Obosi: Nne ụmụaka atọ ọkụ gbagburu kpochiri ha n'ụlọ pụọ

Njinji ọkụ ọgbụgba jiri n'Ugwuagba Obosi, Anambra Steeti ụbọchị ole n'ole gara aga bụ nke ka na agba ndị mmadụ anya mmiri.
Mgbe BBC biarutere na ya bụ ebe ọdachị mere, anyị chọpụtara na ya bụ nwaanyị ụmụ aka ya atọ nwụrụ bụ Oriakụ Blessing onye Nkerefi n'Enugwu steet mana dị ya bụ onye Ohaozara nke dị n'Ebonyi steeti.
Otu enyi nwaanyị ahụ bụ Nurse Janet Kalu kọwara na afọ 2018 ka Blessing nwere nsogbu akwụghị ụgwọ ụlọ n'Ugwuagba ahụ, nke mere na onye ụlọ chụpụrụ ya na ụmụ ya atọ ahụ iro.

N'ihi enweghị ego ọ ga eji kwụọ ụgwọ ụlọ ọzọ, ya bụ nwaanyị onye ya na di ya ebikọghị ọnụ duziri ụmụ ya ga biri na ụlọ igwe a na-akpọ container ebe ọ na akwa akwa.
Onye welder nọ na-azụ shọp nwaanyị ahụ bụ Ifeanyi Nakwa nwaanyị na ere nrị na mmanya na akụkụ ya kwuru na otela ha bidoro dọwa Blessing aka n'ntị ka oghara ịdị na-akpọchịnye ụmụaka ya n'ime ụlọ igwe container were pụọ.
Ha kọwara na ụbọchị ọkụ ahụ gbara, na Blessing kpọchinyere ụmụ ya atọ bụ Esther, Chiemerie na nke atọ n'ime ụlọ, sinye nrị n'ọkụ were gaba igota ihe n'ahịa mgbuka.

Ifeanyi Kwara arịrị na oge okụ ahụ malitere, ha enweghị ike itika ya bụ igwe na nnukwu igodo ojiri gbachie ụlọ ganye na okụ agbagbuo ụmụ aka atọ ahụ.
Otu onye na ndị na elekọta ogbe Ugwuagba Obosi ahụ Mazi Amechi Egwuonwu kọwara ka ya siri gota out tanker mmiri were na aagbanwụ ya bụ ọkụ mana tupu akụkaa ụzọ nwaanyị ahụ gbachiri, ụmụ ya atọ erela ka unyi.
Ọtụtụ ka nọ na anya mmiri yọrọ ndị mmadụ ka ha kwụsị idi na akpọchinye ụmụ ha n'ụlọ ma ọ bụ n'ime ụgbọala ka ha were gbanahụ ụdị mberede a.











