Anambra state: A machiela keke
Akụkọ dị mkpa ụbọchị Fraide (5-7-19):
Anambra steeti akwụsịla Keke

Gọọmenti Anambara steeti amachiela otu ndị keke a kpọrọ "Tricycle Owners Association of Nigeria" na steeti ahụ.
Kọmishona ime njem dị n'aka bụ Uchenna Okafor kwuru na nke a dị mkpa maka arụ na mpụ e ji ya bụ keke eme na steeti ahụ.
Abba Kyari na Boss Mustapha alọghachitela n'ọrụ

Ebe foto si, Nigeria Presidency
Onyeisiala Muhammadu Buhari ahọrọla Boss Mustapha ka ọ rụrụ ọrụ gawa dịka odeakwụkwọ nke gọọmentị.
Ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Garụba Shehu gbara ama a n'akwụkwọ ozi o zipuru n'uhuruchi Fraidee.
Shehu kwukwara na Buhari họrọkwaara onye isi ndị ọrụ ya bụ Abba Kyari ka ọ rụrụ na-aga.
Mustapha na Kyari bụ ndị mbụ Buhari na-ahọputa ga-eso ya rụọ ọrụ n'agba nke abụọ nke ọchịchị ya.
Amabeghi mgbe onyeisiala ga ahọpụta ndị mịnịsta ga-eso ya arụ ọrụ.
Otu onye uweojii anwụọla ebe ha na ndị omekome na-akwarịta mgbọ

Ebe foto si, Getty/AFP
Otu onye uweojii n'Anambra steeti atụnyela isi ya ebe ha na-achụ ndị ntọ ha si ji onye nkuzi kọleji ndị nkuzi Nwafor Orizu College of Education, Nsugbe bụ Pascal Achugbu.
Onye uweojii a aha ya bụ Moses Jacob nke Anti Robbery Squad nke akara ya bụ F/No 444849 lara mgbe ha na ndị ojiegbeezụ kwakọrịtara mgbe n'ụzọ Abba /Ukulu dị na okpuruọchịchị Dunukofia n'Anambara Steeti.
Achugbu na otu onye ha sị na o so na ndị ojiegbeezụ ka mgbe tụrụ.
Ha abụọ nwụru na ụlọọgwụ ebe adọwara ha na ọbaozu ugbua dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti siri kwuo.
N'abalị Tọzde ka ndị ntọ tọrọ Dọkịnta Pascal Achugbu nke bị na 26 Ngozika housing Estates Awka.
A ka na-achọ ya bụ nwa amadị achọ ugbua.
Oyetola emeriela Adeleke n'ụlọikpe kacha elụ

Ebe foto si, PDP
Ademola Adeleke nke PDP anabatala mkpebi Ụlọikpe Kachasị na Naijiria na ọ bụ Gboyega Oyetola meriri ntuliaka nke gọvanọ Osun steeti emere n'afọ 2018.
Ndị okaiwu ise n'ime asaa kwetara na ya bụ ntuliaka e mere na Septemba 2018 kwụ ọtọ ebe mmadụ abụọ si na wuruwuru dị na ya.
Iran na ụgbọmmiri Briten

Ebe foto si, Reuters
N'ofesi e, otu onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Mohsen Rezaei agwala mba Iran ka ha kpachie ụgbọmmiri mmanụ agbidi ndị Briten ma ọ bụrụ na ha ahapụghị nke ndị Iran ha ji.
Cheta na ụbọchị Tọzde, Royal Marines nke ndị Briten nyere Gibraltar aka ịkpachi ụgbọmmiri ndị Iran ha sị na ọ na-aga Syria isi mmanụ agbidi.
Ikpe gọmenti na Deziani

Ebe foto si, AFP
Ụlọikpe ukwu dị na Steeti Legọs enyela iwu ka eweghachiri gọọmentị etiti ekwentị iPhone nakwa ọla e ji achọ mma bụ nke a napụtara Diezani Alison-Madueke.
Okaikpe Nicholas Oweibo nyere iwu a ụbọchị Fraidee ka gọọmentị weghara ihe ndị ahụ nke a sị na ọpụtara ego di nde dola iri anọ ($40 million).
Alison-Madueke bụ onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbidi oge Goodluck Jonathan bụ onyeisiala.
Ngalaba gọọmenti na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka bụ Economic Crimes Commission boro Alison-Madueke ebubo izupu ego buru nnukwu ibu oge ọ bụ Mịnịsta.
Ma Alison-Madueke ekwolari na nke ahụ abụghị eziokwu mana okwebeghi ịlọta Naijiria bia zara ọnụ ya.
N'ụbọchị Fraidee, ọkaiwu ndị EFCC bụ Rotimi Oyedepo rịọrọ ọkaikpe ahụ ka o nye iwu ka gọọmentị weghara ọla ndị ahụ.
Ọla ndị ahụ gụnyere "ọla aka (bangles) 419; ọla mkpịsị aka (rings) 315; ọla ntị (earrings) 304; ọla olu (necklaces) 267; dgz.
Ọkaikpe ahụ nyere abalị iri na anọ ka onye nwe ekwentị na olandị ahụ bịa kọwaa onwe ya, ọbụghị otu a, gọọmentị ga-eweghara ihe ndị ahụ kpam kpam.
Arjen Robben alaala ezumike nka

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụibe, n'egwuregwu, onye mbi egwu bọọlụ kwọchara isi bụ Arjen Robben alaala ezumike nka na ya bụ egwu ọ maara agba.
Ya bụ onye egwu sị Netherlands gbaara Bayern Munich na Chelsea dị afọ itoolu malite egwu bọọlụ dịzị afọ iri atọ na ise ugbua ọnwụsara ọwa.
Gee nkeji Igbo

Ebe foto si, AFP
Onye nkuzi ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na Mikel Obi agaghị esonye na agbam bọọlụ n'etiti Naịjirịa na Kameroon n'ihi na omeruru ahụ.
Rohr kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu ọgbọ egwuregwu Alexandria dị n'Egypt.
Ọ kwuru na odoro ya anya na ndị bọọlụ mba Kameroon bụ ndị siri ike mana ọgbara ndị mmadụ obi na ha enweela ohere ụbọchị old ma old iji zuo ike ma kwadokwaa maka agba nke egbe buru ọlaa.
Gernot kwuru na ndị niile nwebụrụ mmerụ ahụ oge gara aga enwetachaala onwe ha were kwuo na ọ nanị Mikel bụ onye nwetara mmerụ ahụ ọhụrụ.Troost Ekong bụ onye ya na Coach Rohr nọ na mkparịtaụka ahụ Kwere nkwa na n'agbanyeghị na Kameroon bụ obodo siri ike ma bọlụ na ndị Naijiria dị nkwadebe maka imeri ha.

Ebe foto si, Getty Images
Dịka Nafdac siri depụta n'akara Twitter ha, ndị mmadụ kwesiri ịweghachi 'Eva Water' niile rue mgbe nyocha ga-ebi.
Ha kwuru na ọ bụ maka nchọpụta ha mere gosiri na agwa mmiri ahụ agbanweela.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Nafdac kwukwara ka ndị mmadụ weghachi mmiri ahụ niile n'ụlọọrụ NBC bụ ndị na-arụpụta ya.
NBC bụ Nigeria Bottling Company na-arụpụtakwa mmanya ndị ọzọ na Naịjirịa.
AFCON abanyela agba nke abụọ ya

Ebe foto si, @NFF/Twitter
Ọ bụ taa ka a ga-amalite agba nke abụọ n'iko Mba Afịrịka
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Moroko na Bene nakwa Uganda na Senegal bu ndị ga-asụ mpị taa.
Super Eagles ga-ezute Kameron echi, mana onye nkuzi ha bụ Gernot Rohr ekwuola na agaghị ekwe ka ndị mmadụ bịa ebe ha na-eme nkwado.
Rọhr sị na nke bụ ịnye ha ohere itinye uche n'ihe ha na-eme.
Igbo gee ntị

Onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ Nnia Nwodo asala mmanye otu akpọrọ Coalition of Northern Groups manyere Gọọmentị Naịjirịa ka oweghachite atụmatu Ruga.
Nwodo sị na okwu a onye aha a bụ Abdulazeez Suleman kwuru adịghị mma ma ncha.
Ọ sị ka ndị Ọwụwa Anyanwụ mụrụ anya.
Na Libya,

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ndị ọzọ sị ndị Naịjirịa itoolu sọ n'ime ndị nwụrụ mgbe ụgbọelu tụrụ ogbunigwe n'ebe ndị na-agba ọsọndụ n'anọ na mba Libya.
Ha sị na ha akpọrala otu nwata, ụmụnwaanyi atọ na otu nwoke bụ ndị Naịjirịa nọ ebe ahụ.
Na mba Sudan,

Ebe foto si, Reuters
Ndị agha nara ọchịchi na mba ahu na ndị isi ndị na-emem ngagharị iwe enwela nkwekọrịta ike ọchịchị tupu eme ntuliaka.
Ha nwekwara nkwekọrịta na ha ga-enyocha ọgbaghara daara na mba ahụ n'izu ole ma ole gara aga.
Ka ozi nkwekọrịta ruru ndị mmadụ ntị, ọtụtụ bidoro nwebe aṅụrị.










