Buhari: Minista na ahụ maka nchekwa gawa Zamfara.

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ezigala minista na-ahụ maka nchekwa akpọrọ Mansur Dan-Ali na Zamfara steeti, ka ọ ga-nyochaa etu ihe si kwụrụ n'obodo Birane dị n'okpuru ọchịchị steeti ahụ ebe e gburu mmadụ iri atọ na ise ụnyahụ.
Onye na-ekwuchitere onyeisiala n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Garba Shehu, kwuputere ihe a n'akwụkwọ ozi o wepụtaara ndị ntaakụkọ.
Shehu kwuru na minista ahụ kwesịrị inyocha ọnọdụ a ma wetakwara Buhari ozi ozugbo, ebe o kwuru na ọ katọrọ ya bụ oke ogbugbu.
O kwukwara na Buhari enyela iwu ka ndị nche ala Naijirịa ziga ndị ọrụ ha ebe ihe mberede a mere ma nwụchie ndị omekome kpara arụ a.
Shehu kwusirike na Buhari na-agba mbọ n'ihụ na oke ogbugbu a na-eme n'akụkụ dị icheiche na Naijirịa kwusịrị.
Akwụkwọ ozi ahụ kwuru, "Onyeisiala nwere nnukwu mwute ebe ezinaụlọ ndị egburu n' oke ogbugbu a nke merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ. Ọ na-ayọ Chukwu ka ọ kasie ndị nọ n'iru uju obi."





