing Out Parade: Nwaanyị kachasị mee ọfụma na ọzụzụ ndịagha ụgbọelu
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Osote onyeisiala Naijiria bụ Yemi Osinbajo akwanyerela otu nwata nwaanyị a kpọrọ TM Ademoluti ugwu dịka onye kachasị mee ọfụma na ọzụzụ ndịagha ụgbọlu n'emume e mere taa na Kaduna.
Ademoluti bụ nwaanyị mbụ ga-enweta nzere ahụ kemgbe ọzụzụ ahụ jiri malite.

Ebe foto si, Air Marshal Abubakar na Osote onyeisiala Yemi Osin
Mmadụ otu nari iri asatọ na asaa nwetara ọzụzụ ọnwa issi iji tozuo isonye n'ọrụ nchekwa dịka ndị agha ụgbọelu.

Ebe foto si, @CAS_AMSadique
Gọmenti Imo steeti emechiela ọbaego dị 250

Ebe foto si, Emeka Ihedioha/Twitter
Gọọmenti Imo steeti atụpụtala otu akaraọba ego nke a kpọrọ TSA na ịchafụ ugbua iji hazie usoro mkpata ma mmefụ akụ steeti ahụ.
Nke a na-eme dịka ha mechiri akara ọbaego nke steeti ahụ dị nari abụọ na iri-ise.
Maka ndị otu Shiite

Ebe foto si, Chimezie Ucheagbo
Agbanyeghị nkwata ha na ndị uweojii nke mere ka akpọchie ndị otu ha mmadu iri anọ ụbọchị Tuzde, ndị otu Islamic Movement of Nigeria ka na-aga n'ihu n' ngaghariwe ha nAbuja taa bụ Wenezde.
Ndi otu a na-eme ngaghariiwe iji kpọọ oku ka a tọhapụ onye isi ha bụ El-Zazaky e ji n'ụlọmkporo.
Sir Kim Darroch achiliela aka

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi, Sir Kim Darroch bụ onye nọchite anya UK na mba Amerịka etinyela akwụkwọ arụkwaghị m maka okwu ọjọọ o kwuru maka DonaldTrump n'ozi email o zipụrụ nke pụtara ihe.
Super Eagles na Bafana Bafana ga-akwata

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, ebe ka ị ga-anọ mgbe Naịjirịa na Saụt Afrika ga-akwata ya n'elekere asatọ nke abalị a n'Asọmpi Afcon.
Ya bụ egwuruegwu agaghị abụ ọgụ nne na- agbara nwa maka Saụt Afrika bụ ndị gbapụrụ Ijipt a na-agba bọọlụ na be ha.
Nkeji Igbo

Ebe foto si, @FemiGbaja/Twitter
Ndị ụlọomeiwu ukwu ekwuola na ha agaghị ekwe ka aha Minista apụtabeghi kwụsị ezumike ha.
Onyeisiala Muhammadu Buhari ewepụtabeghi aha ndị ga-eso ya rụ ọrụ dịka Minista na-agba nke abụọ ya.
Femi Gbajabiamila tinyere ọnụ n'okwu a mgbe amalitere nrụrịtaụka ya n'ụlọomeiwu.
N'ọnụ ya "Onweghi oge enyere ka onyeisiala wepụta aha ndị Minista ya, ọ nwereike ịhapụ ịwepụta aha minista ọbụla ma ọ chọọ."
Tinubu na-akatọ ndị ji foto ya na-ebi akwa maka 2023

Ebe foto si, AFP
Onye ndu ndị 'All Progressives Congress' na Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu ekwuola na ọ bụghị ya zipuru ndị ji aha ya ebigharị akwa maka ịzọ oche onyeisiala n'afọ 2023.
O depụtara nke a n'akara twitter ya iji wee kụpụ onwe ya n'ihe otu kpọrọ onwe ha 'Asiwaju reloaded ambassadors of Naịjirịa' na-eme.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
August Alsina: Mkpọnwụ ụkwụ mere na m agaghị Essence Festival

Ebe foto si, Getty Images
August Alsina , otiegwu mba Amerịka ama ama nọ n'ụlọọgwụ maka ọrịa mere ya mkpọnwụ ahụ nke na ọ naghị aganwu ije kemgbe abalị Monde..
Nwa amadi ahụ onye gbara afọ iri abụọ na asaa na-arịabu ọrịa ime ahụ kemgbe.
August, onye e jiri egwu ya a kpọrọ, "I Luv This Shit" nke ya na Trinidad James tiri were mara kwụpụtara ọnọdụ ya n'Instagram ya ụbọchị Tuzde.
O kwupụtakwara olileanya ya na ya ga-enwere onwe ya ma tipụtakwa egwu ọhụrụ.
" I na-arịọ mgbaghara maka abịanwụghị 'Essence Festival.'
"Ejighị m ọrụ na oge ụnụ egwu egwu. Ọ bụ ọrịa jituru m."
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Ọtụtụ ndị ihe ya na-amasị na-ekpekwara ya ekpere mgbake.
Sịnetọ Elisha Abbo

Onye ụlọomeiwu akpụpụrụ ụlọikpe maka ịkụpụ nwaanyị ọkwụrụ n'anya bụ Elisha Aboo agwala ndị ibe ya ejila nkwụsịtụ ọrụ amaja ya.
O kwuru nke a dịka ọ bịara n'ihu komiti ndị ụlọomeiwu ukwu hibere ịlebanye anya n'okwu dị na etiti Abbo na nwaanyị o tiri ihe.
O kwukwara na dịka okwu ahụ bụzị ikpe n'ụlọikpe na ọ gaghịzi etinye ọnụ na ya.
Ụfọdụ ndị mmadụ dịka Ola Brown kwuru na Remi Tinubu abịaghị egwuregwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ebe ndị ọzọ dịka Gimba Kakanda na-ekwu na Remi Tinubu mefere oke n'agbanyeghi na Abbo mejọrọ iwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
"Gbachinu ọgbakọ ndị ugwu nkịtị"
Andrew Kwasari bụ ọnụ na-ekwuchitere osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo agwaala ụmụ Naịjirịa ha etinyena uche n'okwu mmaja ọgbakọ otu ndị ugwu na-ekwu gbasara RUGA.
Kwasari na-ekwu nke a n'ebe ndị na-azụ ehi na-enweta ọzụzụ gbasara etu ha na ndị ọrụugbo ga-ebi n'udo.
Na mba ofesi

Ebe foto si, Reuters
Mba Libya ekwela ka atọghapụ ụfọdụ ndị mbịarambịara ka tọrọ n'ụlọ ebe ụgbọelu tụrụ ogbunigwe n'ụbọchị ole gara aga.
Ihe ruru mmadụ narị atọ ga-enweta ebe obibi ọhụrụ n'atụmatụ a.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Taa bụ ụbọchị ụmụ Naịjirịa na-atụ anya dịka Super Eagles na-akwado izute Bafana Bafana nke ndị mba Sawụt Afrịka.
Onye meriri asọmpị a ga-eru agba abụọ nke ikpeazụ n'asọmpị AFCON.










