UNN Electric Car: 'Ọ bụrụ na ọkụ na akụrụnkwa dị anyị kaara ime karịa'

Ụgbọala ọkụ latrik na-enye ọkụ

Ebe foto si, Ozoemena Ani

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyendu ndị mepụtara ụgbọala latrik na Mahadum Nsukka akọwala ka ha na ije si gaa.

BBC Igbo na ndị rụpụtara ụgbọala latrik na ngalaba injiniarịn nke Mahadum Nsukka bụ 'Univerisity of Nigeria Nsukka' (UNN) nwere mkparịtaụka maka ya bụ ụgbọala latrik ha rụrụpụtara.

Ọkammụta bụ onye ya na ndị nchọpụta ụmụakwụkwọ dị n'aka bụ Injinịa Ozoemena Ani sị na ọkụ na enweghị akụrụngwa ọgbaraọhụrụ bụ ihe cheere ha aka mgba.

Ani sị na ọ bụ otu n'ime ndị ọgbakọ ndị nchọpụta na ngalaba nke 'Mechatronics' bụ ihe meputara ya bụ ụgbọala site na nkwado onye bụbu onyeisi ya bụ Mahadum bụ D C Ozumba,

Ọ sị na ụzọ asatọ n'ime iri n'akụrụngwa eji rụọ ya bụ ụgbọala sị na Ala Igbo dịka Onisha, Nnewi na Nsukka.

Ụgbọala ọkụ latrik na-enye ọkụ

Ebe foto si, Ozoemena Ani

Ani sị na "anyị ji izuụka ịnọ rụọ ya bụ ụgbọala".

Ọ sị na ịrụpụta ya bụ ụgbọala gbadoroụkwụ n'oku ndị National Automotive Design and Development Council (NADDC) kpọrọ Mahadum anọ n'Abuja.

Ya bụ oku mere Onyeisi Mahadum nke lara ezumike nke bụ D C Ozumba jiri nye ya bụ nkwado.

Ha rịọrịọ ka gọmenti nye nkwado ga-eme ka arụwa ya bụ ụgbọala ka ọ ga-agbate aka n'okporo ụzọ.

Ụgbọala ọkụ latrik na-enye ọkụ

Ebe foto si, Ozoemena Ani

Nkọwa foto, Ụgbọala ọkụ latrik na-enye ọkụ nke mahadum 'Univerisity of Nigeria Nsukka' (UNN) rụpụtara

Dika Ani kwuru, "ụnyahụ anyị nyagharịrị ya bụ ụgbọala, onyeisi Mahadum anyị nke ochie bụ Ozumba nọ n'ihu, Onyeisi ndị NADDC na ọnye otu ya nọ n'azụ, Onyeisi Mahadum UNN ọhụrụ bụ nọkwa n'azụ. Mmadụ ise nọ na ya bụ ụgbụọla otu mgbe."

Ani kwusiri ike na ọkụ latrik bụ ihe kacha chee ha aka mgba na ya bụ ọrụ nke bụ na ha arụchaghị ya bụ ụgbọala n'ime ya bụ Mahadum mana ọ bụ n'ụlọọrụ ndị ọzọ ka ha rụchara ya.

"Anyị rụrụ ya bụ ụgbụala ka ọgbawa ihe dịka kilometa iri atọ n'otu awa ma o buru mmadụ anọ. O burukwa mmadụ abụọ, ọ ga-agbafe nke a".

Ani kwuru na aga eji awa atọ mee ka afọ ju batiri ya bụ gbọala na ha nwekwara olile anya na ha ga-arụnye ya ihe nke ga-eme ka ejiri ike dị n'anyanwụ na-anya ya.

Ọ sịkwa na nchọcha ka na-aga n'ihu na ya bụ ụgbọala nke o kwuru na ọ bụ mmadụ asatọ n'ime isi abụọ na asaa bụ ndị bụ isi sekpụ ntị na ya bụ ọrụ.

Ndị a bụ ndị aka ha dị na ya bụ ọrụ:

  • Engr. Dkr. Ozoemena Ani onye nchikọta Electric Vehicle Research Team na onye nchịkọta Mechatronics Research Group UNN
  • Engr. Dkr. Cosmas Ogbuka, EV- Research Electrical Sub-team LeaderEngr. Solomon Nwafor,onye ọrụ Mechatronics
  • Engr. Anthony Ezeama, onye ọrụ Mechatronics
  • Magnus Onuoha onye ọrụaka na-agba igwe ọkụ
  • Chinweike Ugwu, ijinia n'ọrụ ugbo
  • Victor C. Job, nwa akwụkwọ, Injinịa nke mekanik
  • George C. Eze, nwa akwụkwọ, Injinịa nke mekanik
  • Chinedu C. Unachukwu, nwaankwụkwọ, Injinịa maka ọkụ latrik
  • Enuma N. Ogbuefi,waankwụkwọ, Injinịa maka ọkụ latrik

Ndị ọnụ na-eru n'okwu jakwara Mahadum a maka ọrụ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Lee ihe nkiri maka Keke latrik

Aha onyonyo, Electric Keke: Ụkọ mmanụ ụgbọala mere m ji arụ Keke - Ifeanyi

Akụkọ ga-amsị gị